MATIU 28:1-4
MATIU 28:1-4 Bible Nso (IGBOB)
Ma mb͕e ubọchi-izu-ike nāgwu, mb͕e chi ubọchi mbu n'ízù ubọchi asa nābọ, Meri Magdalini na Meri ọzọ biara ile ílì ahu. Ma le, ala-ọma-jijiji uku dara; n'ihi na mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi si n'elu-igwe ridata, bia rue, bupu nkume ahu, we nọkwasi ya. Oyiyi-ya di ka àmùmà, uwe-ya nācha kwa ucha dika snow: site n'egwu ya ndi-nche mara jijiji, bia di ka ndi nwuru anwu.
MATIU 28:1-4 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ụbọchị izuike gasịrị, nʼisi ụtụtụ ụbọchị mbụ nʼime izu ụka, Meri Magdalin na Meri nke ọzọ, gara ka ha lee ili ahụ. Na mberede, oke ala ọma jijiji malitere. Nʼihi na mmụọ ozi Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe rịdata, kpụgharịa nkume ahụ e ji mechie ọnụ ili ahụ, nọkwasịkwa nʼelu ya. Ihu ya na-enwu dị ka amụma. Uwe ya na-achakwa ọcha dị ka akụmmiri igwe. Nʼihi egwu ya, ndị nche makwara jijiji. Daa nʼala nọrọ dị ka ndị nwụrụ anwụ.