Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

MAK 10:1-52

MAK 10:1-52 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Ọ hapụrụ ebe ahụ gaa nʼobodo ndị dị na mpaghara Judịa ma gafeekwa nʼofe Jọdan. Igwe mmadụ bịakwutekwara ya, ọzọ, dị ka o si emekwa, o ziri ha ihe. Ụfọdụ ndị Farisii bịara, ma nʼihi ị nwalee ya, ha jụrụ ya sị, “O ziri ezi nʼiwu ka nwoke gbaa nwunye ya alụkwaghị m?” Ma ọ zara ha sị, “Gịnị ka Mosis nyere unu nʼiwu?” Ha sịrị, “Mosis kwenyere ka nwoke dee asambodo alụkwaghị m, nye nwunye ya ma zilaga ya.” Jisọs sịrị ha, “Ọ bụ nʼihi na obi unu siri ike nke ukwuu ka o ji deere unu iwu a. Ma na mmalite nke okike ụwa, Chineke ‘kere ha nwoke na nwanyị.’ ‘Nʼihi nke a ka nwoke ga-eji hapụ nne ya na nna ya e jikọta ya na nwunye ya. Ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ.’ Ya mere, ha abụkwaghị mmadụ abụọ ọzọ, kama otu anụ ahụ. Ya mere, ihe Chineke jikọtara, ka mmadụ ọbụla atọsala ya.” Mgbe ha banyere nʼụlọ, ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya ọzọ ihe banyere okwu a. Ọ sịrị ha, “Onye ọbụla gbara nwunye ya alụkwaghị m ma lụrụ nwanyị ọzọ na-eme mmehie ịkwa iko megide ya. Ma ọ bụrụ na nwanyị ọbụla agbaa dị ya alụkwaghị m ma lụrụ nwoke ọzọ, ọ na-emekwa mmehie ịkwa iko.” Ndị mmadụ na-ekutere ya ụmụntakịrị ka o metụ ha aka, ma ndị na-eso ụzọ ya baara ha mba. Ma mgbe Jisọs hụrụ nke a, iwe were ya nke ukwuu, ọ sịrị ha, “Hapụnụ ụmụntakịrị ka ha bịakwute m. Unu egbochikwala ha. Nʼihi na alaeze Chineke bụ nke ndị dị otu a. Nʼeziokwu asị m unu, onye ọbụla nke na-agaghị anabata alaeze Chineke dị ka nwantakịrị agaghị aba nʼime ya.” Mgbe ahụ, o kuuru ha nʼaka ya, bikwasị ha aka ya abụọ ma gọzie ha. Mgbe ọ na-ebili njem, otu nwoke gbaara ọsọ bịa gbuo ikpere nʼihu ya. Ọ jụrụ ya sị, “Ezi onye ozizi ọma, gịnị ka m ga-eme ka m keta ndụ ebighị ebi?” Jisọs sịrị ya, “Gịnị mere i ji akpọ m ezi mmadụ? Ọ dịghị onye ọbụla bụ ezi mmadụ ma ọ bụghị naanị Chineke. Ị maara ihe niile enyere nʼiwu: ‘Egbula mmadụ, a kwala iko, e zula ohi, a gbala ama ụgha, a ghọgbula mmadụ ibe gị, sọpụrụ nne na nna gị.’” Ọ sịrị ya, “E, onye ozizi, Edebezuchaala m ha niile siterị na mgbe m bụ nwata.” Jisọs lere ya anya, hụ ya nʼanya. Mgbe ahụ, ọ gwara ya sị, “Ọ fọdụrụ naanị otu ihe ị ga-eme. Laa, ugbu a, ree ihe niile i nwere, nyekwa ndị ogbenye ego i retara. I mesịa nke a, ị ga-enwe akụ nʼeluigwe. Mgbe ahụ bịaghachi soro m.” Mgbe ọ nụrụ okwu a, ihu ya gbarụrụ. O sitere nʼebe ahụ pụọ na mwute, nʼihi na ọ bụ ọgaranya nke nwere ọtụtụ akụnụba. Jisọs legharịrị anya gwa ndị na-eso ụzọ ya sị, “Lee ka o si bụrụ ihe rara ahụ na onye ọgaranya ga-abanye nʼalaeze Chineke.” Okwu ya tụrụ ndị na-eso ụzọ ya nʼanya, ma Jisọs gwakwara ha ọzọ sị, “Ụmụntakịrị, ọ bụ nnọọ ihe rara ahụ ịbanye nʼalaeze Chineke. Ọ dịrị ịnyịnya kamel mfe isite nʼanya agịga gafee, karịa onye ọgaranya ịbanye nʼalaeze Chineke.” Okwu a jubigara ha anya oke. Ha jụrịtara ibe ha sị, “Onye kwanụ ka a ga-azọpụta?” Ma Jisọs lere ha anya sị ha, “Nʼebe mmadụ nọ, ọ bụ ihe rara ahụ. Ma nʼebe Chineke nọ, ihe niile dị mfe. Ọ dịghị ihe rara Chineke ahụ ime.” Pita malitere ịgwa ya sị, “Anyị ahapụla ihe niile soro gị!” Jisọs sịrị, “Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, ọ dịghị onye ọbụla hapụrụ ụlọ ya, maọbụ ụmụnne ya ndị nwoke, maọbụ ụmụnne ya ndị nwanyị, maọbụ nne ya, maọbụ nna ya, maọbụ ụmụntakịrị ya, maọbụ ala ubi ya nʼihi m, na nʼihi oziọma a, nke na-agaghị anataghachikwa nʼụwa a, ụlọ, ụmụnne ndị nwoke, ụmụnne ndị nwanyị, nne, ụmụaka na ala ubi, tinyere mkpagbu, ihe ruru okpukpu narị karịa ihe niile nke ọ hapụrụ. Ọ ga-anatakwa ndụ ebighị ebi nʼụwa ọzọ. Ma ọtụtụ ndị bu ụzọ ga-abụ ndị ikpeazụ, ma ọtụtụ ndị ikpeazụ ga-abụkwa ndị bu ụzọ.” Ha nọ nʼụzọ na-aga Jerusalem, ma Jisọs nọ nʼihu ha, nke a juru ndị na-eso ụzọ ya nʼanya. Otu a kwa, ndị mmadụ niile na-abịa ha nʼazụ tụkwara egwu. Ọzọkwa, ọ kpọpụrụ mmadụ iri na abụọ ahụ nʼakụkụ, malite ịgwa ha ihe gaje ịdakwasị ya. Ọ sịrị, “Leenụ, anyị na-aga Jerusalem, ebe a ga-arara Nwa nke Mmadụ nyefee nʼaka ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu. Ha ga-ama ya ikpe ọnwụ, nyefekwa ya nʼaka ndị mba ọzọ. Ha ga-akwa ya emo, gbụsakwa ya ọnụ mmiri asụ, pịa ya ihe ma gbukwaa ya. Ma mgbe ụbọchị atọ gasịrị, ọ ga-esite nʼọnwụ bilie.” Jemis na Jọn ụmụ Zebedi bịakwutere ya. Ha sịrị ya, “Onye ozizi, anyị chọrọ ka i meere anyị ihe ọbụla anyị rịọrọ.” Ọ sịrị ha, “Gịnị ka unu chọrọ ka m meere unu?” Ha sịrị ya, “Kwere ka otu onye nʼime anyị nọrọ nʼaka nri gị, onye nke ọzọ nʼaka ekpe gị nʼime ebube gị.” Ma Jisọs sịrị ha, “Unu amataghị ihe unu na-arịọ. Unu pụrụ ịṅụ iko ahụ mụ onwe m ga-aṅụ maọbụ bụrụ ndị a ga-eme ụdị baptizim a ga-eme m?” Ha zaghachiri ya, “Anyị pụrụ.” Jisọs sịrị ha, “Unu