Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

MATIU 23:23-39

MATIU 23:23-39 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

“E, ahụhụ ga-adakwasị unu ndị Farisii na ndị ozizi iwu. Ndị ihu abụọ! Nʼihi na unu na-asa anya unu mmiri nye, ọ bụladị onyinye otu ụzọ nʼime ụzọ iri unu ruo nʼakwụkwọ nri dịkarịsịrị nta dị nʼubi unu, dịka mint, diil na kumin, ma unu akpọghị ikpe ziri ezi na ebere, na okwukwe ihe dị mkpa. Ihe ndị a ka unu kwesiri ibu ụzọ mee ma gharakwa ileghara iwu ndị ọzọ anya. Ndị ndu kpuru ìsì! Unu na-azapụ ijiji site na mmanya unu na-aṅụ, ma unu na-eloda ịnyịnya kamel. “Ahụhụ ga-adakwasị unu, ndị Farisii na ndị ozizi iwu, ndị ihu abụọ! Nʼihi na unu na-elezi anya nke ọma mee ka azụ iko mmiri unu, na azụ efere unu dị ọcha, ma ime ha jupụtara na ịpụnarị mmadụ ihe nʼike na ọchịchọ ọjọọ niile. Gị onye Farisii kpuru ìsì! Buru ụzọ mee ka ime iko dị ọcha, mgbe ahụ azụ ya ga-adịkwa ọcha. “Ahụhụ ga-adịrị unu ndị Farisii na ndị ozizi iwu, ndị ihu abụọ! Nʼihi na unu yiri ili e tere nzu, nke na-egosi onwe ya dị ka ihe mara mma, ma ime ya jupụtara nʼọkpụkpụ ndị nwụrụ anwụ, na ihe niile na-adịghị ọcha. Nʼụzọ dị otu a, unu na-egosi onwe unu dị ka ndị ezi omume, ma nʼime unu, unu jupụtara nʼihu abụọ na ndị ajọ omume. “E, ahụhụ ga-adịrị unu ndị Farisii na ndị ozizi iwu, ndị ihu abụọ! Nʼihi na unu na-ewu ili ndị amụma na-ewerekwa ihe ịchọ mma na-edozi nkume ncheta ndị ezi omume. Unu na-asịkwa, ọ bụrụ na anyị nọ nʼoge nna anyị ha, anyị agaraghị eso ha wufuo ọbara ndị amụma. Site nʼụzọ dị otu a, unu na-agba akaebe megide onwe unu na unu bụ ụmụ ndị gburu ndị amụma. Gaanụ sorokwa nzọ ụkwụ nna unu ha, ka unu rụzuo ọrụ ahụ ha malitere. “Ụmụ agwọ! Ụmụ ajụala! Unu si aṅaa chee na unu ga-agbanarị ikpe nke ịba nʼọkụ ala mmụọ? Ya mere, aga m ezitere unu ndị amụma, ndị amamihe na ndị nkuzi. Ụfọdụ nʼime ha ka unu ga-egbu, ụfọdụ ka unu ga-akpọgide nʼobe, ndị ọzọkwa ka unu ga-apịa ihe nʼụlọ nzukọ unu. Unu ga-achụkwa ha ọsọ site nʼotu obodo gaa nʼobodo ọzọ. Ka ọgbọ a bụrụ ndị ikpe mara nʼihi ọbara nke ndị ezi omume niile e gburu nʼụwa, site nʼọbara Ebel ruo na nke Zekaraya nwa Berekaya, onye unu gburu nʼetiti ụlọnsọ nʼebe ịchụ aja unu. Nʼezie agwa m unu, ihe ndị a niile, ga-abịakwasị ọgbọ a. “O Jerusalem, Jerusalem! Gị obodo na-egbu ndị amụma, na nke na-atụ ndị niile e ziteere gị nkume. Ugboro ole ka m chọrọ ịchịkọta ụmụ gị dị ka nne ọkụkụ si achịkọta ụmụ ya nʼokpuru nku ya ichebe ha? Ma ị chọghị ka m mee otu a! Lee, a hapụrụla unu ụlọ unu ka ọ tọgbọrọ nʼefu. Nʼihi na asị m unu, unu agaghị ahụ m anya ọzọ tutu ruo mgbe unu ga-asị, Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị.   ”

