MATIU 27:11-44
MATIU 27:11-44 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼoge a Jisọs guzo nʼihu gọvanọ. Gọvanọ jụrụ ya sị, “Ị bụ eze ndị Juu?” Jisọs sịrị ya, “Gị onwe gị kwuru ya.” Mgbe ndịisi nchụaja na ndị okenye boro ya ebubo ụgha, o kwughị ihe ọbụla. Ya mere, Pailet sịrị ya, “Ị naghị anụ ihe ndị a niile ha na-ebo gị?” Ma ọ zaghị ọ bụladị otu mkpụrụ okwu nʼebubo ndị ahụ. Ihe a gbagwojuru gọvanọ anya nke ukwuu. Ugbu a, ọ bụ omenaala gọvanọ nʼoge mmemme na ọ ga-ahapụ otu onye mkpọrọ, bụ onye igwe mmadụ họọrọ. Ma nʼoge a e nwere otu onye mkpọrọ nke ọtụtụ mmadụ maara nke ọma. A na-akpọ Jisọs Barabas. Mgbe igwe mmadụ niile zukọrọ, Pailet sịrị ha, “Onye ka unu chọrọ ka m hapụrụ unu, ọ bụ Jisọs Barabas ka ọ bụ Jisọs onye a na-akpọ Kraịst?” Nʼihi na ọ maara nke ọma na ọ bụ site nʼekworo ka ha ji rara Jisọs nye nʼaka ya. Mgbe ọ nọkwasịrị nʼelu oche ikpe ya, nwunye ya zitere ozi sị ya, “Wepụkwa aka gị nʼihe gbasara nwoke onye ezi omume ahụ. Nʼihi na ahụjuru m anya na nrọ nʼabalị gara aga nʼihi ya.” Ma ndịisi nchụaja na ndị okenye kwagidere igwe mmadụ ahụ ka ha rịọ ya, ka ọ hapụrụ ha Barabas, ma nye ha Jisọs ka ha gbuo ya. Ọzọkwa, gọvanọ sịrị ha, “Nʼime mmadụ abụọ ndị a onye ka unu chọrọ ka m hapụrụ unu?” Ha sịrị, “Barabas!” Pailet sịrị ha, “Gịnị ka m ga-eme Jisọs onye a na-akpọ Kraịst?” Ha niile sịrị, “Kpọgide ya nʼobe!” Ọ jụrụ ha sị, “Ọ bụ nʼihi gịnị? Olee ihe ọjọọ o mere?” Ma ha tiri mkpu karịa ka ha si eti na mbụ, na-asị, “Kpọgide ya nʼobe! Kpọgide ya nʼobe!” Mgbe Pailet hụrụ na o nweghị ihe ọ pụrụ ime, kama na ụzụ na ọgbaaghara na-amalite. O weere mmiri kwọọ aka ya nʼihu igwe mmadụ ahụ sị ha, “Aka m dị ọcha nʼebe ọbara nwoke a dị. Jirinụ aka unu hụ maka ya.” Igwe mmadụ ahụ zaghachiri ya nʼotu olu sị, “Ka ọbara ya dị nʼisi anyị na nʼisi ụmụ anyị!” Mgbe ahụ ọ hapụụrụ ha Barabas. Mgbe ọ pịachara Jisọs ihe, ọ raara ya nye ka ha kpọgide ya nʼobe. Mgbe ahụ ndị agha gọvanọ duuru Jisọs baa nʼogige ụlọ ndị agha, mee ka otu ndị agha niile gbaa ya gburugburu. Ha yipụrụ ya uwe ya, yinye ya uwe mwụda na-acha uhie uhie. Ha kpara okpueze nke e ji ogwu mee, kpukwasị ya nʼisi. Ha tinyekwara ya mkpara achara nʼaka nri, gbuo ikpere nʼala nʼihu ya, na-akwa ya emo na-asị, “Ekele, Eze ndị Juu!” Ha gbụrụ ya ọnụ mmiri asọ, werekwa osisi ahụ kụọ ya nʼisi ọtụtụ mgbe. Mgbe ha ji ya mechaa ihe ọchị, ha yipụrụ ya uwe ahụ, yinyekwa