MAK 13:33-37
MAK 13:33-37 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ebe ọ bụ na unu amaghị mgbe ha ga-emezu, nọrọnụ na nche! Mụrụkwanụ anya! Ọ dị ka nwoke hapụrụ ụlọ ya na-aga njem, tinye nʼaka ndị ohu ya ilekọta ihe, onye ọbụla nʼime ha ka o nyere ọrụ ọ ga-arụ ma nyekwa onye nche ọnụ ụzọ iwu ka ọ nọ na nche. “Ya mere nọrọnụ na nche, nʼihi na unu amaghị mgbe Onyenwe ụlọ ga-alọta. Ma ọ bụ nʼuhuruchi maọbụ nʼetiti abalị. Maọbụ mgbe ọkụkụ kwara akwa, maọbụ nʼisi ụtụtụ. Ọ bụrụ na ọ lọta na mberede, unu ekwela ka ọ lọkwute unu mgbe unu nọ nʼụra. Ihe m gwara unu ka m na-agwakwa mmadụ niile. ‘Nọrọnụ na nche.’ ”
MAK 13:33-37 Bible Nso (IGBOB)
Lezienu anya, murunu anya, nēkpe-kwa-nu ekpere: n'ihi na unu amataghi mb͕e oge ahu bu. Ọ di ka mb͕e madu, onye jere inọdu n'ala ndi ọzọ, ebe ọ rapuru ulo-ya, nye kwa ndi-orù-ya ọlu ichi-isi, nye onye ọ bula nime ha ọlu-ya, o nye-kwa-ra onye-ọnu-uzọ iwu ka ọ che nche. Ya mere, nēchenu nche: n'ihi na unu amataghi mb͕e Onye-nwe ulo gābia, ma ọ bu n'anyasi, ma-ọbu n'etiti abali, ma-ọbu mb͕e oke-ọkuku kwara, ma-ọbu n'ututu; ka O we ghara ihu unu ka unu nāraru ura, ma ọ buru na Ọ bia na mberede. Ma okwu M'nāgwa unu ka M'nāgwa madu nile, Nēchenu nche.