MATIU 26:47-68
MATIU 26:47-68 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ọ nọ na-ekwu okwu a, Judas, otu nʼime ndị ozi iri na abụọ ahụ bịaruru, ya na ọtụtụ igwe mmadụ so. Ụfọdụ ji mma agha ha, ndị ọzọ ji osisi. Ọ bụ ndịisi nchụaja na ndị okenye ndị Juu zitere ha. Ma onye ahụ na-arara ya nye, nyere ha ihe ịrịbama, sị, “Onye ahụ m ga-esutu ọnụ bụ nwoke ahụ, jidesienụ ya aka ike!” Ngwangwa o jekwuuru Jisọs sị ya, “Ekele, Onye ozizi!” ma sutukwa ya ọnụ. Jisọs gwara ya sị, “Enyi m, mee ihe ị bịara ime ngwangwa.” Mgbe ahụ, ndị ikom ahụ bịara nso jide Jisọs, sekpụrụ ya nʼike. Otu onye nʼime ndị ha na Jisọs nọ, setịrị aka ya, mịpụta mma agha ya, gbuo ohu onyeisi nchụaja, gbupụ ntị ya. Ma Jisọs sịrị ya, “Mịghachi mma agha gị nʼọbọ ya, nʼihi na mmadụ ọbụla na-eji mma egbu mmadụ ibe ya ga-anwụ site na mma. I cheghị na m pụrụ ịrịọ Nna m ka o zitere m ihe karịrị usuu ndị mmụọ ozi iri na abụọ nʼotu ntabi anya? Ma olee otu ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ ga-esi mezuo, nke kwuru na ọ ghaghị ịdị otu a?” Nʼoge awa ahụ, Jisọs gwara igwe mmadụ ahụ sị, “Unu pụtara chịrị mma agha na mkpọ bịa ijide m dị ka a ga-asị na m bụ onye ohi? Anọrọla m ziekwa ihe nʼụlọnsọ kwa ụbọchị, ma unu ejideghị m. Ma ihe ndị a na-eme ka ihe ndị amụma dere nʼakwụkwọ nsọ mezuo.” Nʼoge ihe ndị a niile na-eme, ndị na-eso ụzọ ya niile hapụrụ ya gbalaga. Ndị jidere Jisọs duuru ya gaa nʼụlọ Kaịfas, onyeisi nchụaja. Ndị ozizi iwu na ndị okenye ndị Juu zukọtara nʼebe ahụ. Pita sogidere Jisọs nʼazụ site nʼebe dị anya. O rutere nʼobi onyeisi nchụaja, baa nʼime ụlọ, sorokwa ndị na-eje ozi nọdụ ala, ka o nwe ike ịhụ otu ihe a ga-esi bie. Ndịisi nchụaja, na ndịisi ikpe nʼụlọikpe ahụ nọ na-achọ ama ụgha megide Jisọs, ka ha hụ ụzọ ha ga-esi gbuo ya. Ma ọ dịghị nke ha chọtara, nʼagbanyeghị nʼọtụtụ ndị akaebe ụgha pụtara. Nʼikpeazụ, mmadụ abụọ pụtara kwuo sị, “Nwoke a sịrị, ‘Enwere m ike ịkwatu ụlọnsọ ukwu nke Chineke, wughachikwa ya nʼụbọchị atọ. ’ ” Onyeisi nchụaja biliri ọtọ kwuo sị, “Ọ bụ na ị nweghị ihe ọbụla ị ga-aza? Gịnị bụ ama ndị a a na-agba megide gị?” Ma Jisọs ekwughị ihe ọbụla. Onyeisi nchụaja gwara ya sị, Eji m aha Chineke dị ndụ nye gị iwu, sị gị, “gwa anyị, ị bụ Kraịst, Ọkpara Chineke?” Jisọs gwara ya sị, “Gị onwe gị kwuru ya. Ma ana m agwa unu, site ugbu a na-aga nʼihu, unu ga-ahụ Nwa nke Mmadụ ka ọ na-anọdụ nʼaka nri nke Onye dị ike, na-abịakwa nʼigwe ojii nke eluigwe.” Mgbe ahụ onyeisi nchụaja dọwara uwe ya, kwuo sị, “O kwuola arụ! Olee mkpa ọ dị ịchọkwa ndị akaebe? Unu nụkwara nkwulu ya? Gịnị bụ mkpebi unu?” Ha zara sị ya, “O kwesiri ka ọ nwụọ!” Mgbe ahụ, ha gbụsara ya ọnụ mmiri asọ nʼihu, tiekwa ya aka. Ndị ọzọ maara ya ụra, sị ya, “Buoro anyị amụma, gị, Kraịst. Onye tiri gị ihe?”