ya uwe nke ya, duuru ya pụọ, ịga kpọgide ya nʼobe. Mgbe ha na-apụ, ha zutere otu nwoke onye obodo Sirini a na-akpọ Saimọn. Ha manyere ya ka o buru obe ya. Mgbe ha bịarutere nʼebe a na-akpọ Gọlgọta (nke pụtara, “ebe okpokoro isi”). Ha nyere ya mmanya a gwara ọgwụ ilu ka ọ ṅụọ. Mgbe o detụrụ ya ire, o kweghị ya ọṅụṅụ. Mgbe ha kpọgidechara ya nʼelu obe. Ha fere nza nke ha jiri kee uwe ya nʼetiti onwe ha. Ha nọdụkwara ala nʼebe ahụ na-eche ya nche. Nʼelu ebe isi ya dị, ka ha debere ihe ha dekwasịrị ebubo ha boro ya. Nke a bụ ihe ha dere: Onye a bụ Jisọs, Eze ndị Juu. Ha kpọgidekwara ya na ndị ohi abụọ nʼobe. Otu onye nʼaka nri, onye nke ọzọ nʼaka ekpe ya. Ndị na-agafe nʼụzọ na-ekwutọ ya, na-efufekwa isi ha, na-asịkwa, “Leenụ onye nwere ike ịkwatu ụlọnsọ Chineke wughachi ya na mkpụrụ ụbọchị atọ! Zọpụtanụ onwe gị! Ọ bụrụ na ị bụ Ọkpara Chineke si nʼelu obe ahụ rịdata!” Ndịisi nchụaja, ndị ozizi iwu na ndị okenye sokwa na-eme ya ihe ọchị, na-asị, “Ọ zọpụtara ndị ọzọ, ma o nweghị ike ịzọpụta onwe ya. Ọ bụ eze ndị Izrel; ya si nʼelu obe rịdata ugbu a, anyị ga-ekwerekwa na ya. Ọ tụkwasịrị Chineke obi, ọ bụrụ na ọ masịrị Chineke, ya napụta ya ugbua, nʼihi na o kwuru sị, ‘Abụ m Ọkpara Chineke. ’ ” Ọ bụladị ndị ohi ahụ a kpọgidekọrọ ha na ya nʼobe nọkwa na-akparị ya.
MATIU 27:11-44 Bible Nso (IGBOB)
Ma Jisus guzoro n'iru onye-isi: onye-isi ahu we jua Ya, si, Gì onwe-gi bu Eze ndi-Ju? Jisus we si ya, Gi onwe-gi kwuru. Ma mb͕e ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye nēbo Ya ebubo, Ọ zaghi ihe ọ bula. Mb͕e ahu Pailat si Ya, Ì nughi ka ọtutu ihe ha nāb͕a àmà megide Gi ra? Ma Ọ zaghi ya, ọbuná rue otù okwu: ya mere na o juru onye-isi ahu anya nke-uku. Ma n'ememe onye-isi nārapuru ọra ndi-Ju otù onye-nkpọrọ, onye ha nāchọ. Ma mb͕e ahu ha nwere onye-nkpọrọ onye ọra madu mara, anākpọ Barabas. Ya mere, mb͕e ha zukọrọ, Pailat si ha, Ònye ka unu nāchọ ka m'rapuru unu? Barabas, ma-ọbu Jisus Onye anākpọ Kraist? N'ihi na ọ matara na ha rara Ya-ri nye n'ihi ekworo. Mb͕e ọ nọkwasiri n'oche-ikpé, nwunye-ya zigara ya, si, Aka-gi adila n'okwu Onye ezi omume ahu: n'ihi na ahujurum ọtutu ihe anya na nrọ ta n'ihi Ya. Ma ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye rafuru ìgwè madu nile ka ha riọ ya Barabas, ma la Jisus n'iyì. Ma onye-isi ahu zara, si ha, Ònye nime madu abua ahu ka unu nāchọ ka m'rapuru unu? Ha we