MATIU 5:17-48
MATIU 5:17-48 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“Unu echela na m bịara ịkagbu iwu Mosis, maọbụ ozizi ndị amụma. Abịaghị m ịkagbu akagbu, kama abịara m imezu ha. Nʼezie, agwa m unu, na tutu eluigwe na ụwa agabiga, ọ dịghị otu mkpụrụ edemede ọbụla dị nta, ọ bụladị nke dịkarịsịrị nta, nke a ga-esi nʼIwu a wepụ ruo mgbe ha niile ga emezu. Nʼihi ya, onye ọbụla nke ga-emebi otu nʼime iwu ndị a, ọ bụladị nke dịkarịsịrị nta, ma kuziekwara ndị ọzọ ime otu ahụ, a ga-agụ onye ahụ nʼonye dịkarịsịrị nta nʼalaeze eluigwe. Ma onye na-ezi ụmụ mmadụ ka ha debe iwu ahụ, ma na-emekwa okwu ndị ahụ nʼonwe ya, a ga-akpọ ya onye dị ukwuu nʼalaeze eluigwe. Ka m dọọ unu aka na ntị. Ọ bụrụ na ezi omume unu akarịghị ezi omume ndị Farisii na ndị ozizi iwu, unu apụghị ịba nʼalaeze eluigwe ma ọlị. “Unu nụrụ na-agwara ndị mmadụ nʼoge gara aga, sị, ‘Onye egbula mmadụ, onye ọbụla gburu mmadụ a ga-ekpe ya ikpe.’ Ma asị m unu, na onye ọbụla nke na-ewe iwe megide nwanna ya, na-enyefe onwe ya nʼaka ikpe. Onye ọbụla nke na-akpọ nwanna ya ‘ Raka ,’ ya bụ Onye iberiibe, ga-aza ajụjụ nʼụlọikpe. Ọzọkwa, onye ọbụla nke kpọrọ nwanne ya, ‘Onye nzuzu,’ na-edo onwe ya ịba nʼọkụ ala mmụọ. “Ya mere, ọ bụrụ na ị gaa inye onyinye gị nʼebe ịchụ aja, ma cheta nʼebe ahụ na gị na nwanne gị adịghị nʼudo, hapụ onyinye gị nʼebe ịchụ aja, laa ka gị na nwanne gị kpezie. Mgbe unu mere udo, laghachi bịa nye onyinye gị. “Mee ọsịịsọ ka gị na onye kpọ gị eje ụlọ ikpe kpezie, mgbe ọ na-eburubeghị ikpe gị na ya jee nʼaka ọkaikpe, onye ga-enyefe gị nʼaka ndị nche, ma eleghị anya etinye gị nʼụlọ mkpọrọ. Nʼezie, agwa m gị, ị gaghị e si nʼebe ahụ pụta ruo mgbe ị kwụghachiri kobo niile i ji. “Unu nụrụ na e kwuru sị, ‘Akwala iko.’ Ma asị m unu, onye ọbụla lere nwanyị anya site na-agụụ ịkwa iko emeelarị mmehie ịkwa iko nʼime obi ya megide nwanyị ahụ. Nʼihi nke a, ọ bụrụ na anya aka nri gị na-eme ka i jehie, ghụpụ ya tufuo. Ọ kaara gị mma na i tufuru otu akụkụ ahụ gị baa nʼalaeze karịa na i ji ahụ zuruoke baa nʼọkụ ala mmụọ. Ọ bụrụ na aka nri gị na-eme ka i jehie, gbupụ ya tufuo. Ọ kaara gị mma na i tufuru otu akụkụ ahụ gị ma baa nʼalaeze eluigwe, karịa na i ji ahụ zuruoke ma baa nʼọkụ ala mmụọ. “E kwukwara sị, ‘Onye ọbụla chọrọ ịgbara nwunye ya alụkwaghị m, ga-ebu ụzọ dee akwụkwọ alụkwaghị m nye nwunye ya.’ Ma asị m unu, onye ọbụla gbara nwunye ya alụkwaghị m, ma ọ bụghị nʼihi ịkwa iko, ọ na-etinye nwanyị ahụ nʼọnọdụ ga-eme ka ọ kwaa iko. Ọ bụrụ na nwanyị ahụ alụọ di ọzọ, nwoke ahụ lụrụ nwanyị ahụ na-emekwa mmehie ịkwa iko. “Ọzọkwa, unu nụrụ na a gwara ndị mmadụ nʼoge gara aga sị, ‘Aṅụla iyi ụgha, kama mezuo ihe niile unu ṅụrụ nʼiyi nye Onyenwe anyị.’ Ma asị m unu aṅụla iyi ọbụla. Ejikwala eluigwe aṅụ iyi nʼihi na eluigwe bụ ebe ocheeze Chineke dị. Ejikwala ụwa aṅụ iyi nʼihi na ụwa bụ ebe mgbakwasị ụkwụ ya. Ejikwala Jerusalem aṅụ iyi nʼihi na ọ bụ obodo Eze ukwu ahụ. Ejikwala isi gị aṅụ iyi nʼihi na ị pụghị ime ka otu agịrị isi gị dị ọcha maọbụ dị oji. Aṅụla iyi ọbụla. Kama ka okwu unu bụrụ ‘E’ maọbụ ‘Ee’; ihe ọbụla gafere nke a sitere nʼaka ajọ onye ahụ. “Unu anụla na e kwuru sị, ‘Ọ bụ anya ka a kụkpọrọ, anya nʼọnọdụ anya. Ọ bụrụkwa otu eze ka e tipụrụ, eze nʼọnọdụ eze.’ Ma ana m asị unu eguzogidela onye bụ ajọ onye. Kama ọ bụrụ na mmadụ amaa gị ụra na ntị aka nri, tụgharịara ya ntị nke ọzọ. Ọ bụrụ na mmadụ agbaa gị akwụkwọ nʼụlọikpe, ka ọ nara gị uwe ime gị, nyekwa ya uwe nke elu gị. Ọ bụrụ na mmadụ esite nʼike chọọ ka i soro ya gaa puku nzọ ụkwụ atọ, soro ya gaa puku nzọ ụkwụ isii. Nye onye ọbụla rịọrọ gị ihe. Achụghachikwala ndị na-abịa ka i binye ha ego. “Unu nụrụ na e kwuru sị, ‘Hụnụ ndị agbataobi unu nʼanya, ma kpọkwanụ ndị iro unu asị.’ Ma asị m unu, hụnụ ndị iro unu nʼanya, kpekwaaranụ ndị na-esogbu unu ekpere. Nke a ga-eme ka unu bụrụ ụmụ nke Nna unu bi nʼeluigwe, onye na-eme ka anwụ mụọrọ ndị ọma na ndị ọjọọ, na-emekwa ka mmiri zooro ndị ezi omume na ndị ajọ omume. Ọ bụrụ naanị ndị hụrụ unu nʼanya ka unu na-ahụ nʼanya, gịnị ga-abụ ụgwọ ọrụ unu? Ọ bụladị ndị ọna ụtụ na-emekwa otu a. Ọ bụrụkwa na unu na-ekele naanị ndị enyi unu ekele, ọ dịghị ihe ọbụla dị iche nʼebe unu na ndị ọzọ nọ. Nʼihi na ndị na-amaghị Chineke na-emekwa otu ahụ. Ya mere, unu kwesiri izuoke nʼịrụ ọrụ ọma, dịka Nna unu bi nʼeluigwe si zukwaa oke.
MATIU 5:17-48 Bible Nso (IGBOB)
Unu echèla na abiaram imebi iwu Chineke ma-ọbu ndi-amuma-Ya: abiaghm imebi, kama imezu ya. N'ihi na n'ezie asim unu, Rue mb͕e elu-igwe na ala gāgabiga, ọ dighi otù ihe ọ bula dikarisiri ntà gāgabiga n'iwu ma-ọli, rue mb͕e ihe nile gēme. Ya mere onye ọ bula nke gēmebi otù nime ihe ndia dikarisiri ntà nke enyere n'iwu, nke gēzí kwa madu otú ahu, agākpọ ya onye dikarisiri ntà n'ala-eze elu-igwe: ma onye ọ bula nke gēme ha, zí kwa ha, onye ahu ka agākpọ onye uku n'ala-eze elu-igwe. N'ihi na asim unu, na ọ buru na ezi omume-unu adighi-akari ezi omume ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi nke-uku, unu agaghi-abà n'ala-eze elu-igwe ma-ọli. Unu nuru na agwara ndi-ochie, si, Eb͕ula madu; ma onye ọ bula nke b͕uru madu gēnye onwe-ya n'aka ikpé: ma Mu onwem si unu, na onye ọ bula nke nēwe iwe megide nwa-nne-ya gēnye onwe-ya n'aka ikpé; onye ọ bula nke gāsi kwa nwa-nne-ya, Raka, gēnye onwe-ya n'aka nnọkọ-ikpé; onye ọ bula nke gāsi kwa, Onye-nzuzù, gēnye onwe-ya n'aka ọku ala-mọ. Ya mere ọ buru na i nēche onyinye-gi n'iru Chineke n'ebe-ichu-àjà, i we cheta n'ebe ahu na nwa-nne-gi nwere ihe megide gi, rapu onyinye-gi n'ebe ahu n'iru ebe-ichu-àjà, laba, buru uzọ me ka gi na nwa-nne-gi