MATIU 23:23-39 Bible Nso (IGBOB)

Ahuhu gādiri unu, ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi, ndi-iru-abua; n'ihi na unu nēnye otù uzọ n'uzọ iri nke nkpa-akwukwọ nēsì ísì utọ na anise na cummin, unu arapuwo kwa ihe ka arọ́ n'iwu, bú ikpé, na ebere, na okwukwe: ma ọ di nkpà ka unu me ihe ndia, ka unu ghara kwa irapu ihe ahu. Ndi-ndú ìsì, ndi nāzapu anwu ntà, ma unu nēloda camel. Ahuhu gādiri unu, ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi, ndi-iru-abua; n'ihi na unu nēme ka azu iko na afere di ọcha, ma n'ime ha juputara site n'ipunara madu ihe na ejideghi-onwe-unu. Gi Farisi kpuru ìsì, buru uzọ me ka ime iko na afere di ọcha, ka azu-ha we ghọ kwa ọcha. Ahuhu gādiri unu, ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi, ndi-iru-abua; n'ihi na unu yiri ili eteworo nzu, nke nēgosi onwe-ha dika ihe ọma n'ìhè, ma n'ime ha juputara n'ọkpukpu nke ndi nwuru anwu, na adighi-ọcha nile. Otú a unu onwe-unu nēgosi kwa onwe-unu nye madu n'ìhè dika ndi ezi omume, ma n'ime unu juputara n'iru-abua na ihe nēmebi iwu. Ahuhu gādiri unu, ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi, ndi-iru-abua; n'ihi na unu nēwu ílì ndi-amuma, nēdozi kwa ebe anēlì ndi ezi omume, unu nāsi kwa, Ọ buru na ayi nọri n'ubọchi nna-ayi-hà, ayi agaghi-eso ha n'inwekọ ọbara ndi-amuma. Ya mere unu nāb͕a àmà megide onwe-unu, na unu bu umu nke ndi b͕uru ndi-amuma. Unu onwe-unu mezu kwa ihe-ọtùtù nke nna-unu-hà. Unu agwọ, unu aju-ala, ùnu gēsi aṅa b͕anari ikpé nke ọku ala-mọ? N'ihi nka, le, Mu onwem nēzitere unu ndi-amuma, na ndi-amam-ihe, na ndi-ode-akwukwọ: ufọdu nime ha ka unu gēb͕u, kpọgide kwa ha n'obe; ufọdu nime ha ka unu gāpia kwa ihe n'ulo-nzukọ-unu, si kwa n'otù obodo nēsob͕u ha ga obodo ọzọ: ka ọbara ndi ezi omume nile awusiworo n'elu uwa we biakwasi unu, site n'ọbara Ebel onye ezi omume ahu rue ọbara Zakaraia nwa Barakaia, onye unu b͕uru n'ab͕ata ulo nsọ na ebe-ichu-àjà-unu. N'ezie asim unu, ihe ndia nile gābiakwasi ọb͕ọ a. Jerusalem, Jerusalem, nke nēb͕u ndi-amuma, nke nēwere kwa nkume atu ndi eziteworo ya! ọ̀tutu mb͕e ole ka M'chọrọ ichikọ umu-gi, ọbuná dika nneku-ọkuku nāchikọ umu-ya n'okpuru nkù-ya abua, ma unu achọghi! Le, anārapuru unu ulo-unu ka ọ tọb͕ọrọ n'efu. N'ihi na asim unu, Unu agaghi-ahum ọzọ site n'ub͕u a ma-ọli, rue mb͕e unu gāsi, Onye agọziri agọzi ka Onye ahu bu Nke nābia n'aha Onye-nwe-ayi.