MATIU 6:5-8
MATIU 6:5-8 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“Mgbe ọbụla unu chọrọ ikpe ekpere, unu emela dị ka ndị ihu abụọ, nʼihi na ha hụrụ iguzo nʼime ụlọ ekpere, nakwa nʼakụkụ ụzọ nʼanya na-ekpe ekpere, ebe ndị mmadụ ga-ahụ ha. Nʼezie, agwa m unu, ha anatala ụgwọ ọrụ ha nʼebe o zuruoke. Kama, mgbe unu chọrọ ikpe ekpere, baanụ nʼime ime ụlọ unu. Mechiekwanụ ụzọ unu, kpọkuonụ Nna unu nʼekpere na nzuzo. Mgbe ahụ Nna unu, onye na-ahụ ihe e mere na nzuzo, ga-enye unu ụgwọ ọrụ unu. Mgbe unu na-ekpe ekpere, unu ekwula okwu nkwukwasị efu dị ka ndị na-amaghị Chineke na-eme. Ha chere na a ga-anụ ekpere ha nʼihi ọtụtụ okwu ha na-ekwu. Unu adịla ka ha. Chetanụ na tupu unu arịọ arịrịọ ọbụla, Nna unu bi nʼeluigwe maara ihe na-akpa unu.
MATIU 6:5-8 Bible Nso (IGBOB)
Mb͕e ọ bula unu nēkpe kwa ekpere, unu agaghi-adi ka ndi-iru-abua ahu: n'ihi na ọ nātọ ha utọ iguzo n'ulo-nzukọ-unu na nkuku amá-unu ikpe ekpere, ka ha we were onwe-ha gosi madu. N'ezie asim unu, Ha nēnwezu ugwọ-ọlu-ha. Ma gi onwe-gi, mb͕e ọ bula i nēkpe ekpere, bà n'ime-ulo ntà gi, mb͕e i mechisi-kwa-ra uzọ-gi, kpere Nna-gi Nke di na nzuzo, Nna-gi Nke nāhu ihe na nzuzo gēnyeghachi kwa gi. Ma mb͕e unu nēkpe ekpere, unu ekwula okwu-nkwukwasi efù, dika ndi mba ọzọ nēme: n'ihi na ha nēchè na agānu olu-ha n'ọtutu okwu ha nēkwu. Ya mere, unu eyila ha: n'ihi na Nna-unu matara ihe nile di unu nkpà, mb͕e unu akāriọghi Ya.