MATIU 7:1-6
MATIU 7:1-6 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“Unu ekpela ndị ọzọ ikpe, ka a ghara ikpekwa unu ikpe. Nʼihi na a ga-ekpe unu ikpe dịka unu si kpee ndị ọzọ. Ọ bụkwa ihe unu ji tụọrọ ndị ọzọ ka a ga-eji tụọrọ unu. “Gịnị mere i ji elee ntakịrị ahịhịa dị nwanna gị nʼanya ma ị dịghị ahụta obodobo osisi dị gị onwe gị nʼanya? Olee otu ị ga-esi gwa ya si, ‘Nwanna m, kwere ka m tụpụ gị ntakịrị ahịhịa danyere gị nʼanya,’ mgbe obodobo osisi dị gị nʼanya, nke na-adịghị ekwe gị hụzie ụzọ. Onye ihu abụọ! Buru ụzọ wepụ obodobo osisi dị gị nʼanya ka i nwee ike ịhụzi ụzọ tụpụ ntakịrị ahịhịa nke dị nwanna gị nʼanya. “Enyela nkịta ihe dị nsọ. Enyekwala ezi ihe dị oke ọnụahịa. Ha ga-azọtọ ha ma tụgharịakwa dọrie gị.
MATIU 7:1-6 Bible Nso (IGBOB)
Unu ekpela ikpé, ka aghara ikpe unu ikpé. N'ihi na ikpé unu ji kpe ka agēji kpe unu: ọ bu kwa ihe unu ji tù ihe ka agēji tùru unu. Ma gini mere i ji le irighiri ahihia nke di n'anya nwa-nna-gi, ma i tugharighi uche na ntuhie nke di n'anya nke gi? Ma-ọbu ì gēsi aṅa si nwa-nna-gi, Kwe ka m'tupu irighiri ahihia ahu n'anya-gi: ma le, ntuhie ahu di n'anya nke gi? Onye-iru-abua, buru uzọ tupu ntuhie ahu n'anya nke gi; mb͕e ahu ka i gēlegide anya itupu irighiri ahihia ahu n'anya nwa-nna-gi. Unu enyela nkita ihe di nsọ, unu atuda-kwa-la pearl-unu n'iru ezì, ka ha ghara izọkwasi ha n'ukwu-ha ma eleghi anya, we chigharia, dọka unu.