Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

MATIU 25:1-46

MATIU 25:1-46 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

“A ga-eji alaeze eluigwe tụnyere akụkọ ụmụ agbọghọ iri ndị weere oriọna ha pụta izute onye na-alụ nwunye ọhụrụ. Ise nʼime ha maara ihe, ma ise ndị ọzọ bụ ndị nzuzu. Ise ndị nzuzu ahụ weere oriọna ha, ma ha ejighị mmanụ ọkụ. Ise ndị maara ihe, wụjuru mmanụ ọkụ na karama, tinyekwa oriọna ha. Mgbe onye na-alụ nwunye ọhụrụ ahụ nọrọ ọdụ nʼọbịbịa ya, ụra tụwara ha, ha dinara ala rahụ ụra. “Nʼetiti abalị e tiri mkpu nʼoke olu sị, ‘Onye na-alụ nwunye ọhụrụ na-abịa, pụtanụ gaa zute ya!’ “Mgbe ahụ ụmụ agbọghọ niile ahụ biliri mụnye oriọna ha. Ise ndị nzuzu ahụ rịọrọ ise ndị maara ihe sị, ‘Biko, wụnyetụrụnụ anyị ụfọdụ nʼime mmanụ ọkụ unu, lee na oriọna anyị na-anyụ anyụ.’ “Ndị maara ihe zara ha sị, ‘Mba! Ọ gaghị ezuru anyị na unu. Kama gaanụ zuru nke unu nʼaka ndị na-ere ya.’ “Ma mgbe ha pụrụ ịzụta mmanụ ọkụ ahụ, onye na-alụ nwunye ọhụrụ bịarutere. Ndị jikeere ejikere soro ya banye nʼoriri ọlụlụ di na nwunye ahụ. E mechikwara ọnụ ụzọ. “Emesịa, ise ndị nzuzu ahụ lọghachiri na-ekwu sị, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, meghere anyị ụzọ!’ “Ma ọ zaghachiri ha sị, ‘Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, amaghị m ndị unu bụ.’ “Ya mere, na-anọgidenụ na nche, nʼihi na unu amaghị ụbọchị ahụ, maọbụ oge awa ahụ. “Ọzọ, ọ ga-adị ka otu nwoke chọrọ ịga njem. Ọ kpọkọtara ndị ohu ya niile nyefee ha akụnụba ya nʼaka. O nyere onye nke mbụ talenti ise, nke abụọ ka o nyere talenti abụọ. O nyere onye nke ikpeazụ otu talenti. O nyere ha nʼotu nʼotu dị ka ike ha ha. Mgbe ahụ ọ hapụrụ ha gaa ije ya. Onye ahụ natara talenti ise weere ego ahụ malite ịzụ ahịa. Ngwangwa o retara talenti ise ọzọ nʼuru. Otu a kwa, onye nke e nyere talenti abụọ zụpụtakwara talenti abụọ ọzọ nʼuru. Ma onye ahụ natara otu talenti gara gwuo ala lie ego nna ya ukwu, nʼihi ichezi ya nke ọma. “Mgbe ogologo oge gasịrị, nna ukwu ndị ohu ahụ lọtara site nʼije ya. Ọ kpọkọtara ha niile ka ha gụzie akụ ya. Onye ahụ natara talenti ise batara wetakwa ise ọzọ. Ọ gwara nna ya ukwu sị, ‘Ị nyere m talenti ise, ma ugbu a azụpụtala m talenti ise ọzọ!’ “Nna ya ukwu sịrị ya, ‘I mere nke ọma ezi ohu kwesiri ntụkwasị obi. I zipụtala na i kwesiri ntụkwasị obi nʼihe dị ntakịrị. Nʼihi ya aga m etinye gị nʼebe ị ga-elekọta ọtụtụ ihe. Bata nʼọṅụ nke nna gị ukwu.’ “Onye nke e nyere talenti abụọ bịara sị, ‘Nna anyị ukwu, i nyere m talenti abụọ, ma lee, eritala m talenti abụọ ọzọ nʼuru.’ “Nna ya ukwu sịrị ya, ‘I mere nke ọma. Ị bụ ezi ohu kwesiri ntụkwasị obi. I zipụtala na i kwesiri ntụkwasị obi nʼihe dị ntakịrị. Nʼihi ya aga m etinye gị nʼebe ị ga-elekọta ọtụtụ ihe. Bata nʼọṅụ nke nna gị ukwu.’ “Onye e nyere otu talenti batara sị, ‘Nna anyị ukwu, amaara m onye ị bụ. Ị bụ onye aka ntagide. Ị na-ewe ihe ubi nʼebe ị na-akụghị mkpụrụ. Ị na-achịkọtakwa nʼebe ị na-agbasaghị. Nʼihi nke a, atụrụ m egwu, a gara m liere gị ego talenti gị nʼala. Lee ihe gị werekwa.’ “Nna ya ukwu zara ya sị, ‘Ohu ọjọọ na onye umengwụ. Ị maara na m na-ewe ihe ubi nʼebe m na-akụghị mkpụrụ, na-achịkọtakwa nʼebe m na-agbasaghị. Ị gaara etinye ego m nʼaka ndị na-echekwa ego, ndị gaara akwụghachi ya na ọmụrụnwa ya, nke m gaara anata mgbe m lọghachiri. “ ‘Napụtanụ ya talenti ahụ o ji, were ya nye onye ji talenti iri. Nʼihi na onye ọbụla nwere ka a ga e tinyekwuru ka o nwebigakwa oke. Ma onye ahụ ọ na-adịghị nke o nwere, a ga-anapụ ya ọ bụladị nke nta o nwere. Tụpụnụ ohu a na-abaghị uru nʼezi, nʼime ọchịchịrị, ebe ịkwa akwa na ịta ikikere eze ga-adị.’ “Mgbe Nwa nke Mmadụ ga-abịa nʼebube ya na ndị mmụọ ozi niile, mgbe ahụ ka ọ ga-anọ nʼelu ocheeze ebube ya. Mba niile nke ụwa ga-ezukọtakwa nʼihu ya. Ọ ga-ekewapụta ha, otu obodo site nʼibe ya, dị ka onye ọzụzụ atụrụ sị ekewapụta ụmụ atụrụ site nʼụmụ ewu. Ọ ga-edebe ụmụ atụrụ ahụ nʼakụkụ aka nri ya, ma ụmụ ewu ga-anọ nʼaka ekpe ya. “Mgbe ahụ, eze ga-asị ndị nọ nʼaka nri ya, ‘Batanụ nʼime alaeze, unu ndị Nna m gọziri agọzi, batanụ nʼime alaeze nke e doziiri unu site na mgbe e kere ụwa. Nʼihi na mgbe agụụ gụrụ m unu nyere m nri. Mgbe akpịrị kpọrọ m nkụ unu nyere m ihe ọṅụṅụ. Mgbe m bụ ọbịa unu kpọbatara m. Mgbe m gba ọtọ, unu zụtara uwe nye m. Mgbe m dara ọrịa unu lekọtara m. Anọkwara m nʼụlọ mkpọrọ unu bịara leta m.’ “Mgbe ahụ ndị ezi omume ahụ ga-ajụ ya sị, ‘Onyenwe anyị, olee mgbe anyị hụrụ gị ka agụụ na-agụ gị anyị enye gị nri? Olee mgbe anyị hụrụ gị ka akpịrị na-akpọ gị nkụ, anyị ekuru mmiri ọṅụṅụ nye gị? Olee mgbe kwa ka anyị hụrụ gị dị ka onye ọbịa anyị akpọbata gị? Olee mgbe kwa ka anyị hụrụ gị ka ị gba ọtọ anyị enye gị uwe? Olee mgbe kwa ka anyị hụrụ gị nʼọrịa, maọbụ nʼụlọ mkpọrọ anyị abịa leta gị?’ “Eze ahụ ga-azaghachi ha sị, ‘Nʼezie asị m unu, mgbe unu mesoro otu nʼime ndị a dị nta nʼime ụmụnne m omume ọma, ọ bụ m ka unu mesoro omume ahụ.’ “Mgbe ahụ ọ ga-asịkwa ndị nọ nʼaka ekpe ya, ‘Pụọnụ nʼihu m unu ndị a bụrụ ọnụ. Baanụ nʼime ọdọ ọkụ ebighị ebi ahụ a kwadobeere ekwensu na ndị mmụọ ozi ya. Nʼihi na mgbe agụụ na-agụ m, unu enyeghị m ihe ọbụla ka m rie. Mgbe akpịrị na-akpọ m nkụ, unu ekunyeghị m mmiri ka m ṅụọ. Mgbe m nọ dị ka ọbịa, unu akpọbataghị m nʼụlọ unu. Mgbe m gba ọtọ, unu enyeghị m uwe. Mgbe ahụ na-esighị m ike, unu elekọtaghị m. Mgbe m nọ nʼụlọ mkpọrọ, unu abịaghị leta m.’ “Mgbe ahụ ha ga-azakwa sị, ‘Onyenwe anyị, olee mgbe anyị hụrụ gị ka agụụ na-agụ gị, maọbụ ka akpịrị na-akpọ gị nkụ, maọbụ oge ị bụ onye ọbịa, maọbụ oge ị gba ọtọ, maọbụ oge ị nọ nʼọrịa, maọbụ ị nọ nʼụlọ mkpọrọ, ma anyị elekọtaghị gị?’ “Ọ ga-aza ha sị, ‘Eziokwu ahụ bụ nke a, mgbe ahụ unu jụrụ inyere otu nʼime ndị a dị nta aka, ọ bụ m ka unu jụrụ i nyere aka.’ “Ndị a ga-aba nʼịta ahụhụ ebighị ebi. Ma ndị ezi omume ga-aba na ndụ ebighị ebi.”