ga-aṅụ iko m ga-aṅụ, a ga-emekwa unu baptizim nke a ga-eme m. Ma ịnọdụ nʼaka nri m maọbụ nʼaka ekpe m abụghị ihe dịrị m inye, kama ọnọdụ ndị a dịịrị ndị a kwadooro ha.” Mgbe mmadụ iri ndị ọzọ nụrụ nke a, iwe jupụtara ha obi nʼihi Jemis na Jọn. Ma Jisọs kpọkọtara ha niile sị ha, “Dị ka unu onwe unu maara, ndị eze nke ndị mba ọzọ, na ndị a maara aha ha, na-eji aka ike na-achị ndị nọ nʼokpuru ha. Ma nʼetiti unu ọ gaghị adị otu a. Kama onye ọbụla chọrọ ịdị ukwuu nʼetiti unu ga-abụ onye na-ejere unu ozi. Onye ọbụla nke chọrọ ịbụ onye mbụ nʼetiti unu, ga-abụ ohu mmadụ niile. Nʼihi na Nwa nke Mmadụ abịaghị ka e jeere ya ozi. Kama ka o jee ozi ma nyekwa ndụ ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta nke ọtụtụ mmadụ.” Mgbe ha ruru Jeriko, dị ka Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya na ọtụtụ igwe mmadụ sitere nʼobodo Jeriko na-apụ, otu nwoke kpuru ìsì aha ya bụ Batimiọs (aha ya pụtara “nwa nwoke Timiọs”), onye arịrịọ nọdụrụ ala nʼakụkụ ụzọ. Mgbe ọ nụrụ na ọ bụ Jisọs onye Nazaret na-agafe, o bidoro iti mkpu na-asị, “Jisọs, nwa Devid, meere m ebere!” Ọtụtụ mmadụ bara ya mba ka o mechie ọnụ. Ma ọ nọgidesịrị ike na-eti mkpu na-asị, “Nwa Devid, meere m ebere!” Jisọs kwụsịrị kwuo sị, “Kpọọnụ ya.” Ya mere ha kpọrọ onye ìsì ahụ, sị ya, “Mesaa ihu gị bilie nʼụkwụ gị, ọ na-akpọ gị.” Ọ tufuru uwe mwụda ya, wulie nʼụkwụ ya, bịakwute Jisọs. Jisọs sịrị ya, “Gịnị ka ị chọrọ ka m meere gị?” Onye ìsì ahụ sịrị ya, “Onye ozizi m, achọrọ m ka m hụ ụzọ.” Jisọs sịrị ya, “Laa, okwukwe gị azọpụtala gị.” Nʼotu oge ahụ, o bidoro ịhụ ụzọ, sorokwa ya gawa nʼụzọ ahụ.

MAK 10:1-52 Bible Nso (IGBOB)

O we si n'ebe ahu bilie, bia n'ókè-ala Judia, ya na ofè ọzọ nke Jọdan: ìgwè madu nile we zukọ ọzọ n'ebe Ọ nọ; ka O siri eme, O we nēzí ha ihe ọzọ. Ndi-Farisi we biakute Ya, jua Ya, si, Ò ziri ezi n'iwu ka nwoke rapu nwunye-ya? nānwa Ya. O we za, si ha, Gini ka Moses nyere unu n'iwu? Ha we si, Moses kwere ka ede akwukwọ nkewa, ka arapu kwa ya. Ma Jisus siri ha, N'ihi obi-etili-unu ka o dere unu iwu a n'akwukwọ. Ma site na nmalite òkìkè uwa, Nwoke na nwanyi ka O mere ha. N'ihi nka ka nwoke gēji rapu nna-ya na nne-ya, rapara n'aru nwunye-ya; ha abua ewe ghọ otù anu-aru: ya mere ha abughi kwa madu abua ọzọ, kama ọ bu otù anu-aru. Ya mere, ihe Chineke kekọtara, madu atọsala. N'ulo ndi nēso uzọ-Ya we jua Ya ajuju okwu