Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

MATIU 8:1-22

MATIU 8:1-22 Bible Nso (IGBOB)

Ma ka O siri n'ugwu ahu ridata, oké ìgwè madu soro Ya. Ma le, onye-ekpenta biakutere Ya. nākpọ isi ala nye Ya, si, Onye-nwe-ayi, ọ buru na I nāchọ, I puru ime ka m'di ọcha. O we setipu aka-Ya, metu ya, si, Anamachọ; ka eme ka i di ọcha. Ngwa ngwa ewe me ka ọ di ọcha n'ekpenta-ya. Jisus we si ya, Lezi anya ka i ghara igwa onye ọ bula okwu; ma laba, were onwe-gi gosi onye-nchu-àjà, che kwa n'iru Chineke onyinye ahu Moses nyere n'iwu, ka ọ buru ha àmà. Mb͕e Ọ batara na Kapanaum, otù ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise biakutere Ya, nāriọ Ya, si, Onye-nwe-ayi, onye nējerem ozi tọb͕ọrọ n'ulom, akuku-aru-ya nwuru anwu, anēmekpa ya aru gabiga ókè. O we si ya, Mu onwem gābia me ka aru di ya ike. Ma ọchi-agha ahu nāchi ọgu ndi-agha ise zara, si, Onye-nwe-ayi, erughm ka I ba n'okpuru ulom: kama were nání okwu-ọnu kwue, agēme kwa ka aru onye nējerem ozi di ike. N'ihi na mu onwem bu kwa onye nọ n'okpuru ike, nēnwe ndi-agha n'okpuru mu onwem: m'we si onye a, Ga, ọ ga; m'si kwa onye ọzọ, Bia, ọ bia; m'si kwa orùm, Me nka, o me ya. Ma mb͕e Jisus nuru nka, o juru Ya anya, Ọ, we si ndi n'eso ya n'azu, N'ezie asim unu, Ọ dighi mb͕e M'huru oké okwukwe di otú a n'aru onye ọ bula n'Israel. Ma asim unu, na ọtutu madu gēsi n'Ọwuwa-anyanwu na Ọdida-anyanwu bia, so kwa Abraham, na Aisak, na Jekob, nānọdu n'ala-eze elu-igwe: ma agāchupu umu ala-eze ahu bà n'ọchichiri nke èzí: n'ebe ahu ka ikwa-ákwá na ita-ikekere-ezé ahu gādi. Jisus we si ọchi-agha ahu nāchi ọgu ndi-agha ise, Laba; dika i kwere, ka emere gi. Ewe me ka aru onye nējere ya ozi di ike n'oge hour ahu. Mb͕e Jisus batasiri n'ulo Pita, O we hu nne nwunye-ya ka ọ tọb͕ọrọ n'aru-ọku. O we metu aka-ya, aru-ọku ahu we rapu ya; o we bilie, nēje-kwa-ra Ya ozi. Ma mb͕e o ruru anyasi, ha kutara Ya ọtutu madu ndi mọ ọjọ ji: O we were okwu-ọnu chupu ndi-mọ ahu, me kwa ndi nile aru nādighi nma ka aru-ha di ike: ka okwu ekwuru site n'ọnu Aisaia onye-amuma we mezu, si, Ya onwe-ya nara nriaria nile ayi, būru kwa ọria nile ayi. Ma mb͕e Jisus huru na ọtutu ìgwè madu di Ya buruburu, O kwuru ka ha gabiga n'ofè ọzọ. Otù ode-akwukwọ we biakute Ya, si Ya, Onye-ozizí, m'gēso Gi ebe ọ bula I nēje. Jisus we si ya, Nkita-ọhia nwere ọnu ha nēdina, anu-ufe nke elu-igwe nwe-kwa-ra ebe ha nāraru ura; ma Nwa nke madu enweghi ebe itọb͕ọ isi-Ya. Onye ọzọ n'etiti ndi nēso uzọ-Ya we si Ya, Onye-nwe-ayi, kwe ka m'buru uzọ je lìe nnam. Ma Jisus si ya, Som; rapu kwa ndi nwuru anwu ka ha lìe ndi nke ha ndi nwuru anwu.

