Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

MAK 12:18-37

MAK 12:18-37 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Ụfọdụ ndị Sadusii bụ ndị sịrị na mbilite nʼọnwụ adịghị bịakwutere ya jụọ ya sị, “Onye ozizi, Mosis nyere anyị iwu na ọ bụrụ na nwoke ọbụla anwụọ na-amụtaghị nwa, na nwanne ya nwoke ga-alụrụ nwunye nwoke ahụ, mụta ụmụ nʼaha nwanne ya nwoke ahụ nwụrụ anwụ. Ugbu a, e nwere ụmụnne nwoke asaa, nke mbụ lụrụ nwunye ma ọ nwụrụ na-amụtaghị ụmụ ọbụla. Nke abụọ lụrụ nwanyị ahụ di ya nwụrụ, ma ya onwe ya nwụkwara na-amụtaghị nwa. Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti ha asaa mụtara nwa ọbụla, nʼikpeazụ nwanyị ahụ nwụkwara. Nʼoge mbilite nʼọnwụ, nwunye onye ka ọ ga-abụ, ebe ụmụnne asaa ndị a lụtụchara ya?” Jisọs zara ha sị, “Ọ bụ na unu adịghị ejehie ụzọ nʼihi na unu aghọtaghị ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ, maọbụ ike Chineke? Mgbe ha ga-esite nʼọnwụ bilie, ọlụlụ di na nwunye agaghị a dị; kama ha ga-adị ka ndị mmụọ ozi nʼeluigwe. Ma nʼokwu banyere ndị nwụrụ anwụ isite nʼọnwụ bilie, ọ bụ na unu agụtabeghị nʼakwụkwọ Mosis ebe e dere maka ọhịa ahụ na-ere ọkụ, na otu Chineke si gwa ya, Abụ m Chineke Ebraham, Chineke nke Aịzik na Chineke nke Jekọb. Ọ bụghị Chineke nke ndị nwụrụ anwụ kama nke ndị dị ndụ. Nʼebe ahụ ka unu dahiere nke ukwuu.” Otu nʼime ndị ozizi iwu bịara nʼoge ahụ ha na-arụrịta ụka. Mgbe ọ hụrụ na o nyere ha ezi ọsịsa, ọ jụrụ ya sị, “Nʼime iwu niile olee nke kachasị mkpa?” Jisọs zara ya sị, “Nke kachasị mkpa bụ nke a, ‘Nụrụ gị Izrel, Onyenwe anyị bụ Chineke anyị, Onyenwe anyị bụ otu. Were obi gị niile na mkpụrụobi gị niile na uche gị niile na ike gị niile hụ Onyenwe anyị bụ Chineke gị nʼanya.’ Nke abụọ ya bụ nke a, ‘Hụ onye agbataobi gị nʼanya dị ka onwe gị.’ Ọ dịghị iwu ọzọ dị nke karịrị ndị a.” Onye ode akwụkwọ ahụ sịrị ya, “Onye ozizi, nʼezie, ị zara nke ọma na Chineke bụ otu, na enweghịkwa chi ọzọ dị karịa ya. Ịhụ ya nʼanya site nʼiji obi gị niile, na nghọta gị niile, nakwa iji ike gị niile, nʼịhụkwa onye agbataobi gị nʼanya dị ka onwe gị, kachasị onyinye aja nsure ọkụ na ịchụ aja niile.” Mgbe Jisọs hụrụ na ọ zara nke ọma, ọ gwara ya sị, “Ị nọ alaeze Chineke nso.” Site na mgbe ahụ ọ dịkwaghị onye ọbụla nwere obi ike ịjụ ya ajụjụ ọzọ. Mgbe Jisọs nọ na-ezi ihe nʼụlọnsọ, ọ kwuru sị, “Gịnị mere ndị ozizi iwu ji sị na Kraịst bụ nwa Devid? Devid nʼonwe ya sitere nʼike Mmụọ Nsọ kwuo sị, “ ‘Onyenwe anyị gwara Onyenwe m okwu sị, “Nọdụ ala nʼaka nri m ruo mgbe m ga-edebe ndị iro gị nʼokpuru ụkwụ gị abụọ.” ’ Devid nʼonwe ya kpọrọ ya Onyenwe anyị. Oleekwanụ ụzọ o si bụrụ nwa ya?” Igwe mmadụ ahụ jiri obi ụtọ na-ege ya ntị.