si, Barabas. Pailat si ha, Ọ̀ bu gini ka m'gēme kwa Jisus Onye anākpọ Kraist? Ha nile si, Ka akpọgide Ya n'obe. O we si, É-è, n'ihi na Ò mere ihe ọjọ gini? Ma ha tibigara nkpu ókè, si, Ka akpọgide Ya n'obe. Ma mb͕e Pailat huru na okwu-ya abaghi n'ihe ọ bula, kama na ùzù nāputa, o were miri, kwọ aka-ya abua n'iru ìgwè madu ahu, si, Ikpé ọbara Onye ezi omume a amaghm: unu onwe-unu le nke ahu. Ndi-Ju nile we za, si, Ọbara-Ya di ayi n'isi, di kwa n'isi umu-ayi. Mb͕e ahu ọ rapuru ha Barabas: ma ọ rara Jisus nye, mb͕e ọ piasiri Ya ihe, ka ewe kpọgide Ya n'obe. Mb͕e ahu ndi-agha nke onye-isi kuru Jisus tiyere onwe-ha ba na Pritoriọm, ha we me ka òtù-ha dum zukọ n'ebe Ọ nọ. Ha we yipu uwe-Ya, yikwasi Ya uwe uhie. Mb͕e ha kpasiri okpu-eze nke eji ogwu me, ha were ya kpube Ya n'isi, nye kwa Ya amì n'aka-nri-Ya; ha we b͕ue ikperè n'iru Ya, me Ya ihe-ọchì, si, Ekele, Eze ndi-Ju! Ha busa-kwa-ra Ya ọnu-miri, were kwa amì ahu nēti Ya n'isi. Mb͕e ha mesiri Ya ihe-ọchì, ha we yipu Ya uwe ahu, yikwasi Ya uwe-Ya nile, dupuga Ya ikpọgide Ya n'obe. Ma mb͕e ha nāputa, ha huru otù nwoke onye Sairini, aha-ya bu Saimon: onye ahu ka ha jidere ka o so ha, ka o we būru obe-Ya. Mb͕e ha biara n'ebe anākpọ Gọlgọta, nke bu, Ebe okpokoro-isi, ha we nye Ya manya-vine nke agwara òlùlù ka Ọ ṅua: ma mb͕e O deturu ya ire, Ọ chọghi ka Ọ ṅua. Mb͕e ha kpọgidesiri Ya n'obe, ha kère uwe-Ya n'etiti ha, nēfe nzà: ka o wee mezuo bụ ihe si n'ọnụ onye amụma Pita, Ha nēkere onwe-ha uwem, n'elu bụ ihe m n'eyi n'aru ka ha nēfe kwa nza. ha we nọdu nēche Ya n'ebe ahu. Ha debe-kwa-ra n'elu isi-Ya ihe eboro Ya nke edeworo n'akwukwọ, si, ONYE A BU JISUS EZE NDI-JU. Mb͕e ahu akpọgidere ndikom abua tiyere Ya, bú ndi nāpunara madu ihe, otù onye n'aka-nri-Ya, na otù onye n'aka-ekpe. Ndi nāgabiga nēkwulu kwa Ya, nēfufe isi-ha, nāsi kwa, Gi Onye nākwatu ulo nsọ ayi, Onye nēwu kwa ya n'ubọchi atọ, zọputa Onwe-gi: ọ buru na I bu Ọkpara Chineke, si n'elu obe ridata. Otú ahu ka ndi-isi-nchu-àjà nēkwu kwa, ebe ha na ndi-ode-akwukwọ na ndi-okenye nēme Ya ihe-ọchì, si, Ọ zọputara ndi ọzọ; Ọ pughi izọputa Onwe-ya. Ọ bu Eze Israel; ka O si n'elu obe ridata ub͕u a, ayi gēkwe kwa na Ya. Ọ nātukwasi obi-Ya na Chineke; ka Ọ dọputa Ya ub͕u a, ọ buru na Ọ nāchọ Ya: n'ihi na Ọ siri, Abum Ọkpara Chineke. Ndi ahu nāpunara madu ihe, ndi akpọgidere Ya na ha n'obe, nāta kwa Ya uta otù aka ahu.