MATIU 25:16-18
MATIU 25:16-18 Bible Nso (IGBOB)
Ngwa ngwa onye nara talent ise ahu gara were ha zua ahia, we rita urù talent ise ọzọ. Otú ahu onye nara talent abua ahu rita-kwa-ra talent abua ọzọ. Ma onye nara otù talent ahu jere gwu ala, zobe ego onye-nwe-ya.
Kesaa
Gụọ MATIU 25MATIU 25:16-18 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Onye ahụ natara talenti ise weere ego ahụ malite ịzụ ahịa. Ngwangwa o retara talenti ise ọzọ nʼuru. Otu a kwa, onye nke e nyere talenti abụọ zụpụtakwara talenti abụọ ọzọ nʼuru. Ma onye ahụ natara otu talenti gara gwuo ala lie ego nna ya ukwu, nʼihi ichezi ya nke ọma.
Kesaa
Gụọ MATIU 25