MATIU 4:18-21
MATIU 4:18-21 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ma mgbe Jisọs na-agafe nʼakụkụ osimiri Galili, ọ hụrụ ụmụnne abụọ, Saimọn onye a na-akpọ Pita, na Andru nwanne ya, ndị ọrụ ha bụ ịkụ azụ, ebe ha nọ nʼụgbọ mmiri na-akụ azụ. Ọ sịrị ha, “Bịanụ soro m. Aga m eme unu ndị ọkụ na-akụta mmadụ.” Ha hapụrụ ụgbụ azụ ha otu mgbe ahụ soro ya. Mgbe ọ gara nʼihu nke nta, ọ hụrụ ụmụnne abụọ ọzọ, Jemis nwa Zebedi na Jọn nwanne ya, ebe ha na nna ha Zebedi nọ nʼime ụgbọ mmiri na-ekezi ụgbụ azụ ha. Ọ kpọkwara ha
MATIU 4:18-21 Bible Nso (IGBOB)
Ma mb͕e Ọ nējeghari n'usọ oké osimiri Galili, Ọ huru umu-nne abua, Saimon nke anākpọ Pita, na Andru nwa-nne-ya, ka ha nāwuye ub͕u n'oké osimiri; n'ihi na ha bu ndi-ọkù. O we si ha, Bianu som n'azu, M'gēme unu ndi-ọkù nākuta madu. Ngwa ngwa ha we rapu ihe nile ha ji eb͕u azù, so Ya. O we si n'ebe ahu ga, hu umu-nne abua ọzọ, Jemes nwa Zebedi, na Jọn nwa-nne-ya, nime ub͕ọ-ha, ha na nna-ha Zebedi, nēkezi ihe ha ji eb͕u azù; O we kpọ ha.