a ọzọ. O we si ha, Onye ọ bula nke gārapu nwunye-ya, luru kwa nwunye ọzọ, ọ nākwa iko megide ya: ọ buru kwa na nwanyi onwe-ya arapu di-ya, luru kwa di ọzọ, ọ nākwa iko. Ha we kutara Ya umu-ntakiri, ka O we metu ha aka: ma ndi nēso uzọ-Ya bara ha nba. Ma mb͕e Jisus huru ya, iwe were Ya nke-uku, Ọ si ha, Kwenu ka umu-ntakiri biakutem; unu eb͕ochila ha: n'ihi na ala-eze Chineke bu nke ndi di otú a. N'ezie asim unu, Onye ọ bula nke nāgaghi-anara ala-eze Chineke dika nwatakiri, ọ gaghi-abà nime ya ma-ọli. O we kuru ha n'aka-Ya, bikwasi ha aka-Ya abua, we gọzie ha nke-ọma. Mb͕e ọ nāpu n'uzọ, otù onye we b͕akuru Ya, b͕uru Ya ikperè, jua Ya, si, Ezi Onye-ozizí, gini ka m'gēme ka m'we keta ndu ebighi-ebi? Ma Jisus siri ya, Gini mere i nākpọm ezi onye? ọ dighi onye ọ bula bu ezi onye ma-ọbughi otù Onye, bú Chineke. I matawo ihe nile enyere n'iwu, Eb͕ula madu, Akwala iko, Ezula ori, Ab͕ala àmà ugha, Emeb͕ula madu, Sọpuru nna-gi na nne-gi. Ma ọ siri Ya, Onye-ozizí, ihe ndia nile ka m'ribara ama site n'okorọbia. Ma mb͕e Jisus lere ya anya Ọ hu ya n'anya, si ya, Otù ihe fọduru gi ime: laba, re ka ihe i nwere ra, nye ndi-ob͕eye, i gēnwe kwa àkù n'elu-igwe: bia kwa, som. Ma iru-ya b͕aruru n'okwu a, o we la na nwuta: n'ihi na ọ bu onye nwere ihe ri nne. Jisus we le anya buruburu, si ndi nēso uzọ-Ya, Le otú ọ diri ndi nwere àkù ike ibà n'ala-eze Chineke! Ma ibobo okwu-Ya nile nwuru ndi nēso uzọ-Ya n'aru. Ma Jisus za-kwa-ra ọzọ, si ha, Umum, le otú ọ diri ha ike ibà n'ala-eze Chineke, bú ndi wereworo obi-ha tukwasi n'àkù! Ọ dikariri camel nfé igabiga n'anya àgìgá, kari ọgaranya ibà n'ala-eze Chineke. Ma ibobo nwubigara ha ókè n'aru, ha sirita onwe-ha, Onye kwa ka apuru izọputa? Jisus lere ha anya, si, N'ebe madu nọ ọ bu ihe anāpughi íme, ma ọ bughi n'ebe Chineke nọ n'ihi na apuru ime ihe nile n'ebe Chineke nọ. Pita malitere isi Ya, Le, ayi onwe-ayi rapuru ihe nile, ayi esowo kwa Gi. Jisus siri, N'ezie asim unu, Ọ dighi onye ọ bula nke rapuru ulo, ma-ọbu umu-nne-ndikom, ma-ọbu umu-nne-ndinyom, ma-ọbu nne, ma-ọbu nna, ma-ọbu umu, ma-ọbu ubi, n'ihim, na n'ihi ozi ọma nkem, ma-ọbughi na ọ gānata ọgu ise ọgu ise ub͕u a n'oge a, ulo, na umu-nne-ndikom, na umu-nne-ndinyom, na nne, na umu, na ubi, ha na nsob͕u; ọ gānata kwa ndu ebighi-ebi n'oge nke nābia. Ma ọtutu ndi bu uzọ gābu ndi-ikpe-azu; ndi-ikpe-azu gābu kwa ndi