MAK 12:18-37 Bible Nso (IGBOB)

Ndi-Sadusi, ndi si na nbilite-n'ọnwu adighi, we biakute Ya; ha we jua Ya, si, Onye-ozizí, Moses dere akwukwọ nye ayi, si, Ọ buru na nwa-nne-nwoke onye ọ bula anwua, rapu nwunye n'azu, ma ọ rapughi nwa, ka nwa-nne-ya nwoke kuru nwunye-ya, me ka nkpuru toputara nwa-nne-ya. Umu-nne-ndikom asa di: nke-mbu luru nwunye, we nwua nārapughi nkpuru; nke-abua we kuru ya, nwu kwa, ọ rapughi kwa nkpuru n'azu; nke-atọ otú ahu kwa: ndikom asa ahu arapughi nkpuru. N'ikpe-azu ha nile nwanyi ahu nwu-kwa-ra. Na nbilite-n'ọnwu, nwùnye onye n'etiti ha ka ọ gābu? n'ihi na ha asa nwere ya na nwunye. Jisus siri ha, Ọ̀ bughi n'ihi nka ka unu ji hie uzọ, na unu amataghi ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, ma-ọbu ike Chineke? N'ihi na mb͕e ha gēsi na ndi nwuru anwu bilie, ha alughi nwunye, enyeghi kwa ha n'ọlulu-di; kama ha di ka ndi-mọ-ozi di n'elu-igwe. Ma n'okwu bayere ndi nwuru anwu, na anēme ka ha si n'ọnwu bilie; ùnu agughi n'akwukwọ Moses, n'ebe edere okwu bayere Osisi ntà, otú Chineke gwara ya, si, Mu onwem bu Chineke nke Abraham, na Chineke nke Aisak, na Chineke nke Jekob? Ọ bughi Chineke nke ndi nwuru anwu, kama Ọ bu nke ndi di ndu: unu onwe-unu nēhie uzọ nke-uku. Otù onye nime ndi-ode-akwukwọ bia-kwa-ra, we nu ka ha nājurita onwe-ha ajuju, ma ebe ọ matara na Ọ zarari ha nke-ọma, ọ jua Ya, si, Òle nke bu nke-mbu n'ihe nile enyere n'iwu? Jisus zara, si, Nke-mbu bu, Nuru, Israel; Onye-nwe-ayi, bú Chineke-ayi, Onye-nwe-ayi bu otù: i gāhu kwa Onye-nwe-ayi, bú Chineke-gi, n'anya, site n'obi-gi dum, site kwa na nkpuru-obi-gi dum, site kwa n'uche-gi dum, site kwa n'ike-gi dum. Nke-abua bu nke à, I gāhu onye-ab͕ata-obi-gi n'anya dika onwe-gi. Ọ dighi ihe ọzọ enyere n'iwu nke dikariri ndia. Ode-akwukwọ ahu we si Ya, Onye-ozizi, n'ezie I kwuru nke-ọma na Ọ bu otù; ọ dighi kwa chi ọzọ di ma-ọbughi Ya: na ihu Ya n'anya site n'obi-gi dum, site kwa na nghọta-gi dum, site kwa n'ike-gi dum, na ihu onye-ab͕ata-obi-gi n'anya dika onwe-gi, ọ kachasi àjà-nsuresi-ọku nile na àjà ọzọ nile nke-uku. Mb͕e Jisus huru na ọ zara dika onye nwere uche, Ọ si ya, I nọghi ebe di anya n'ala-eze Chineke. Ma ọ dighi onye nwere anya-ike site na mb͕e ahu iju Ya ajuju. Jisus we za, mb͕e Ọ nēzi ihe n'ulo uku Chineke, si, Ndi-ode-akwukwọ si aṅa kwu na Kraist ahu bu nwa Devid? Devid onwe-ya siri nime Mọ Nsọ, Onye-nwe-ayi siri Onye-nwem, Nọdu ala n'aka-nrim, Rue mb͕e M'gēdo ndi-iro-Gi ka ihe-nb͕akwasi-ukwu nke ukwu-Gi abua. Devid onwe-ya nākpọ Ya Onye-nwe-ya; òle ebe O si buru kwa Nwa-ya? Oké ìgwè madu ahu we were obi-utọ nu okwu-Ya.