MATIU 7:7-9
MATIU 7:7-9 Bible Nso (IGBOB)
Riọnu, agēnye kwa unu; chọnu, unu gāchọta kwa; kuanu, agēmeghe-kwa-ra unu: n'ihi na onye ọ bula nke nāriọ nāriọta; onye nāchọ kwa nāchọta; onye nāku kwa ka agēmeghere. Ma -ọbu òle madu di n'etiti unu, onye, ma ọ buru na nwa-ya gāriọ ya ob͕e achicha, gēnye ya nkume
Kesaa
Gụọ MATIU 7MATIU 7:7-9 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“Na-arịọnụ, unu ga-arịọta, na-achọnụ, unu ga-achọta, kụọkwanụ aka nʼụzọ, a ga-emeghekwara unu ụzọ. Nʼihi na onye na-arịọ, na-arịọta. Onye na-achọ, na-achọta. Onye na-akụ aka nʼụzọ ka a ga-emeghekwara ụzọ. “Ọ dị onye nʼime unu, ma ọ bụrụ na nwa ya arịọọ ya achịcha, ga-enye ya okwute?
Kesaa
Gụọ MATIU 7