Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

MATIU 24:1-28

MATIU 24:1-28 Bible Nso (IGBOB)

Jisus we si n'ulo uku Chineke pua, we nāga n'uzọ-Ya; ndi nēso uzọ-Ya we biakute Ya igosi Ya owuwu-ulo nile nke ulo uku Chineke. Ma Ọ zara, si ha, Ùnu ahughi ihe ndia nile? n'ezie asim unu, Agaghi-arapu otù nkume ma-ọli n'ebe a n'elu nkume-ibe-ya, nke anāgaghi-akwatu n'ala. Mb͕e Ọ nānọdu n'elu ugwu Olive, ndi nēso uzọ-Ya we biakute Ya iche, si, Gwa ayi, òle mb͕e ihe ndia gābu? gini gābu kwa ihe-iriba-ama nke ọbibia-Gi, na nke ọgwugwu oge a? Jisus we za, si ha, Lezienu anya ka onye ọ bula ghara iduhie unu. N'ihi na ọtutu madu gābia n'aham, si, Mu onwem bu Kraist ahu; ha gēduhie kwa ọtutu madu. Unu gāje inu okwu agha di iche iche na akukọ agha di iche iche: lenu ka unu ghara itu ujọ: n'ihi na ihe ndia aghaghi iputa; ma ọgwugwu ihe nile akērughi. N'ihi na mba gēbili imegide mba ọzọ, ala-eze gēbili kwa imegide ala-eze ọzọ: oké unwu na ala-ọma-jijiji gādi kwa n'ebe di iche iche. Ma ihe ndia nile bu nmalite ihe-nb͕u. Mb͕e ahu ka ha gārara unu nye na nkpab͕u, ha gēb͕u kwa unu: mba nile gākpọ kwa unu asì n'ihi aham. Mb͕e ahu ka ọtutu madu gāma kwa n'ọnyà, rara kwa ibe-ha nye, kpọ kwa ibe-ha asì. Ọtutu ndi-amuma ugha gēbili kwa, duhie kwa ọtutu madu. N'ihi na ihe nēmebi iwu gāba uba, ihu-n'anya nke ndi ka n'etiti madu gāju kwa oyi. Ma onye were ntachi-obi nọgide rue ọgwugwu ihe nile, onye ahu ka agāzọputa. Agēkwusa kwa ozi ọma nka nke ala-eze elu-igwe n'elu-uwa dum madu bi, ka ọ buru àmà nye mba nile; mb͕e ahu ka ọgwugwu ihe nile gēru kwa. Ya mere, mb͕e ọ bula unu gāhu ihe-árú nke nākpata itọb͕ọrọ-n'efu, nke ekwuru site n'ọnu Daniel onye-amuma, ka ọ nēguzo n'ebe nsọ unu (onye nāgu, ya tugharia uche), mb͕e ahu ndi nọ na Judia, ka ha b͕alaga n'ugwu: onye nọ n'elu ulo, ya ghara iridata ikwapu ihe di n'ulo-ya: onye nọ kwa n'ubi, ya ghara ilaghachi ichiri uwe uku ya. Ma ahuhu gādiri ndi di ime na ndi nēnye nwa ara na mb͕e ahu. Ma kpenu ekpere ka nb͕apu-unu ghara idi na mb͕e oyi, ma-ọbu n'ubọchi-izu-ike: n'ihi na mb͕e ahu ka nkpab͕u uku gādi, nke ihe dika ya akādighi site na nmalite uwa rue mb͕e a, é-è, ọ gaghi-adi kwa ma-ọli. Ọ buru kwa na emeghi ubọchi ahu ka ha di nkpirikpi, agaghi-azọputa madu ọ bula: ma n'ihi ndi arọputara agēme ka ubọchi ahu di nkpirikpi. Mb͕e ahu ọ buru na onye ọ bula gāsi unu, Le, Kraist nọ n'ebe a, ma-ọbu, N'ebe a; unu ekwela. N'ihi na Kraist ugha di iche iche na ndi-amuma ugha gēbili, gosi kwa ihe-iriba-ama uku di iche iche na ọlu-ebube uku di iche iche; iduhie ọbuná ndi arọputara, ma ọ buru na ọ gēkwe me. Le, agwawom unu mb͕e akēmeghi ya. Ya mere, ọ buru na ha gāsi unu, Le, Ọ nọ n'ọhia; unu apula: Le, Ọ nọ n'ime-ulo; unu ekwela. N'ihi na dika àmùmà si n'Ọwuwa-anyanwu puta, gosi kwa onwe-ya rue Ọdida-anyanwu; otú a ka ọbibia Nwa nke madu gādi. Ebe ọ bula ozu di, n'ebe ahu ka udele gēzukọ.