MATIU 8:1-22 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Ọtụtụ mmadụ sooro Jisọs mgbe o si nʼugwu ahụ rịdata. Mgbe ha na-aga nʼụzọ, otu onye ekpenta bịakwutere ya kpọọ isiala nye ya, rịọ ya sị, “Onyenwe m, ọ bụrụ na ị chọrọ, ị pụrụ ime ka m dị ọcha.” O setịpụrụ aka ya, metụ ya sị, “Achọrọ m ka ị dị ọcha, dịrịkwa ọcha!” Ngwangwa, ekpenta ahụ lara. Jisọs nyere nwoke ahụ iwu sị ya, “Hụ na ịgwaghị onye ọbụla, kama gaa gosi onye nchụaja onwe gị, chụọkwa aja onyinye dịka Mosis, nyere nʼiwu, ka ọ bụrụ ihe ama nye ya.” Mgbe ọ banyere na Kapanọm, otu onye ọchịagha bịakwutere ya rịọọ ka o nyere ya aka. Ọ sịrị, “Onyenwe m, onye na-ejere m ozi dina nʼụlọ nʼoke ihe mgbu, akụkụ ahụ ya kpọnwụkwara akpọnwụ.” Jisọs sịrị ya, “Ọ bụ m bịa gwọọ ya?” Ma onye ọchịagha ahụ zara ya sị, “Onyenwe m, ekwesighị m ka ị bata nʼokpuru ụlọ m. Naanị nọdụ nʼebe a, kwuo okwu, ahụ ga-adịkwa onye na-ejere m ozi ike. Nʼihi na mụ onwe m bụkwa onye nọ nʼokpuru ikike ọchịchị, nwee ndị agha nọ nʼokpuru m. Ana m asị onye nke a, ‘gaa.’ Ọ gaa, sịkwa onye nke ọzọ, ‘bịa.’ Ọ bịa. Ana m asị ohu m, ‘mee nke a.’ Ọ na-emekwa ya.” Mgbe Jisọs nụrụ okwu a, o juru ya anya nke ukwuu. Ọ gwara igwe mmadụ ahụ so ya okwu sị, “Nʼezie, ahụbeghị m okwukwe dị otu a ebe ọbụla; ọ bụladị nʼIzrel niile. Nʼezie kwa, ọtụtụ ndị mmadụ ga-esite nʼọwụwa anyanwụ nakwa ọdịda anyanwụ bịa soro Ebraham na Aịzik na Jekọb nọkọọ nʼoriri nʼalaeze eluigwe. Ma ụmụ alaeze ahụ, ka a ga-atụpụ nʼezi, nʼime ọchịchịrị, ebe ịkwa akwa na ịta ikikere eze ga-adị.” Jisọs gwara ọchịagha ahụ okwu sị ya, “Laa! E meerela gị dị ka okwukwe gị sịrị dị.” Ahụ dịrị onye ahụ na-ejere ya ozi mma nʼotu awa ahụ. Mgbe Jisọs ruru nʼụlọ Pita, ọ chọpụtara na nne nwunye ya nwere ahụ ọkụ. Ọ metụrụ ya aka, ahụ ọkụ ahụ hapụrụ ya, o biliri malite ijere ya ozi. Nʼoge uhuruchi, ha kpọtaara ya ọtụtụ ndị mmụọ ọjọọ na-esogbu. O ji okwu ọnụ chụpụ mmụọ ọjọọ ahụ niile, gwọọkwa ndị niile ahụ na-adịghị ike. Nke a bụ imezu amụma ahụ Aịzaya buru sị, “O bupụrụ nrịa nrịa anyị niile, burukwa ọrịa anyị niile.” Mgbe Jisọs hụrụ igwe mmadụ dị ukwuu ndị gbara ya gburugburu, ọ nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha gafee nʼofe nke ọzọ. Nʼoge ahụ, otu onye nʼetiti ndị na-ezi iwu bịakwutere ya sị ya, “Onye nkuzi, aga m eso gị gaa ebe ọbụla ị na-aga.” Jisọs zara, sị, “Nkịta ọhịa nwere ọnụ ebe ha na-edina. Ụmụ nnụnụ nke igwe nwekwara akwụ; ma Nwa nke Mmadụ enweghị ebe obibi.” Otu onye ọzọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya, “Onyenwe m, aga m eso gị, kama kwere ka m buru ụzọ gaa lie nna m.” Ma Jisọs zara sị ya, “Soro m ugbu a. Hapụ ndị nwụrụ anwụ ka ha lie ndị nwụrụ anwụ ibe ha.”