MAK 1:32-37
MAK 1:32-37 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼoge uhuruchi, mgbe anwụ dara, ha kpọtaara ya ndị niile ahụ na-esighị ike na ndị mmụọ ọjọọ bi nʼime ha. Obodo ahụ niile gbakọrọ nʼọnụ ụzọ. Ọ gwọrọ ọtụtụ ndị bu ọrịa dị iche iche, ọ chụpụkwara ọtụtụ mmụọ ọjọọ ma o kweghị ka mmụọ ọjọọ ndị ahụ kwuo okwu nʼihi na ha matara onye ọ bụ. Nʼisi ụtụtụ, mgbe ọchịchịrị ka gbachiri, o biliri, ga ebe ọ ga-anọrọ onwe ya, naanị ya. Nʼebe ahụ kwa ka ọ nọ kpee ekpere. Saimọn na ndị ya na ha nọ pụrụ na-achọgharị ya. Ma mgbe ha hụrụ ya, ha sịrị ya, “Mmadụ niile na-achọgharị gị!”
MAK 1:32-37 Bible Nso (IGBOB)
Ma mb͕e o ruru anyasi, mb͕e anyanwu dara, ha nēkutara Ya ndi aru nādighi nma, na ndi mọ ọjọ ji Obodo ahu dum we zukọ n'ọnu-uzọ. O we me ka aru ọtutu madu di ike, bú ndi aru nādighi nma n'ọria di iche iche, Ọ chupu kwa ọtutu ndi-mọ ọjọ; O kweghi kwa ndi-mọ ọjọ kwue okwu, n'ihi na ha matara Ya. O we bilie n'isi-ututu, n'ezi abali, pua, je n'ebe bu ọhia, nọ nēkpe ekpere n'ebe ahu. Saimon na ndi ya na ha nọ we b͕aso Ya; ha we chọta Ya, si Ya, Madu nile nāchọ Gi.