di n'udo, mb͕e ahu bia kwa che onyinye-gi. Me ka gi na onye nēkuru gi ga ikpé me eyì ọsọsọ, mb͕e gi na ya nọ n'uzọ; ka onye ahu nēkuru gi ga ikpe we ghara irara gi nye n'aka onye-ikpe ma eleghi anya, onye ikpe arara kwa gi nye n'aka onye nēje ozi, ewe tubà gi n'ulo-nkpọrọ. N'ezie asim i, I gaghi-aputa n'ebe ahu ma-ọli, rue mb͕e i gākwughachi farthing ikpe-azu. Unu nuru na ekwuru, si, Akwala iko: ma Mu onwem si unu, na nwoke ọ bula nke nēle nwanyi anya ka agu ya we gua ya, ọ kwasiwo ya iko n'obi-ya ub͕u a. Ma ọ buru na anya aka-nri gi eme gi ka i ma n'ọnyà, ghupu ya, tupu kwa ya n'aru-gi: n'ihi na ọ bara gi urù ka otù nime ihe di gi n'aru la n'iyì, ka aghara kwa itubà aru-gi dum n'ọku ala-mọ. Ma ọ buru na aka-nri-gi eme gi ka i ma n'ọnya, bipu ya, tupu kwa ya n'aru-gi: n'ihi na ọ bara gi urù ka otù nime ihe di gi n'aru la n'iyì, ka aru-gi dum ghara kwa ije n'ọku ala-mọ. Ekwu-kwa-ra, si, Nwoke ọ bula nke gārapu nwunye-ya, ya nye ya akwukwọ nkewa: ma Mu onwem si unu, na nwoke ọ bula nke nārapu nwunye-ya, ma-ọbughi n'ihi ikwa-iko, ọ nēme nwanyi ahu ka ọ nọ n'ọnọdu onye akwara iko megide: onye ọ bula nke gālu kwa ya mb͕e arapusiri ya, ọ nākwa iko. Ọzọ kwa, unu nuru na agwara ndi-ochie, si, Aṅula iyí ugha, kama nyeghachi Onye-nwe-ayi ihe nile i ṅuru n'iyí: ma Mu onwem si unu, Aṅula iyí ma-ọli; ejila elu-igwe ṅu, n'ihi na ọ bu oche-eze Chineke; eji-kwa-la ala, n'ihi na ọ bu ihe-nb͕akwasi-ukwu nke ukwu-Ya; aṅukwala iyí n'ebe Jerusalem di, n'ihi na ọ bu obodo nke Eze uku ahu. Eji-kwa-la isi-gi ṅu iyí, n'ihi na i pughi ime otù agiri-isi ka ọ di ọcha ma-ọbu ka ọ di oji. Ma ka okwu-unu buru, E, e; É-è, é-è: ma ihe ọ bula kariri ndia nēsite n'ajọ onye ahu. Unu nuru na ekwuru, si, Anya lara anya, ezé lara ezé: ma Mu onwem si unu, Eguzogidela onye bu ajọ onye: kama onye ọ bula nāku gi ura na ǹtì aka-nri, tughari-kwa-ra ya ǹtì ọzọ. Ma ọ buru na onye ọ bula nāchọ ka gi na ya je ikpé, ka o we nara gi uwe-ime-gi, rapu-kwa-ra ya oké uwe-gi. Onye ọ bula nke gējide gi ije otù mile, so ya je mile abua. Nye onye nāriọ gi, ab͕akuta-kwa-la ya azú, bú onye nāchọ ka i binye ya ihe. Unu nuru na ekwuru, si, Hu madu-ibe-gi n'anya, kpọ kwa onye-iro-gi asì: ma Mu onwem si unu, Nāhunu ndi-iro-unu n'anya, nēkpe kwa ekpere nye ndi nēsob͕u unu; ka unu we buru umu nke Nna-unu Nke bi n'elu-igwe: n'ihi na Ọ nēme ka anyanwu-Ya nāwakwasi ajọ madu na ezi madu, Ọ nēme kwa ka miri zokwasi ndi ezi omume na ndi ajọ omume. N'ihi na ùnu nwere ugwọ-ọlu gini, ma ọ buru na unu huru ndi ahu n'anya, bú ndi nāhu unu n'anya? ọbuná ndi-ọna-utu, hà adighi-eme otù ihe ahu? Ọ buru kwa na unu nēkele nání umu-nne-unu, gini ka unu nēme kari ndi ọzọ? ọbuná ndi mba ọzọ, hà adighi-eme otù ihe ahu? Ya mere unu onwe-unu gēzu okè, dika Nna-unu nke elu-igwe zuru okè.