MAIKA 5:2-4
MAIKA 5:2-4 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“Ma gị onwe gị, Betlehem Efrata, ọ bụ ezie na ị bụ obodo dị nta nʼetiti ndị ikwu Juda niile, ma onye ahụ ga-achị Izrel ga-esi na gị pụta, bụ onye ahụ mmalite ya sitere na mgbe ochie, sitekwa na mgbe ebighị ebi gara aga.” Ya mere, a ga-arara ha nye tutu ruo mgbe onye ahụ ime na-eme mụpụtara nwa ya. Mgbe ahụ, ụmụnna ya niile ahụ fọdụrụ ga-alọghachikwuru ndị Izrel. Ọ ga-eguzo zụọ igwe ewu na atụrụ ya, site nʼike nke ONYENWE ANYị, na site nʼịdị ukwuu nke aha ONYENWE ANYị Chineke ya. Ndị ya ga-anọkwa na-enweghị nsogbu, nʼihi na ịdị ukwuu ya ga-eru na nsọtụ niile nke ụwa.
MAIKA 5:2-4 Bible Nso (IGBOB)
Ma gi onwe-gi, Bet-lehem Efrata, nke di ntà idi n'etiti usu nile nke nnù abua na ọgu iri nke Juda, nime gi ka otù onye gēsi putaram ibu onye nāchi achi n'Israel; onye ọpupu-ya nile sitere na mb͕e ochie, site n'ubọchi nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga. N'ihi nka ka Ọ gārara ha nye, rue mb͕e nwanyi ime nēme gāmuwori nwa: umu-nne-ya ndi fọduru afọdu ewe laghachikute umu Israel. Ọ gēguzo kwa, zùa ìgwè aturu-ya n'ike nke Jehova, na nbili-elu nke aha Jehova, bú Chineke-ya: ha gēbiri kwa; n'ihi na ub͕u a ka ọ gādi uku rue nsọtu nile nke uwa.