MATIU 24:1-28 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Mgbe Jisọs si nʼụlọnsọ ahụ na-apụ, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya na-achọ igosi ya akụkụ dị iche iche nke ụlọnsọ ukwu ahụ. Ma ọ zara ha sị, “Unu hụrụ ihe ndị a niile? Nʼezie agwa m unu, oge na-abịa mgbe ọ bụladị otu nkume na-agaghị adịgidekwa nʼelu ibe ya, nke a na-agaghị akwatu nʼala.” Mgbe ọ nọdụrụ ala nʼelu Ugwu Oliv, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya iche, sị, “Gwa anyị, olee mgbe ihe ndị a ga-emezu? Gịnị ga-abụkwa ihe ịrịbama nke oge i ji alọghachi na nke ọgwụgwụ ụwa a?” Jisọs zara ha sị, “Lezienụ anya ka onye ọbụla ghara iduhie unu ụzọ. Nʼihi na ọtụtụ ga-abịa nʼaha m, na-ekwu sị, ‘Abụ m Kraịst ahụ.’ Ha ga-eduhiekwa ọtụtụ ndị ụzọ. Mgbe unu nụrụ ụzụ agha, na akụkọ agha dị iche iche, unu atụla egwu, nʼihi na ihe ndị a aghaghị ime. Ma ha anaghị egosi na ọgwụgwụ oge eruola. Mba ga-ebili megide mba ibe ya, alaeze ga-ebilikwa megide alaeze ọzọ; oke ụnwụ, na ala ọma jijiji ga-adịkwa nʼọtụtụ ebe dị iche iche. Ma ihe ndị a niile bụ naanị mmalite ịta ahụhụ nke ga-abịa. “Mgbe ahụ ha ga-arara unu nyefee nʼaka ndị ga-ata unu ahụhụ. Ha ga-egbukwa unu. Mba niile ga-akpọ unu asị nʼihi m. Ọtụtụ ga-ada site nʼokwukwe ha nʼoge ahụ. Ha ga-emekwa ka ibe ha ma nʼọnya, kpọọkwa ibe ha asị. Mgbe ahụ ọtụtụ ndị amụma ụgha ga-apụta. Ha ga-eduhiekwa ọtụtụ mmadụ. Nʼihi na ajọ omume bara ụba nʼebe niile, ịhụnanya ọtụtụ ndị mmadụ nʼebe ibe ha nọ ga-ajụ oyi. Ma onye ga-eguzosi ike ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta. A ga-ekwusa oziọma nke alaeze ahụ nye ụwa niile ka ọ bụrụ ihe ama nye mba niile. Emesịa ọgwụgwụ oge ahụ ga-abịa. “Ya mere, mgbe unu hụrụ ihe arụ nke na-eweta mbibi, nke e kwuru okwu ya site nʼọnụ Daniel onye amụma, ka ọ na-eguzo nʼebe nsọ (onye na-agụ ya nwee nghọta ihe ọ pụtara). Mgbe ahụ, ka ndị nọ na Judịa were ọsọ gbalaga nʼelu ugwu. Ka onye nọ nʼelu ụlọ ghara ịrịdata ka ọ banye nʼime ụlọ ya, ịkwapụta ngwongwo dị nʼime ụlọ ya. Ka onye nọ nʼubi ghara ịlọghachi nʼụlọ ya ịchịrị uwe ya. Ma ịta ahụhụ ga-adịrị ndị nwanyị di ime, na ndị na-enye ụmụaka ara nʼụbọchị ahụ Kpesienụ ekpere ike ka unu ghara ịgba ọsọ a nʼoge oke oyi, maọbụ nʼụbọchị izuike. Nʼihi na oke mkpagbu ga-adị, ụdị nke ụwa na-ahụbeghị mbụ, na nke anya na-agaghị ahụkwa ọzọ site na mmalite ụwa ruo mgbe ahụ. “Ọ bụrụ na-emeghị ka ụbọchị ndị ahụ dị mkpụmkpụ, o nweghị onye a ga-azọpụta, ma nʼihi ndị ya ọ họpụtara, ụbọchị ndị ahụ ga-adị mkpụmkpụ. Mgbe ahụ, ọ bụrụ na onye ọbụla asị unu, ‘Lee, Kraịst nọ nʼebe a,’ maọbụ, ‘Lee ya nʼebe ahụ,’ unu ekwela. Nʼihi na ndị nzọpụta ụgha na ndị amụma ụgha ga-apụta. Ha ga-eme ihe oke ịrịbama na ọrụ ebube dị iche iche. Ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee, ha ga-esite nʼọrụ ebube ha ga-arụ duhie, ọ bụladị ndị ahụ a họpụtara. Lee, agwala m unu ihe ndị a, mgbe ha na-emebeghị. “Ya mere, ọ bụrụ na ha asị unu, ‘Lee, ọ nọ nʼime ọzara,’ unu agakwala. Ọ bụrụkwa na ha asị unu, ‘Lee, ọ nọ nʼime ime ụlọ,’ unu ekwela. Nʼihi na ọbịbịa Nwa nke Mmadụ ga-adị ka amụma na-egbu nʼọwụwa anyanwụ nke a na-ahụ anya nʼọdịda anyanwụ. Matakwanụ na ebe ọbụla ozu dị, nʼebe ahụ ka udele na-ezukọta.