MATIU 28:16-20
MATIU 28:16-20 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ma ndị ikom iri na otu ahụ bụ ndị na-eso ụzọ ya gara Galili, nʼelu ugwu ebe Jisọs gwara ha gaa. Mgbe ha hụrụ ya, ha kpọrọ isiala nye ya. Ma ụfọdụ nʼime ha nwere obi abụọ. Jisọs bịara ha nso, gwa ha sị, “E werela ikike niile dị nʼeluigwe na nke dị nʼelu ụwa nye m. Ya mere, gaanụ mee ka mba niile bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-emenụ ha baptizim nʼaha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmụọ Nsọ. Ziekwanụ ha ka ha na-eme ihe niile m nyere unu nʼiwu. Ma chetanụ na m na-anọnyere unu mgbe niile, ruo ọgwụgwụ oge.”
MATIU 28:16-20 Bible Nso (IGBOB)
Ma ndikom iri na otù ahu ndi nēso uzọ-Ya gara Galili, rue ugwu ebe Jisus gwara ha. Mb͕e ha huru Ya, ha we kpọ isi ala nye Ya: ma ufọdu nwere obi abua. Jisus we biakute ha, gwa ha okwu, si, Ewerewo ike nile di n'elu-igwe na n'elu uwa nyem. Ya mere, ganu, me mba nile ka ha buru ndi nēso uzọm, nēme ha baptism bà n'aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mọ Nsọ: nēzí ha ka ha debe ihe nile, ka ha ra, bú nke M'nyere unu n'iwu: ma le, Mu onwem nọyere unu ubọchi nile, rue ọgwugwu oge a.