MATIU 5:44-47
MATIU 5:44-47 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ma asị m unu, hụnụ ndị iro unu nʼanya, kpekwaaranụ ndị na-esogbu unu ekpere. Nke a ga-eme ka unu bụrụ ụmụ nke Nna unu bi nʼeluigwe, onye na-eme ka anwụ mụọrọ ndị ọma na ndị ọjọọ, na-emekwa ka mmiri zooro ndị ezi omume na ndị ajọ omume. Ọ bụrụ naanị ndị hụrụ unu nʼanya ka unu na-ahụ nʼanya, gịnị ga-abụ ụgwọ ọrụ unu? Ọ bụladị ndị ọna ụtụ na-emekwa otu a. Ọ bụrụkwa na unu na-ekele naanị ndị enyi unu ekele, ọ dịghị ihe ọbụla dị iche nʼebe unu na ndị ọzọ nọ. Nʼihi na ndị na-amaghị Chineke na-emekwa otu ahụ.
MATIU 5:44-47 Bible Nso (IGBOB)
ma Mu onwem si unu, Nāhunu ndi-iro-unu n'anya, nēkpe kwa ekpere nye ndi nēsob͕u unu; ka unu we buru umu nke Nna-unu Nke bi n'elu-igwe: n'ihi na Ọ nēme ka anyanwu-Ya nāwakwasi ajọ madu na ezi madu, Ọ nēme kwa ka miri zokwasi ndi ezi omume na ndi ajọ omume. N'ihi na ùnu nwere ugwọ-ọlu gini, ma ọ buru na unu huru ndi ahu n'anya, bú ndi nāhu unu n'anya? ọbuná ndi-ọna-utu, hà adighi-eme otù ihe ahu? Ọ buru kwa na unu nēkele nání umu-nne-unu, gini ka unu nēme kari ndi ọzọ? ọbuná ndi mba ọzọ, hà adighi-eme otù ihe ahu?