bu uzọ. Ma ha nọ n'uzọ, nārigoro Jerusalem; Jisus we nāga n'iru ha: ibobo nwu-kwa-ra ha n'aru; ma ndi nēso Ya nātu egwu. O we kuru ndi-ozi iri na abua ahu tiyere Onwe-ya ọzọ, malite igwa ha ihe nile gaje ime Ya, si, Le, ayi nārigoro Jerusalem; agārara kwa Nwa nke madu nye n'aka ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ; ha gāma kwa Ya ikpe ọnwu, rara Ya nye n'aka ndi mba ọzọ: ha gēme kwa Ya ihe-ọchi, busa Ya ọnu-miri, pia Ya ihe, b͕ue Ya: Ọ gēsi kwa n'ọnwu bilie mb͕e ubọchi atọ gasiri. Jemes na Jọn, bú umu Zebedi, we biakute Ya, si Ya, Onye-ozizí, ayi nāchọ ka I mere ayi ihe ọ bula ayi gāriọ Gi. O we si ha, Gini ka unu nāchọ ka M'mere unu? Ha we si Ya, Me ayi ka ayi nọdu, otù n'aka-nri-Gi, otù n'aka-ekpe, n'ebube-Gi. Ma Jisus siri ha, Unu amataghi ihe unu nāriọ. Ùnu puru iṅu iko ahu nke Mu onwem nāṅu? ma-ọbu ka eme unu baptism ahu dika anēme Mu onwem? Ha we si Ya, Ayi puru. Jisus we si ha, Iko Mu onwem nāṅu ka unu gaṅu; baptism nke anēme Mu onwem ka agēme kwa unu: ma inọdu n'aka-nrim ma-ọbu n'aka-ekpem abughi nkem inye: kama ọ diri ndi edoziworo ya. Mb͕e ndi-ozi iri fọduru nuru ya iwe we malite iwe ha nke-uku n'ihi Jemes na Jọn. Jisus we kpọ ha biakute Ya, si ha, Unu amatawo na ndi aguru ibu ndi-isi nke mba nile ọzọ nēme ha dika ndi nwe ha; ndi uku ha nāchi kwa ha. Ma ọ dighi otú a n'etiti unu: kama onye ọ bula nke nāchọ ka eme ya onye uku n'etiti unu, ọ gābu onye nējere unu ozi: ọzọ, onye ọ bula nke nāchọ ka ọ buru onye-isi n'etiti unu, ọ gabu orù unu nile. N'ihi na Nwa nke madu Onwe-ya abiaghi ka ejere Ya ozi, kama ka O je ozi, ka O were kwa ndu-Ya nye ka ọ buru ihe-nb͕aputa n'ọnọdu ọtutu madu. Ha we bia rue Jeriko: mb͕e Ọ nāputa na Jeriko, Ya na ndi nēso uzọ-Ya na oké ìgwè madu, nwa-nwoke Timiọs, bú Bātimiọs, onye-aririọ kpuru ìsì, nānọdu n'akuku uzọ. Mb͕e ọ nuru na ọ bu Jisus Onye Nazaret, o we malite íti nkpu, na isi, Nwa Devid, Jisus, merem ebere. Ọtutu madu we bara ya nba, ka o kpuchie ọnu-ya: ma o tikariri nkpu nke-uku, si, Nwa Devid, merem ebere. Jisus we guzo, si, Kpọnu ya. Ha we kpọ onye-ìsì ahu, si ya, Nwe obi ike: bilie, Ọ nākpọ gi. O we chifu uwe-ya, zọlie, biakute Jisus. Jisus we za ya, si, Gini ka i nāchọ ka M'mere gi? Onye-ìsì ahu we si ya, Rabonai, ka eme ka m'hu uzọ. Jisus we si ya, Laba; okwukwe-gi azọputawo gi. Ngwa ngwa ewe me ka ọ hu uzọ, o we nēso Ya n'uzọ.