MAK 14:3-9
MAK 14:3-9 Bible Nso (IGBOB)
Mb͕e Ọ nọ na Betani n'ulo Saimon onye-ekpenta, mb͕e Ọ nānọdu na nri, otù nwanyi we bia nke nēji ite alabaster, nke manu-otite ezi nard di oké ọnu-ahia nke-uku di ya; ọ kuwara ite ahu, we wusa manu-otite ahu n'isi-ya. Ma ufọdu di ndi iwe nēwe nke-uku n'etiti ha, ha si, Àlawo manu-otite a n'iyì otú a iji me gini? N'ihi na apuru ire manu-otite a kari ọgu shilling iri-na-ise, we nye ndi-ob͕enye. Ha we tamu ntamu megide nwanyi ahu. Ma Jisus siri, Rapunu ya; gini mere unu nēsob͕u ya? ọ luru ọlu ọma n'arum. N'ihi na unu nwere ndi-ob͕enye n'etiti unu mb͕e nile, mb͕e ọ bula unu chọrọ unu puru ime kwa ha ihe ọma: ma unu enweghi Mu onwem mb͕e nile. O mere ihe ọ nwere ike ime: o buru uzọ te arum manu-otite ka ewe doziem n'olìlì. Ma n'ezie asim unu, Ebe ọ bula agēkwusa ozi ọma nka n'uwa dum, agēkwuta kwa ihe nke nwanyi a mere, ka ọ buru ihe-ncheta-ya.
MAK 14:3-9 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ka ọ nọdụrụ nʼoche nri na Betani nʼụlọ Saimọn onye ekpenta, otu nwanyị bu karama alabasta mmanụ otite dị oke ọnụahịa, nke e jiri ezigbo naad mee, batara. Ọ kụwara karama ahụ, wụsa ya mmanụ otite ahụ nʼisi. Ụfọdụ ndị nọ nʼebe ahụ were iwe nke ukwuu. Ha sịrịtara onwe ha, “Gịnị mere e jiri laa mmanụ otite nke a nʼiyi otu a? A gaara ere mmanụ otite a ihe karịrị narị denarị atọ, were ego e retara ya nye ndị ogbenye.” Ha baara ya mba nʼolu ike. Ma Jisọs sịrị, “Hapụnụ ya aka. Gịnị mere unu ji esogbu ya? Ọ bụ ezi ọrụ ka ọ rụrụ nʼebe m nọ. Unu na ndị ogbenye na-anọ oge niile, unu nwekwara ohere inyere ha aka mgbe ọbụla unu chọrọ. Ma mụ na unu agaghị anọ tee anya. O mere ihe o nwere ike, ọ na-ete m mmanụ otite a ugbu a iji kwado ahụ m maka olili a ga-eli ya. Nʼezie, ana m agwa unu, nʼebe ọbụla a ga-ekwusa oziọma a nʼụwa niile, ọrụ a ọ rụrụ ka a ga-akọkwa akụkọ ya, iji cheta ihe ọma a o mere.”