Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

MATIU 27:11-26

MATIU 27:11-26 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Nʼoge a Jisọs guzo nʼihu gọvanọ. Gọvanọ jụrụ ya sị, “Ị bụ eze ndị Juu?” Jisọs sịrị ya, “Gị onwe gị kwuru ya.” Mgbe ndịisi nchụaja na ndị okenye boro ya ebubo ụgha, o kwughị ihe ọbụla. Ya mere, Pailet sịrị ya, “Ị naghị anụ ihe ndị a niile ha na-ebo gị?” Ma ọ zaghị ọ bụladị otu mkpụrụ okwu nʼebubo ndị ahụ. Ihe a gbagwojuru gọvanọ anya nke ukwuu. Ugbu a, ọ bụ omenaala gọvanọ nʼoge mmemme na ọ ga-ahapụ otu onye mkpọrọ, bụ onye igwe mmadụ họọrọ. Ma nʼoge a e nwere otu onye mkpọrọ nke ọtụtụ mmadụ maara nke ọma. A na-akpọ Jisọs Barabas. Mgbe igwe mmadụ niile zukọrọ, Pailet sịrị ha, “Onye ka unu chọrọ ka m hapụrụ unu, ọ bụ Jisọs Barabas ka ọ bụ Jisọs onye a na-akpọ Kraịst?” Nʼihi na ọ maara nke ọma na ọ bụ site nʼekworo ka ha ji rara Jisọs nye nʼaka ya. Mgbe ọ nọkwasịrị nʼelu oche ikpe ya, nwunye ya zitere ozi sị ya, “Wepụkwa aka gị nʼihe gbasara nwoke onye ezi omume ahụ. Nʼihi na ahụjuru m anya na nrọ nʼabalị gara aga nʼihi ya.” Ma ndịisi nchụaja na ndị okenye kwagidere igwe mmadụ ahụ ka ha rịọ ya, ka ọ hapụrụ ha Barabas, ma nye ha Jisọs ka ha gbuo ya. Ọzọkwa, gọvanọ sịrị ha, “Nʼime mmadụ abụọ ndị a onye ka unu chọrọ ka m hapụrụ unu?” Ha sịrị, “Barabas!” Pailet sịrị ha, “Gịnị ka m ga-eme Jisọs onye a na-akpọ Kraịst?” Ha niile sịrị, “Kpọgide ya nʼobe!” Ọ jụrụ ha sị, “Ọ bụ nʼihi gịnị? Olee ihe ọjọọ o mere?” Ma ha tiri mkpu karịa ka ha si eti na mbụ, na-asị, “Kpọgide ya nʼobe! Kpọgide ya nʼobe!” Mgbe Pailet hụrụ na o nweghị ihe ọ pụrụ ime, kama na ụzụ na ọgbaaghara na-amalite. O weere mmiri kwọọ aka ya nʼihu igwe mmadụ ahụ sị ha, “Aka m dị ọcha nʼebe ọbara nwoke a dị. Jirinụ aka unu hụ maka ya.” Igwe mmadụ ahụ zaghachiri ya nʼotu olu sị, “Ka ọbara ya dị nʼisi anyị na nʼisi ụmụ anyị!” Mgbe ahụ ọ hapụụrụ ha Barabas. Mgbe ọ pịachara Jisọs ihe, ọ raara ya nye ka ha kpọgide ya nʼobe.

MATIU 27:11-26 Bible Nso (IGBOB)

Ma Jisus guzoro n'iru onye-isi: onye-isi ahu we jua Ya, si, Gì onwe-gi bu Eze ndi-Ju? Jisus we si ya, Gi onwe-gi kwuru. Ma mb͕e ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye nēbo Ya ebubo, Ọ zaghi ihe ọ bula. Mb͕e ahu Pailat si Ya, Ì nughi ka ọtutu ihe ha nāb͕a àmà megide Gi ra? Ma Ọ zaghi ya, ọbuná rue otù okwu: ya mere na o juru onye-isi ahu anya nke-uku. Ma n'ememe onye-isi nārapuru ọra ndi-Ju otù onye-nkpọrọ, onye ha nāchọ. Ma mb͕e ahu ha nwere onye-nkpọrọ onye ọra madu mara, anākpọ Barabas. Ya mere, mb͕e ha zukọrọ, Pailat si ha, Ònye ka unu nāchọ ka m'rapuru unu? Barabas, ma-ọbu Jisus Onye anākpọ Kraist? N'ihi na ọ matara na ha rara Ya-ri nye n'ihi ekworo. Mb͕e ọ nọkwasiri n'oche-ikpé, nwunye-ya zigara ya, si, Aka-gi adila n'okwu Onye ezi omume ahu: n'ihi na ahujurum ọtutu ihe anya na nrọ ta n'ihi Ya. Ma ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye rafuru ìgwè madu nile ka ha riọ ya Barabas, ma la Jisus n'iyì. Ma onye-isi ahu zara, si ha, Ònye nime madu abua ahu ka unu nāchọ ka m'rapuru unu? Ha we si, Barabas. Pailat si ha, Ọ̀ bu gini ka m'gēme kwa Jisus Onye anākpọ Kraist? Ha nile si, Ka akpọgide Ya n'obe. O we si, É-è, n'ihi na Ò mere ihe ọjọ gini? Ma ha tibigara nkpu ókè, si, Ka akpọgide Ya n'obe. Ma mb͕e Pailat huru na okwu-ya abaghi n'ihe ọ bula, kama na ùzù nāputa, o were miri, kwọ aka-ya abua n'iru ìgwè madu ahu, si, Ikpé ọbara Onye ezi omume a amaghm: unu onwe-unu le nke ahu. Ndi-Ju nile we za, si, Ọbara-Ya di ayi n'isi, di kwa n'isi umu-ayi. Mb͕e ahu ọ rapuru ha Barabas: ma ọ rara Jisus nye, mb͕e ọ piasiri Ya ihe, ka ewe kpọgide Ya n'obe.