MATIU 9:20-22
MATIU 9:20-22 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ma o nwere otu nwanyị onye ahụ na-esighị ike. Nwanyị a anọọla nʼọrịa a afọ iri na abụọ. Ọ bụkwa ọrịa oruru ọbara nke na-adịghị akwụsị akwụsị ka ọ na-arịa. Nwanyị a sitere nʼazụ bịaruo ya nso, metụ ọnụ uwe ya aka. Nʼihi na o kwuolarị nʼime obi ya sị, “Ọ bụrụ nnọọ na m ga-enwe ike metụ ọnụ uwe ya aka, a ga-agwọ m.” Jisọs chigharịrị lee ya anya sị ya, “Ada m, nwee obi ike, nʼihi na e sitela nʼokwukwe gị mee ka ahụ dị gị mma.” Ahụ dịkwara nwanyị ahụ mma site nʼoge ahụ.
MATIU 9:20-22 Bible Nso (IGBOB)
Ma le, otù nwanyi, nke nwere orùrù-ọbara arọ iri na abua, biara n'azu Ya, we metu ọnu-ọnu uwe-Ya aka: n'ihi na ọ nāsi n'onwe-ya, Ọ buru na emetum nání uwe-Ya aka, agāzọputam. Ma Jisus chighariri, we hu ya, si, Nwam nwanyi, nwe obi-ike; okwukwe-gi azọputawo gi. Ewe site n'oge hour ahu zọputa nwanyi ahu.