MATIU 8:18-22
MATIU 8:18-22 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe Jisọs hụrụ igwe mmadụ dị ukwuu ndị gbara ya gburugburu, ọ nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha gafee nʼofe nke ọzọ. Nʼoge ahụ, otu onye nʼetiti ndị na-ezi iwu bịakwutere ya sị ya, “Onye nkuzi, aga m eso gị gaa ebe ọbụla ị na-aga.” Jisọs zara, sị, “Nkịta ọhịa nwere ọnụ ebe ha na-edina. Ụmụ nnụnụ nke igwe nwekwara akwụ; ma Nwa nke Mmadụ enweghị ebe obibi.” Otu onye ọzọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya, “Onyenwe m, aga m eso gị, kama kwere ka m buru ụzọ gaa lie nna m.” Ma Jisọs zara sị ya, “Soro m ugbu a. Hapụ ndị nwụrụ anwụ ka ha lie ndị nwụrụ anwụ ibe ha.”
MATIU 8:18-22 Bible Nso (IGBOB)
Ma mb͕e Jisus huru na ọtutu ìgwè madu di Ya buruburu, O kwuru ka ha gabiga n'ofè ọzọ. Otù ode-akwukwọ we biakute Ya, si Ya, Onye-ozizí, m'gēso Gi ebe ọ bula I nēje. Jisus we si ya, Nkita-ọhia nwere ọnu ha nēdina, anu-ufe nke elu-igwe nwe-kwa-ra ebe ha nāraru ura; ma Nwa nke madu enweghi ebe itọb͕ọ isi-Ya. Onye ọzọ n'etiti ndi nēso uzọ-Ya we si Ya, Onye-nwe-ayi, kwe ka m'buru uzọ je lìe nnam. Ma Jisus si ya, Som; rapu kwa ndi nwuru anwu ka ha lìe ndi nke ha ndi nwuru anwu.