MATIU 23:1-12
MATIU 23:1-12 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ahụ Jisọs gwara igwe mmadụ ahụ niile na ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ndị ozizi iwu na ndị Farisii na-anọ nʼoche Mosis. Ya mere, meenụ ma na-edebekwanụ ihe niile ha na-agwa unu. Ma unu esokwala omume ha. Nʼihi na ha adịghị eme ihe ha na-ekwusa. Ha na-ekwu otu ihe ma na-eme ihe ọzọ. Ha na-eke ibu dị arọ dịkwa ike obubu bokwasị ndị ọzọ nʼubu, ma ha onwe ha agaghị eweli ọ bụladị otu mkpịsịaka i buli ha. “Ihe niile ha na-eme bụ ka ndị mmadụ hụ ha. Ha na-eme ka igbe nta e tinyere iwu ndị dị mkpa e depụtara nke ha na-ekekwasị nʼegedege ihu na nʼaka dị obosara na-emekwa ka ọnụnụ uwe ha buo ibu. Ha hụrụ ịnọ nʼisi oche nʼoge mmemme oriri ọbụla na ịnọkwasị nʼoche kachasị elu nʼụlọ ekpere nʼanya. Ọ na-amasị ha mgbe a na-ekele ha ekele pụrụ iche nʼọma ahịa, ndị ọzọ a na-akpọkwa ha, ‘Onye ozizi.’ “Unu ekwela ka onye ọbụla kpọọ unu ‘Onye ozizi,’ nʼihi na unu nwere naanị otu Onye ozizi. Unu niile bụkwa ụmụnne. Ọ dịghị onye ka ibe ya ukwuu. Unu akpọkwala onye ọbụla nʼụwa a ‘Nna,’ nʼihi na unu nwere otu Nna nke bi nʼeluigwe. Unu ekwela ka a kpọọ unu ndị ndu, nʼihi na ọ bụ naanị otu onyendu ka unu nwere, ya bụ Kraịst. Onye dị ukwuu nʼetiti unu ga-abụ onye na-ejere unu ozi. Nʼihi na onye ọbụla ga-ebuli onwe ya elu ka a ga-eweda nʼala. Ma onye ọbụla wedara onwe ya ala, ka a ga-ebuli elu.”
MATIU 23:1-12 Bible Nso (IGBOB)
Mb͕e ahu Jisus gwara ìgwè madu nile na ndi nēso uzọ-Ya okwu, si, N'oche Moses ka ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi nọduru: ya mere, ihe nile, ka ha ra, bú nke ha gāsi unu me, menu ihe ndia, debe kwa ha: ma unu emela dika ọlu nile ha si di; n'ihi na ha nēkwu, ma ha adighi-eme. Ma ha nēke ibu di arọ́ di kwa ike obubu, tukwasi ha n'ubu madu; ma ha onwe-ha achọghi iji otù nkpisi-aka-ha wezuga ha. Ma ọlu-ha nile ka ha nālu ka madu we kiri ha: n'ihi na ha nēme ka phylactery nile ha di obosara, me kwa ka ọnu-ọnu uwe-ha di uku, ha nāhu kwa isi ọnọdu nile n'oriri nile unu n'anya, na isi oche nile n'ulo-nzukọ-unu, na ekele n'ọma-ahia nile unu, na ka madu nākpọ ha, Rabai. Ma ka aghara ikpọ unu onwe-unu, Rabai: n'ihi na otù Onye bu Onye-ozizí-unu, ma unu onwe-unu nile bu umu-nna. Unu akpọ-kwa-la onye ọ bula nna-unu n'elu uwa: n'ihi na otù Onye bu Nna-unu, Ya bu Onye nke elu-igwe. Ka aghara kwa ikpọ unu ndi-ndú, n'ihi na otù Onye bu Onye-ndú-unu, Ya bu Kraist ahu. Ma onye dikariri uku n'etiti unu gābu onye nējere unu ozi. Ma onye ọ bula nke gēweli onwe-ya elu, agēweda ya; onye ọ bula nke gēweda kwa onwe-ya, agēweli ya elu.