MATIU 25:1-46 Bible Nso (IGBOB)

Mb͕e ahu agēji ala-eze elu-igwe tuyere umu-ab͕ọghọ iri, ndi chiri ọwa-ha, pua izute onye nālu nwunye ọhu. Ma ise nime ha bu ndi-nzuzu, ise bu kwa ndi nwere uche. N'ihi na ndi-nzuzu ahu, mb͕e ha chiri ọwa-ha, ha ejighi manu n'aka-ha: ma ndi ahu nwere uche ji manu n'aria-ha tiyere ọwa-ha. Ma mb͕e onye nālu nwunye ọhu nānọ ọdù di anya, ha nile rubere ura we raru. Ma n'etiti abali iti-nkpu dara, Le, onye nālu nwunye ọhu! Putanu izute ya. Mb͕e ahu umu-ab͕ọghọ ahu nile biliri, we dozie ọwa-ha. Ndi-nzuzu we si ndi nwere uche, Nye ayi ufọdu na manu-unu; n'ihi na ọwa-ayi nānyu anyu. Ma ndi nwere uche zara, si, É-è, eleghi anya ọ gaghi-ezuru ayi na unu: kama jekurunu ndi nēre, zuru nye onwe-unu. Ma mb͕e ha nēje izú, onye nālu nwunye ọhu biara; ndi edoziworo we so ya ba n'oriri ọlulu-nwunye: ewe mechie uzọ. Emesia umu-ab͕ọghọ fọduru bia kwa, nāsi, Onye-nwe-ayi, Onye-nwe-ayi, meghere ayi uzọ. Ma ọ zara, si, N'ezie asim unu, amataghm unu. Ya mere, nēchenu nche, n'ihi na unu amataghi ubọchi ahu ma-ọbu oge hour ahu. N'ihi na ọ di ka mb͕e madu, mb͕e ọ gaje inọdu n'ala ndi ọzọ, ọ kpọrọ ndi-orù nke aka ya, rara ihe nile o nwere nye n'aka-ha. Otù ka ọ nyere talent ise, nke-ọzọ talent abua, nke-ọzọ otù talent; o nye onye ọ bula dika ike nke aka ya ra; o we je inọdu n'ala ndi ọzọ. Ngwa ngwa onye nara talent ise ahu gara were ha zua ahia, we rita urù talent ise ọzọ. Otú ahu onye nara talent abua ahu rita-kwa-ra talent abua ọzọ. Ma onye nara otù talent ahu jere gwu ala, zobe ego onye-nwe-ya. Ma mb͕e ogologo oge gasiri onye-nwe ndi-orù ahu bia, ya na ha we piazi. Onye ahu nke nara talent ise we biakute ya weta talent ise ọzọ, si, Onye-nwe-ayi, i rara talent ise nyem n'aka: le, eritaram talent ise ọzọ n'urù. Onye-nwe-ya siri ya, I mere nke-ọma, ezi orù nke kwesiri ka atukwasi gi obi: i kwesiri ka atukwasi gi obi n'umu ihe ole-na-ole, m'gēme gi onye-isi ọtutu ihe: ba n'ọṅù nke onye-nwe-gi. Onye nara talent abua ahu we biakute kwa ya, si, Onye-nwe-ayi, i rara talent abua nyem n'aka: le, eritaram talent abua ọzọ n'urù. Onye-nwe-ya siri ya, I mere nke-ọma, ezi orù nke kwesiri ka atukwasi gi obi; i kwesiri ka atukwasi gi obi n'umu ihe ole-na-ole, m'gēme gi onye-isi ọtutu ihe: ba n'ọṅù nke onye-nwe-gi. Onye narari otù talent ahu we biakute kwa ya, si, Onye-nwe-ayi, amaram i na i bu madu aka ike, nēwe ihe ubi n'ebe i nāghaghi nkpuru, nāchikọputa kwa n'ebe i nāfuchagh: m'we tua egwu, we je zobe talent nke gi n'ala: le, i nwere nke gi. Ma onye-nwe-ya zara, si ya, Ajọ orù nke di ume-ngwu, i matara na anamewe ihe ubi n'ebe m'nāghaghi nkpuru, nāchikọputa kwa n'ebe m'nāfuchaghi; ya mere, ọ di gi nkpà iwere egom tiye n'aka ndi nāb͕anwe ego, mb͕e m'biara mu onwem gānaghachi kwa nkem, ya na uma. Ya mere, napunu ya talent ahu, were kwa ya nye onye ahu nke nwere talent iri ahu. N'ihi na onye ọ bula nke nwere ka agēnye, ọ gēnwebiga kwa ókè: ma site n'aka onye nēnweghi, ọbuná ihe o nwere ka agānapu ya. Tupu-kwa-nu orù a nābaghi n'ihe n'ọchichiri nke èzí: n'ebe ahu ka ikwa-ákwá na ita-ikekere-ezé ahu gādi. Ma mb͕e ọ bula Nwa nke madu gābia n'ebube-Ya, Ya na ndi-mọ-ozi nile, mb͕e ahu ka Ọ gānọkwasi n'oche-eze nke ebube-Ya: ma n'iru Ya ka agēme ka mba nile zukọ: Ọ gēkewaputa kwa ha, otù n'aru ibe-ya, dika onye nāzù aturu nēkewaputa aturu n'umu-ewu: Ọ gēdebe kwa aturu n'aka-nri-Ya, ma umu-ewu n'aka-ekpe. Mb͕e ahu Eze ahu gāsi ndi nọ n'aka-nri-Ya, Bianu, ndi agọziri agọzi nke Nnam, ketanu ala-eze edoziworo unu site na ntọ-ala nke uwa: n'ihi na agu gurum, unu we nyem ihe M'gēri: akpiri kpọrọm nku, unu we kuru miri nyem: abum ọbìa, unu we kpọbatam; ab͕aram ọtọ, unu we b͕okwasim ákwà: aru adighm ike, unu we letam: anọm n'ulo-nkpọrọ, unu we biakutem. Mb͕e ahu ndi ezi omume ahu gāza Ya, si, Onye-nwe-ayi, òle mb͕e ayi huru Gi ka agu nāgu Gi, ayi we zùa Gi? ma-ọbu ka akpiri nākpọ Gi nku, ayi we kuru miri nye Gi? Òle mb͕e ayi hu-kwa-ra Gi ka I bu ọbìa, ayi we kpọbata Gi? ma-ọbu ka I nāb͕a ọtọ, ayi we b͕okwasi Gi ákwà? Òle mb͕e ayi hu-kwa-ra Gi ka aru nādighi ike, ma-ọbu n'ulo-nkpọrọ, ayi we biakute Gi? Eze ahu gāza kwa, si ha, N'ezie asim unu, Ka ọ ra, bú otú unu si me ya nye otù onye nime umu-nnam ndia, bú ndi dikarisiri ntà, Mu ka unu mere ya nye. Mb͕e ahu Ọ gāsi kwa ndi nọ n'aka-ekpe-Ya, Puanu n'irum, ndi anābu ọnu, ga n'ọku ebighi-ebi ahu nke edoziworo nye ekwensu na ndi-mọ-ozi-ya: n'ihi na agu gurum, ma unu enyeghm ihe M'gēri: akpiri kpọrọm nku, ma unu ekughi miri nyem: abum ọbìa, ma unu akpọbataghm; ab͕aram ọtọ, ma unu eb͕okwasighm ákwà; aru adighm ike, anọkwam n'ulo-nkpọrọ, ma unu eletaghm. Mb͕e ahu ndi ahu gāza kwa, si, Onye-nwe-ayi, òle mb͕e ayi huru Gi ka agu nāgu Gi, ma-ọbu ka akpiri nākpọ Gi nku, ma-ọbu ka I bu ọbìa, ma-ọbu ka I nāb͕a ọtọ, ma-ọbu ka aru nādighi Gi ike, ma-ọbu ka I nọ n'ulo-nkpọrọ, ma ayi ejereghi Gi ozi? Mb͕e ahu Ọ gāza ha, si, N'ezie asim unu, Ka ọ ra, bú otú unu nēmeghi ya nye otù onye nime ndia dikarisiri ntà, Mu ka unu nēmeghi ya nye. Ndia gāpu je ba n'ahuhu-nmehie ebighi-ebi: ma ndi ezi omume gābà na ndu ebighi-ebi.