Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

MATIU 5:1-20

MATIU 5:1-20 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Mgbe Jisọs hụrụ igwe mmadụ ahụ, ọ rigooro nʼelu ugwu. Mgbe ọ nọdụrụ ala, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya, o bido ikuziri ha ihe. Ọ sịrị: “Ngọzị na-adịrị ndị bụ ogbenye nʼime mmụọ, nʼihi na alaeze eluigwe bụ nke ha. Ngọzị na-adịrị ndị na-eru ụjụ, nʼihi na a ga-akasị ha obi. Ngọzị na-adịrị ndị dị nwayọọ nʼobi, nʼihi na ha ga-eketa ụwa. Ngọzị na-adịrị ndị agụụ ezi omume na-agụ, nʼihi na ndị ahụ ka afọ ga-eju. Ngọzị na-adịrị ndị na-eme obi ebere, nʼihi na ha ka a ga-emere ebere. Ngọzị na-adịrị ndị dị ọcha nʼobi, nʼihi na ha ga-ahụ Chineke anya. Ngọzị na-adịrị ndị na-eme ka udo dị nʼetiti mmadụ na ibe ya, nʼihi na a ga-akpọ ha ụmụ Chineke. Ngọzị na-adịrị ndị a na-emegbu nʼihi ezi omume, nʼihi na alaeze eluigwe bụ nke ha. “Ngọzị na-adịrị unu mgbe ndị mmadụ na-akọcha unu, na-emegbu unu, ma na-ekwukwa okwu ọjọọ na ụgha niile dị iche iche megide unu nʼihi m. Ṅụrịanụ ọnụ, nwekwanụ obi ụtọ, nʼihi na ụgwọ ọrụ unu dị ukwuu nʼeluigwe. Nʼihi na nʼụzọ dị otu a ka ha sogburu ndị amụma ndị buru unu ụzọ. “Unu bụ nnu nke ụwa, ma ọ bụrụ na nnu adịghị atọkwa ụtọ, a ga-eji gịnị mee ka ọ tọọ ụtọ ọzọ? Ọ bakwaghị uru ọbụla, ma ọ bụghị naanị itufu ya, ka ndị mmadụ zọọ ya ụkwụ. “Unu bụ ihe nke ụwa. Unu dị ka obodo e wuru nʼelu ugwu nke a na-apụghị izo ezo. Ndị mmadụ adịghị amụnye oriọna dọnye ya nʼokpuru igbe, kama a na-adọkwasị ya nʼelu ihe ịdọba oriọna, ka o nye ndị niile nọ nʼụlọ ahụ ìhè. Ya mere, kwerenụ ka ìhè unu nwuo nye mmadụ niile, ka ndị mmadụ hụ ọrụ ọma unu, tookwa Nna unu nke bi nʼeluigwe. “Unu echela na m bịara ịkagbu iwu Mosis, maọbụ ozizi ndị amụma. Abịaghị m ịkagbu akagbu, kama abịara m imezu ha. Nʼezie, agwa m unu, na tutu eluigwe na ụwa agabiga, ọ dịghị otu mkpụrụ edemede ọbụla dị nta, ọ bụladị nke dịkarịsịrị nta, nke a ga-esi nʼIwu a wepụ ruo mgbe ha niile ga emezu. Nʼihi ya, onye ọbụla nke ga-emebi otu nʼime iwu ndị a, ọ bụladị nke dịkarịsịrị nta, ma kuziekwara ndị ọzọ ime otu ahụ, a ga-agụ onye ahụ nʼonye dịkarịsịrị nta nʼalaeze eluigwe. Ma onye na-ezi ụmụ mmadụ ka ha debe iwu ahụ, ma na-emekwa okwu ndị ahụ nʼonwe ya, a ga-akpọ ya onye dị ukwuu nʼalaeze eluigwe. Ka m dọọ unu aka na ntị. Ọ bụrụ na ezi omume unu akarịghị ezi omume ndị Farisii na ndị ozizi iwu, unu apụghị ịba nʼalaeze eluigwe ma ọlị.

MATIU 5:1-20 Bible Nso (IGBOB)

Ma mb͕e Ọ huru ìgwè madu ahu, Ọ rigoro n'ugwu ahu: mb͕e Ọ nọduru ala, ndi nēso uzọ-Ya we biakute Ya: O we saghe ọnu-Ya, zí ha ihe, si, Ngọzi nādiri ndi bu ob͕eye nime mọ-ha: n'ihi na ala-eze nke elu-igwe bu nke ndi ahu. Ngọzi nādiri ndi nēru újú: n'ihi na ndi ahu ka agākasì obi. Ngọzi nādiri ndi di nwayọ n'obi: n'ihi na ndi ahu gēketa uwa. Ngọzi nādiri ndi agu ezi omume nāgu, ndi akpiri nākpọ kwa nku na ya: n'ihi na ndi ahu ka afọ gēju. Ngọzi nādiri ndi-ebere: n'ihi na ndi ahu ka agēmere ebere. Ngọzi nādiri ndi di ọcha n'obi: n'ihi na ndi ahu gāhu Chineke. Ngọzi nādiri ndi nēme ka madu na ibe-ha di n'udo: n'ihi na ndi ahu ka agākpọ umu Chineke. Ngọzi nādiri ndi esob͕uworo n'ihi ezi omume: n'ihi na ala-eze elu-igwe bu nke ndi ahu. Ngọzi nādiri unu mb͕e ọ bula ha nāta unu uta, nēsob͕u kwa unu, nēkwu kwa ajọ ihe nile di iche iche megide unu n'okwu-ugha, n'ihim. Ṅurianu ọṅu, ka obi tọ kwa unu utọ nke-uku: n'ihi na ugwọ-ọlu-unu di uku n'elu-igwe: n'ihi na otú a ka ha sob͕uru ndi-amuma ndi buru unu uzọ. Unu onwe-unu bu nnú nke uwa: ma ọ buru na nnú etufuwo utọ-ya, àgēji gini me ya ka ọ ghọ ezi nnú? ọ dighi kwa irè iji me ihe ọ bula ọzọ, ma-ọbughi ka etufue ya n'èzí, madu azọ ya ukwu. Unu onwe-unu bu ìhè nke uwa. Apughi izo obodo nke ewuworo n'elu ugwu. Ma ha adighi-amuye oriọna, dọba ya n'okpuru mb͕é, kama n'elu ihe-idọba-oriọna; ọ nēnwu-kwa-ra madu nile nọ n'ulo ahu. Otú a menu ka ìhè-unu nēnwu n'iru madu, ka ha we hu ọlu ọma nile unu, we to Nna-unu Nke bi n'elu-igwe. Unu echèla na abiaram imebi iwu Chineke ma-ọbu ndi-amuma-Ya: abiaghm imebi, kama imezu ya. N'ihi na n'ezie asim unu, Rue mb͕e elu-igwe na ala gāgabiga, ọ dighi otù ihe ọ bula dikarisiri ntà gāgabiga n'iwu ma-ọli, rue mb͕e ihe nile gēme. Ya mere onye ọ bula nke gēmebi otù nime ihe ndia dikarisiri ntà nke enyere n'iwu, nke gēzí kwa madu otú ahu, agākpọ ya onye dikarisiri ntà n'ala-eze elu-igwe: ma onye ọ bula nke gēme ha, zí kwa ha, onye ahu ka agākpọ onye uku n'ala-eze elu-igwe. N'ihi na asim unu, na ọ buru na ezi omume-unu adighi-akari ezi omume ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi nke-uku, unu agaghi-abà n'ala-eze elu-igwe ma-ọli.