MAIKA 5:1-6
MAIKA 5:1-6 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ugbu a doo ndị agha gị nʼusoro, gị obodo nke usuu ndị agha, nʼihi na e jirila mgbidi gbaa gị gburugburu ibuso gị agha. Ha ga-eji mkpara tie onyendu Izrel na nti. “Ma gị onwe gị, Betlehem Efrata, ọ bụ ezie na ị bụ obodo dị nta nʼetiti ndị ikwu Juda niile, ma onye ahụ ga-achị Izrel ga-esi na gị pụta, bụ onye ahụ mmalite ya sitere na mgbe ochie, sitekwa na mgbe ebighị ebi gara aga.” Ya mere, a ga-arara ha nye tutu ruo mgbe onye ahụ ime na-eme mụpụtara nwa ya. Mgbe ahụ, ụmụnna ya niile ahụ fọdụrụ ga-alọghachikwuru ndị Izrel. Ọ ga-eguzo zụọ igwe ewu na atụrụ ya, site nʼike nke ONYENWE ANYị, na site nʼịdị ukwuu nke aha ONYENWE ANYị Chineke ya. Ndị ya ga-anọkwa na-enweghị nsogbu, nʼihi na ịdị ukwuu ya ga-eru na nsọtụ niile nke ụwa. Ọ ga-abụkwa udo anyị. Mgbe ndị Asịrịa ga-abata nʼala anyị nʼike, sikwa nʼebe niile e wusiri ike nke anyị na-agafe, anyị ga-ahọpụta ndị ọzụzụ atụrụ asaa, ọ bụladị ndịisi asatọ. Onye ga-eji mma agha chịa ala Asịrịa, jirikwa mma agha a mịpụtara amịpụta chịa ala Nimrọd. Ọ ga-anapụta anyị site nʼaka ndị Asịrịa ahụ, mgbe ha ga-eji ike bata nʼala anyị, ma zọrọkwa ije gafee oke ala anyị.
MAIKA 5:1-6 Bible Nso (IGBOB)
Ub͕u a ka i gēdo onwe-gi n'usu ndi nāpunara madu ihe, gi ada nke usu ndi nāpunara madu ihe: nnọchigide-n'agha ka ọ nọchigideworo ayi: ha gēji nkpa-n'aka tie onye-ikpe Israel na ǹtì. Ma gi onwe-gi, Bet-lehem Efrata, nke di ntà idi n'etiti usu nile nke nnù abua na ọgu iri nke Juda, nime gi ka otù onye gēsi putaram ibu onye nāchi achi n'Israel; onye ọpupu-ya nile sitere na mb͕e ochie, site n'ubọchi nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga. N'ihi nka ka Ọ gārara ha nye, rue mb͕e nwanyi ime nēme gāmuwori nwa: umu-nne-ya ndi fọduru afọdu ewe laghachikute umu Israel. Ọ gēguzo kwa, zùa ìgwè aturu-ya n'ike nke Jehova, na nbili-elu nke aha Jehova, bú Chineke-ya: ha gēbiri kwa; n'ihi na ub͕u a ka ọ gādi uku rue nsọtu nile nke uwa. Onye a gābu kwa udo: mb͕e Asiria gābata n'ala-ayi, mb͕e ọ gāzọ kwa ukwu n'ulo-elu nile ayi, ayi gēme kwa ka ndi-ọzùzù-aturu asa na ndi-isi madu asatọ bilie imegide ya. Ha gēji kwa mma-agha b͕uchapu ala Asiria na ala Nimrod n'ọnu-uzọ-ya nile: ọ gānaputa kwa ayi n'aka Asiria, mb͕e ọ gābata n'ala-ayi, mb͕e ọ gāzọ kwa ukwu n'ókè-ala-ayi.