MAK 11:22-24
MAK 11:22-24 Bible Nso (IGBOB)
Jisus we za, si ha, Nwenu okwukwe Chineke. N'ezie asim unu, Onye ọ bula nke gāsi ugwu a, Ka ewelie gi, tubà gi nime oké osimiri; nke nāgaghi-enwe obi abua, kama o kwere na ihe ọ nēkwu nēme; ọ gādiri ya. Ya mere M'ji si unu, Ihe nile, ka ha ra, bú nke unu nēkpe n'ekpere riọ kwa, kwenu na unu anatawo ha, ha gādiri unu.
Kesaa
Gụọ MAK 11MAK 11:22-24 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Jisọs zara ha sị, “Nweenụ okwukwe nʼime Chineke. Nʼezie agwa m unu, ọ bụrụ na onye ọbụla asị ugwu a, ‘Si nʼebe a wezuga onwe gị, gaa dabanye nʼoke osimiri,’ nke na-enweghị obi abụọ nʼime ya, kama o kweere na ihe o kwuru ga-emezu, ihe ahụ ọ kwuru ga-emezukwa. Ya mere, ka m gwa unu, ihe ọbụla unu rịọrọ nʼekpere, kwerenụ na unu anatala ya, ọ ga-abụkwa nke unu.
Kesaa
Gụọ MAK 11