Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

MAK 11:1-25

MAK 11:1-25 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Mgbe ha na-abịaru Jerusalem nso, ha rutere Betfeji na Betani nʼUgwu Oliv. Jisọs zipụrụ mmadụ abụọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya. Ọ gwara ha sị, “Gaanụ nʼime obodo nta dị nʼihu unu. Mgbe unu na-abanye nʼime ya, unu ga-ahụ nwa ịnyịnya e kedoro nʼebe ahụ nke onye ọbụla na-arịkwasịbeghị nʼelu ya. Tọpụnụ ya nʼagbụ, kpụtaranụ m ya. Ọ bụrụ na onye ọbụla asị unu, ‘Gịnị mere unu ji na-atọpụ ya nʼagbụ?’ sịnụ onye ahụ, ‘Ọ dị Onyenwe anyị mkpa, ọ ga-akpụghachitekwa ya ngwangwa.’ ” Ha ruru ma hụ otu nwa ịnyịnya e kedoro nʼakụkụ ụzọ, nʼihu otu ụlọ nke dị nʼama. Dị ka ha na-atọpụ ya, ụfọdụ mmadụ guzo nʼebe ahụ sịrị ha, “Gịnị ka unu na-eme, unu na-atọpụ nwa ịnyịnya a?” Ha gwara ha ihe Jisọs kwuru, ha hapụkwara ha ka ha tọrọ ịnyịnya ibu ahụ. Ha kpụtaara Jisọs nwa ịnyịnya ahụ, ma wụkwasịkwa uwe ha nʼelu ya, ọ nọkwasịrị nʼelu ya. Ọtụtụ mmadụ tụsara uwe ha nʼokporoụzọ, ma ndị ọzọ tụsara alaka osisi ha gbutere nʼọhịa. Ndị na-aga nʼihu na ndị na-esokwa nʼazụ, tiri mkpu na-asị, “Hozanna!” “Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị!” “Ngọzị dịrị alaeze ahụ na-abịa nke nna anyị Devid!” “Hozanna nʼebe kachasị ihe niile elu!” Mgbe ọ batara na Jerusalem, ọ gara nʼime nʼụlọnsọ ukwu ahụ. Mgbe o legharịchara anya nʼihe niile dị nʼebe ahụ, ma ebe ọ bụ na chi ejiela, ya na ndị na-eso ụzọ ya pụrụ gaa Betani. Nʼechi ya, mgbe ha si Betani na-apụta, agụụ gụrụ ya. Site nʼebe dị anya, ọ hụrụ otu osisi fiig nke nwere akwụkwọ ndụ. Mgbe ọ bịaruru osisi ahụ nso, ọ gagharịrị nʼukwu ya niile ma ọ ga-achọta mkpụrụ nʼelu ya, ma ọ hụghị mkpụrụ ọbụla, naanị akwụkwọ ndụ, nʼihi na oge a abụghị oge osisi a ji amị mkpụrụ. Mgbe ahụ, ọ gwara osisi ahụ sị, “Ka mmadụ ọbụla ghara iri mkpụrụ sitere na gị ruo ebighị ebi.” Ndị na-eso ụzọ ya nụrụ mgbe o kwuru okwu a. Mgbe ha ruru Jerusalem, ọ banyere nʼime ụlọnsọ ukwu, bido ịchụpụ ndị na-azụ ahịa na ndị na-ere ahịa nʼebe ahụ. O kpugharịrị tebul ndị na-agbanwe ego, kwatuokwa oche niile nʼọdụ ahịa ndị na-ere nduru. O gbochikwara onye ọbụla iwebata ngwongwo ahịa orire nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ. Ma dị ka ọ na-ezi ha ihe, ọ sịrị, “Ọ bụ na-edeghị ya sị, Ụlọ m ka a ga-akpọ ụlọ ekpere nye mba niile? Ma unu emeela ya ọgba ndị na-apụnara mmadụ ihe nʼike.” Mgbe ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu nụrụ nke a, ha malitere na-achọ ụzọ igbu ya ma ha tụrụ egwu ya nʼihi na ozizi ya juru igwe mmadụ niile ahụ anya. Mgbe uhuruchi bịara, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya siri nʼobodo ahụ pụọ. Nʼisi ụtụtụ echi ya, mgbe ha na-agafe, ha hụrụ na osisi fiig a esitela na mgbọrọgwụ ya kpọnwụọ. Pita chetara ihe merenụ ma sị ya, “Onye ozizi, lee! Osisi fiig ahụ ị bụrụ ọnụ akpọnwụọla!” Jisọs zara ha sị, “Nweenụ okwukwe nʼime Chineke. Nʼezie agwa m unu, ọ bụrụ na onye ọbụla asị ugwu a, ‘Si nʼebe a wezuga onwe gị, gaa dabanye nʼoke osimiri,’ nke na-enweghị obi abụọ nʼime ya, kama o kweere na ihe o kwuru ga-emezu, ihe ahụ ọ kwuru ga-emezukwa. Ya mere, ka m gwa unu, ihe ọbụla unu rịọrọ nʼekpere, kwerenụ na unu anatala ya, ọ ga-abụkwa nke unu. Ma mgbe ọbụla unu guzoro na-ekpe ekpere, gbagharanụ, ma ọ bụrụ na unu nwere ihe ọbụla megide onye ọbụla, ka Nna unu nke bi nʼeluigwe gbagharakwa unu mmehie unu.

