MATIU 7:7-11
MATIU 7:7-11 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“Na-arịọnụ, unu ga-arịọta, na-achọnụ, unu ga-achọta, kụọkwanụ aka nʼụzọ, a ga-emeghekwara unu ụzọ. Nʼihi na onye na-arịọ, na-arịọta. Onye na-achọ, na-achọta. Onye na-akụ aka nʼụzọ ka a ga-emeghekwara ụzọ. “Ọ dị onye nʼime unu, ma ọ bụrụ na nwa ya arịọọ ya achịcha, ga-enye ya okwute? Maọbụ, nwata ahụ arịọọ azụ, o nye ya agwọ? Ya mere, ebe unu ndị ọjọọ maara otu e si enye ụmụ unu ezi onyinye, Nna unu bi nʼeluigwe ọ gaghị enye unu karịa, ma ọ bụrụ na unu arịọọ ya!
MATIU 7:7-11 Bible Nso (IGBOB)
Riọnu, agēnye kwa unu; chọnu, unu gāchọta kwa; kuanu, agēmeghe-kwa-ra unu: n'ihi na onye ọ bula nke nāriọ nāriọta; onye nāchọ kwa nāchọta; onye nāku kwa ka agēmeghere. Ma -ọbu òle madu di n'etiti unu, onye, ma ọ buru na nwa-ya gāriọ ya ob͕e achicha, gēnye ya nkume; ma-ọbu asi na ọ gāriọ azù, gēnye ya agwọ? Ya mere, ọ buru na unu onwe unu, ọ bu ezie na unu jọrọ njọ, ma unu nāmata inye umu-unu ezi onyinye, Nnà-unu Nke bi n'elu-igwe gēsi aṅa ghara iwere kari ezi ihe nke-uku nye ndi nāriọ Ya?