MAK 1:9-12
MAK 1:9-12 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼoge ahụ, Jisọs sitere na Nazaret nke Galili bịa nʼosimiri Jọdan, ebe Jọn mere ya baptizim. Ma mgbe o si nʼime mmiri ahụ na-apụta, ọ hụrụ ka eluigwe meghere. Hụkwa Mmụọ Nsọ dị ka nduru ka ọ rịdatara bekwasị ya nʼisi ya. Otu olu si nʼeluigwe daa, “Ị bụ Ọkpara m hụrụ nʼanya, ihe gị dị m ezi mma.” Ngwangwa, Mmụọ Nsọ duuru ya baa nʼime ọzara.
Kesaa
Gụọ MAK 1MAK 1:9-12 Bible Nso (IGBOB)
O rue na mb͕e ahu, Jisus siri na Nazaret nke Galili bia, Jọn we mee Ya baptism nime Jọdan. Ngwa ngwa mb͕e O si na miri nārigo, Ọ huru elu-igwe ka ha nādọwa, Ọ hu-kwa-ra Mọ Nsọ dika nduru ka Ọ nēfedakwasi Ya: olu we si n'elu-igwe ahu da, si, Gi onwe-gi bu Ọkparam M'huru n'anya, ihe-Gi dim ezi nma. Ngwa ngwa Mọ Nsọ we chua Ya ba n'ọhia.
Kesaa
Gụọ MAK 1