MATIU 7:21-27
MATIU 7:21-27 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“Ọ bụghị ndị niile na-asị m ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị,’ ga-abanye nʼalaeze eluigwe, kama ọ bụ naanị ndị ahụ na-eme ihe Nna m nọ nʼeluigwe na-achọ ka ha mee. Nʼụbọchị ahụ, ọtụtụ ndị mmadụ ga-asị m, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, ọ bụ na anyị ejighị aha gị buo amụma, jiri aha gị chụpụ mmụọ ọjọọ, ma jirikwa aha gị ruo ọtụtụ ọrụ ebube?’ Mgbe ahụ aga m agwa ha hoohaa sị ha, ‘Amaghị m unu, sitenụ nʼihu m pụọ, unu ndị ajọ omume!’ “Onye ọbụla ṅara ntị nʼokwu ndị a m kwuru, ma meekwa ha, dị ka nwoke ahụ maara ihe, onye wuru ụlọ ya nʼelu oke nkume. Mmiri zosikwara ike nʼelu ụlọ ahụ, idee mmiri sọkwara, tie nʼụlọ ahụ. Ifufe siri ike fekwara, ma ụlọ ahụ adaghị. Nʼihi na e wuru ntọala ya nʼelu oke nkume. Ma ndị niile nụrụ okwu ndị a, ma lefuru ha anya, bụ ndị nzuzu. Ha dị ka nwoke wuru ụlọ ya nʼelu aja. Ngwangwa mmiri zoro, idee mmiri sọkwara, ifufe fesikwara ike tie nʼụlọ ahụ, ụlọ ahụ dara daruo ala. Ọdịda ya dị ukwuu.”
MATIU 7:21-27 Bible Nso (IGBOB)
Ọ bughi onye ọ bula nke nāsim, Onye-nwe-ayi, Onye-nwe-ayi, gābà n'ala eze elu-igwe; kama ọ bu onye nēme ihe Nnam Nke bi n'elu-igwe nāchọ. Ọtutu madu gāsim n'ubọchi ahu, Onye-nwe-ayi, Onye-nwe-ayi, àyi jiri aha-Gi bu amuma, àyi jiri kwa aha-Gi chupu ndi-mọ ọjọ, àyi jiri kwa aha-Gi lu ọtutu ọlu di ike? Ma mb͕e ahu ka M'gēkwuputara ha, si, Ọ dighi mb͕e ọ bula M'mara unu: si n'ebe M'nọ pua, unu ndi nālu ọlu nēmebi iwu. Ya mere onye ọ bula nke nānu okwum ndia, nēme kwa ha, agēji ya tuyere nwoke nwere uche, onye wuru ulo-ya n'elu oké nkume: miri we zo, osimiri ru kwa, ifufe fe kwa, we makwasi ulo ahu; ma ọ dagh: n'ihi na atọrọ ntọ-ala-ya n'elu oké nkume ahu. Ma onye ọ bula nke nānu okwum ndia, ma ọ dighi-eme ha, agēji ya tuyere nwoke nke bu onye-nzuzu, onye wuru ulo-ya n'elu ájá: miri we zo, osimiri ru kwa, ifufe fe kwa, we tikwasi ulo ahu; o we da: ọdida-ya di kwa uku.