MATIU 26:47-68 Bible Nso (IGBOB)
Mb͕e Ọ kpu okwu n'ọnu, le, Judas, otù onye n'etiti ndi-ozi iri na abua ahu, we bia, ya na oké ìgwè madu ndi chiri mma-agha na osisi, site n'ebe ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye nke ndi-Ju nọ. Ma onye nārara Ya nye nyere ha ihe-iriba-ama, si, Onye ọ bula m'gēsutu ọnu, Onye ahu bu Ya: jidenu Ya. Ngwa ngwa ọ biakutere Jisus, si, Ekele, Rabai; o we sutu Ya ọnu nke-uku. Jisus we si ya, Eyim, me ihe i biara ime. Mb͕e ahu ha biakutere Ya, we tukwasi Jisus aka, jide Ya. Ma le, otù onye nime ndi ha na Jisus nọ setiri aka-ya, miputa mma-agha-ya, b͕u orù onye-isi-nchu-aja mma, bipu nti-ya. Mb͕e ahu Jisus si ya, Mighachi mma-agha-gi n'ọnọdu-ya: n'ihi na madu nile ndi were mma-agha gāla n'iyì site na mma-agha. Ma-ọbu i nēchè na apughm iriọ Nnam, Ọ gēzite-kwa-ram ọbuná ub͕u a kari legion iri na abua nime ndi-mọ-ozi? Ihe edeworo n'akwukwọ nsọ gēsi kwa aṅa mezu, na ọ ghaghi ime otú a? N'oge hour ahu Jisus siri ìgwè madu ahu, Ùnu putara chiri mma-agha na osisi ijidem, dika imegide onye nāpunara madu ihe? Kwa-ubọchi M'nọduru n'ulo uku Chineke nēzí ihe, ma unu ejideghm. Ma emewo ihe a dum, ka ihe nile ndi-amuma dere n'akwukwọ we mezu. Mb͕e ahu ndi nile nēso uzọ-Ya rapuru Ya, b͕alaga. Ma ndi jidere Jisus si n'ebe ahu duru Ya je rue ulo Kaiafas onye-isi-nchu-àjà, ebe ndi-ode-akwukwọ na ndi-okenye zukọrọ. Ma Pita soro Ya n'ebe di anya, rue obí onye-isi-nchu-àjà, o we ba nime, nọdu n'etiti ndi nēje ozi, ka ọ hu ọgwugwu-ya. Ma ndi-isi-nchu-àjà na nnọkọ-ikpé dum nāchọ àmà ugha imegide Jisus, ka ha we me ka Ọ nwua; ma ha achọtaghi, ọ bu ezie na ọtutu ndi-àmà ugha biara. Ma emesia abua biara, si, Nwoke a siri, Apurum ikwatu ulo nsọ a nke Chineke, wu kwa ya n'ubọchi atọ. Onye-isi-nchu-àjà we bilie, si Ya, Ì zaghi ihe ọ bula? gini bu àmà madu ndia nāb͕agide Gi? Ma Jisus kpuchiri ọnu. Onye-isi-nchu-àjà we si Ya, Ewerem Chineke di ndu b͕a Gi iyí, ka I gwa ayi ma Gi onwe-gi bu Kraist ahu, Ọkpara Chineke. Jisus si ya, Gi onwe-gi kwuru: otú ọ di, asim unu, Site n'ub͕u a unu gāhu Nwa nke madu ka Ọ nānọdu n'aka-nri nke ike, nābia kwa n'elu igwe-oji nile nke elu-igwe. Mb͕e ahu onye-isi-nchu-àjà dọwara uwe-ya nile, si, O kwuluru Chineke: ọ̀ bu nkpà ndi-àmà gini nākpa ayi ọzọ? le, ub͕u a ka unu nuru nkwulu ahu: gini bu uche-unu? Ha we za, si, O kwesiri inwu ọnwu. Mb͕e ahu ha busara Ya ọnu-miri n'iru, ti kwa Ya aka: ufọdu we pia Ya ihe, si, Buru ayi amuma, Kraist: ònye bu onye ahu nke tiri Gi aka?