MAK 11:1-25 Bible Nso (IGBOB)

Mbe ha nābiaru Jerusalem nso, rue Betfagi na Betani nso, n'uzọ ugwu Olive, o we ziga madu abua n'etiti ndi nēso uzọ-Ya, si ha, Jenu n'obodo ntà nke di na ncherita-iru unu: ngwa ngwa mb͕e unu nābà nime ya, unu gāhu nwa-inyinya-ibu elibeworo, nke madu ọ bula akānọkwasighi; tọpunu ya, sekputa ya. Ọ buru kwa na onye ọ bula si unu, Gini mere unu nēme nka? sinu, Ọ di Onye-nwe-ayi nkpà; ngwa ngwa Ọ gēzighachi ya n'ebe a ọzọ. Ha we je, hu nwa-inyinya-ibu elibere n'ọnu-uzọ n'èzí n'amá; ha we tọpu ya. Ufọdu nime ndi guzoro n'ebe ahu we si ha, Ùnu nēme gini, nātọpu nwa-inyinya-ibu ahu? Ha we gwa ha okwu dika Jisus kwuru: ha we rapu ha. Ha we sekputara Jisus nwa-inyinya-ibu ahu, wukwasi ya uwe-ha; O we nọkwasi ya. Ọtutu madu we tusa uwe-ha n'uzọ; ndi ọzọ akwukwọ osisi, nke ha b͕ubitara n'ubi. Ndi naga n'iru, na ndi nēso, nēti nkpu, si, Hosanna; Onye agọziri agọzi ka Onye ahu bu Nke nābia n'aha Onye-nwe-ayi: Ihe agọziri agọzi ka ala-eze bu nke nābia, ala-eze nke nna-ayi Devid: Hosanna n'ebe kachasi ihe nile elu. O we ba Jerusalem, n'ulo uku Chineke; mb͕e O lesiri ihe nile anya buruburu, ebe ọ bu mb͕e anyasi ub͕u a, O we pua je Betani, Ya na ndi-ozi iri na abua ahu. N'echi-ya, mb͕e ha putara na Betani, agu guru Ya. Mb͕e Ọ huru osisi fig n'ebe di anya nke nwere akwukwọ ndu, Ọ bia, ma ebe ọ di otú a Ọ gāhu ihe n'elu ya: ma mb͕e Ọ biaruru ya aru, Ọ hughi ihe ọ bula ma-ọbughi akwuwọ ndu: n'ihi na ọ bughi oge nkpuru fig. O we za, si ya, Onye ọ bula eri-kwa-la nkpuru ọzọ si n'elu gi puta ebighi-ebi. Ndi nēso uzọ-Ya we nu ya. Ha we bia rue Jerusalem: O we ba n'ulo uku Chineke, malite ichupu ndi nēre na ndi nāzu n'ulo uku Chineke, O we kpùe table nile nteke ndi nāb͕anwe ego iru, na oche nile nke ndi nēre nduru; O kweghi kwa ka onye ọ bula būru ihe gabiga n'etiti ulo uku Chineke. O we zí ihe, si ha, Èdeghi ya n'akwukwọ nsọ, si, Agākpọ ulom ulo ekpere mba nile? ma unu onwe-unu emewo ya ọb͕à ndi nāpunara madu ihe. Ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ we nu ya, ha we nāchọ uzọ ha gēsi la Ya n'iyì: n'ihi na ha nātu egwu Ya, n'ihi na ibobo ozizí-Ya nwuru ìgwè madu nile n'aru. Mb͕e ọ bula o ruru anyasi Ọ nēsi n'obodo apu. Mb͕e ha nāga n'ututu, ha we hu osisi fig ahu na ọ kpọnwururi site na nkpọrọgwu. Pita we cheta, si Ya, Rabai, le, osisi fig nke I buru ọnu akpọnwuwo. Jisus we za, si ha, Nwenu okwukwe Chineke. N'ezie asim unu, Onye ọ bula nke gāsi ugwu a, Ka ewelie gi, tubà gi nime oké osimiri; nke nāgaghi-enwe obi abua, kama o kwere na ihe ọ nēkwu nēme; ọ gādiri ya. Ya mere M'ji si unu, Ihe nile, ka ha ra, bú nke unu nēkpe n'ekpere riọ kwa, kwenu na unu anatawo ha, ha gādiri unu. Ọzọ, mb͕e ọ bula unu guzoro nēkpe ekpere, b͕agharanu, ma o buru na unu nwere ihe ọ bula megide onye ọ bula; ka Nna-unu Nke bi n'elu-igwe we b͕aghara kwa unu ndahie nile unu.