MAK 1:30-41
MAK 1:30-41 Bible Nso (IGBOB)
Ma nne nwunye Saimon nēdina n'aru-ọku; ngwa ngwa ha we gwa Ya okwu bayere nwanyi ahu: O we jekuru ya, jide ya n'aka, palie ya; aru-ọku ahu we rapu ya, ọ nējere ha ozi. Ma mb͕e o ruru anyasi, mb͕e anyanwu dara, ha nēkutara Ya ndi aru nādighi nma, na ndi mọ ọjọ ji Obodo ahu dum we zukọ n'ọnu-uzọ. O we me ka aru ọtutu madu di ike, bú ndi aru nādighi nma n'ọria di iche iche, Ọ chupu kwa ọtutu ndi-mọ ọjọ; O kweghi kwa ndi-mọ ọjọ kwue okwu, n'ihi na ha matara Ya. O we bilie n'isi-ututu, n'ezi abali, pua, je n'ebe bu ọhia, nọ nēkpe ekpere n'ebe ahu. Saimon na ndi ya na ha nọ we b͕aso Ya; ha we chọta Ya, si Ya, Madu nile nāchọ Gi. O we si ha, Ka ayi ga ebe ọzọ n'obodo nile so nka, ka M'kwusa kwa n'ebe ahu; n'ihi na ọ bu ime nka ka M'putara. O we ba n'ulo-nzukọ nile ha gazue na Galili dum, nēkwusa ozi ọma nāchupu kwa ndi-mọ ọjọ. Onye-ekpenta we biakute Ya, nāriọ Ya, nēb͕u-kwa-ra Ya ikperè, nāsi kwa Ya, Ọ buru na I nāchọ, I puru ime ka m'di ocha. O we nwe ọmiko, setipu aka-Ya, metu ya, si ya, Anamachọ; ka eme ka i di ọcha.
MAK 1:30-41 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼoge a, nne nwunye Saimọn dina nʼakwa ndina. Ahụ ọkụ jikwa ya. Ha mere ka ọ mata banyere ya. Ọ gakwuru ya, jide ya nʼaka selite ya elu. Ahụ ọkụ ahụ hapụrụ ya. Ọ malitekwara ile ha ọbịa. Nʼoge uhuruchi, mgbe anwụ dara, ha kpọtaara ya ndị niile ahụ na-esighị ike na ndị mmụọ ọjọọ bi nʼime ha. Obodo ahụ niile gbakọrọ nʼọnụ ụzọ. Ọ gwọrọ ọtụtụ ndị bu ọrịa dị iche iche, ọ chụpụkwara ọtụtụ mmụọ ọjọọ ma o kweghị ka mmụọ ọjọọ ndị ahụ kwuo okwu nʼihi na ha matara onye ọ bụ. Nʼisi ụtụtụ, mgbe ọchịchịrị ka gbachiri, o biliri, ga ebe ọ ga-anọrọ onwe ya, naanị ya. Nʼebe ahụ kwa ka ọ nọ kpee ekpere. Saimọn na ndị ya na ha nọ pụrụ na-achọgharị ya. Ma mgbe ha hụrụ ya, ha sịrị ya, “Mmadụ niile na-achọgharị gị!” Ọ zaghachiri ha sị, “Ka anyị gaanụ ebe ọzọ, nʼobodo ndị ọzọ dị anyị gburugburu, ka m zisakwaara ha oziọma. Ọ bụ nʼihi nke a ka m ji bịa.” Ya mere, ọ pụrụ jegharịa na Galili niile na-ekwusa oziọma nʼụlọ ekpere ha niile, na-achụpụkwa mmụọ ọjọọ. Otu onye ekpenta bịakwutere ya gbuo ikpere nʼala rịọọ ya sị, “Ọ bụrụ na ị chọrọ, ị pụrụ ime ka m dị ọcha.” Ebe o jupụtara nʼọmịiko, Jisọs setịpụrụ aka ya metụ ya sị, “Achọrọ m, dị ọcha!”