MATIU 6:31-34
MATIU 6:31-34 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼihi nke a, unu echegbukwala onwe unu na-asị, ‘Gịnị ka anyị ga-eri?’ maọbụ, ‘Gịnị ka anyị ga-aṅụ?’ maọbụ, ‘Gịnịkwa ka anyị ga-eyi?’ Ọ bụ ihe ndị a ka ndị na-amaghị Chineke na-achọsi ike. Ma Nna unu bi nʼeluigwe maara na ọ dị unu mkpa. Ma burunu ụzọ chọọ alaeze ya na ezi omume ya, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị a niile. Ya mere, unu echegbula onwe unu banyere echi, nʼihi na echi ga-echere onwe ya. Nsogbu nke ụbọchị taa ezuorola ụbọchị taa.
MATIU 6:31-34 Bible Nso (IGBOB)
Ya mere, unu echeb͕ula onwe-unu, si, Gini ka ayi gēri? ma-ọbu, Gini ka ayi gāṅu? ma-ọbu, Gini ka agēji b͕okwasi ayi? N'ihi na ihe ndia nile ka ndi mba ọzọ nāchọ; n'ihi na Nna-unu nke elu-igwe nāmata na ihe ndia nile di unu nkpà. Ma burunu uzọ chọ ala-eze-Ya, na ezi omume-Ya; agātukwasi-kwa-ra unu ihe ndia nile. Ya mere, unu echeb͕ula onwe-unu nye echi: n'ihi na echi gēcheb͕uru onwe-ya. Ihe ọjọ nke ubọchi ta ezuworo ya.