Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

MAK 14:12-26

MAK 14:12-26 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Nʼụbọchị mbụ nke Mmemme achịcha na-ekoghị eko, mgbe ha na-achụ aja atụrụ ngabiga, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya sị ya, “Ebee ka ị chọrọ ka anyị gaa kwadoro gị ihe, maka oriri ngabiga?” O zipụrụ mmadụ abụọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya, sị ha, “Gaanụ nʼime obodo, otu nwoke bu ite mmiri ga-ezute unu. Soronụ ya. Ebe ọbụla ọ banyere, sịnụ onyenwe ụlọ ahụ, Onye ozizi sịrị, Olee ụlọ ọbịa a kwadoro m, ebe mụ na ndị na-eso ụzọ m ga-anọ rie oriri ngabiga? Ọ ga-egosi unu otu ọnụụlọ buru ibu nʼelu ụlọ ahụ, ebe e dozichara ihe niile. Kwadoonụ ihe anyị nʼebe ahụ.” Ndị na-eso ụzọ ya pụrụ baa nʼime obodo, ha hụrụ ihe niile dị ka ọ gwara ha. Ma kwadokwa nri ngabiga ahụ. Mgbe o ruru uhuruchi, ya na ndị ozi ya iri na abụọ ahụ so bịa. Mgbe ha nọ na-eri nri, Jisọs gwara ha sị, “Nʼezie agwa m unu, otu onye nʼime unu ga-arara m nye. E, otu onye so m ugbu a na-eri nri!” Ha bidoro inwe obi mwute, na-asị ya nʼotu nʼotu, “Ọ bụ m? Ọ bụ m?” Ọ sịrị ha, “Ọ bụ otu onye nʼime mmadụ iri na abụọ a. Onye mụ na ya na-amanyekọta aka nʼime otu efere. Nwa nke Mmadụ ga-ala dị ka e dere banyere ya. Ma ahụhụ ga-adịrị nwoke ahụ onye a ga-esite nʼaka ya rara Nwa nke Mmadụ nye. Ọ gaara akara onye ahụ mma ma a sị na a mụghị ya amụ.” Dị ka ha na-eri nri, o weere achịcha, nye ekele, nyawa ya, nye ha sị, “Rienụ ya, nke a bụ ahụ m.” Mgbe ahụ, o buuru iko, nye ekele bunyekwa ha. Ha niile ṅụrụ site nʼotu iko ahụ. Ọ sịrị ha, “Nke a bụ ọbara m nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ, nke a na-awụfu nʼihi ọtụtụ mmadụ. Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, agaghị m aṅụ mmanya vaịnị ọzọ tutu ruo ụbọchị ahụ, mgbe m ga-aṅụ ya ọhụrụ nʼalaeze Chineke.” Mgbe ha bụsịrị abụ, ha pụrụ gaa nʼUgwu Oliv.

MAK 14:12-26 Bible Nso (IGBOB)

N'ubọchi mbu nke achicha ekoghi-eko, mb͕e ha nāchu aja ngabiga, ndi nēso uzọ-Ya we si Ya, Òle ebe I nāchọ ka ayi je dozie ka I we rie oriri ngabiga? O we zipu madu abua n'etiti ndi nēso uzọ-Ya, si ha, Jenu n'obodo a, otù nwoke nke bū ite miri gēzute kwa unu: sonu ya; ebe ọ bula ọ gābà kwa, sinu nna-nwe ulo, Onye-ozizí si, Òle ebe ulo-ọbìa edeberem di, ebe Mu na ndi nēso uzọm gēri oriri ngabiga? Ya onwe-ya gēgosi kwa unu ime-ulo uku di n'elu ulo akwadebeworo dozi kwa: n'ebe ahu dozienu ihe nye ayi. Ndi ahu nēso uzọ-Ya we pua ba n'obodo, hu dika Ọ gwara ha-ri: ha we dozie ememe ngabiga. Mb͕e o ruru anyasi Ya na ndi-ozi iri na abua ahu we bia. Mb͕e ha nānọdu na nri nēri kwa ihe, Jisus we si, N'ezie asim unu, Otù onye si n'etiti unu puta gāraram nye, bú onye Mu na ya nēri ihe. Ọ malitere iwuta ha, ha malite-kwa-ra isi Ya n'otù, Ọ̀ bu mu? Ma Ọ siri ha, Ọ bu otù onye nime unu iri na abua, onye nke Mu na ya nēsukọ nri n'afere. N'ihi na Nwa nke madu nāla, dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ banyere Ya: ma ahuhu gādiri nwoke ahu onye anēsite n'aka-ya rara Nwa nke madu nye Ọ buru na amughi nwoke ahu ọ gādi ya nma. Mb͕e ha nēri ihe, O we nara ob͕e achicha, gọzie ya, nyawa ya, nye ha, si, Naranu: nka bu arum. O we nara iko, kele kwa, we nye ha: ha nile we ṅua nime ya. O we si ha, Nka bu ọbaram nke ọb͕ub͕a-ndu, nke anāwusì n'ihi ọtutu madu. N'ezie asim unu, M'gaghi-aṅu kwa ma-ọli n'ihe si n'osisi vine puta, rue ubọchi ahu mb͕e M'gāṅu ya ọhu n'ala-eze Chineke. Mb͕e ha bùsiri abù, ha pua je ugwu Olive.

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara