MATIU 20:29-34
MATIU 20:29-34 Bible Nso (IGBOB)
Mb͕e ha nāputa na Jeriko, oké ìgwè madu we so Ya. Ma le, ndi-ìsì abua ndi nānọdu n'akuku uzọ, mb͕e ha nuru na Jisus nāgabiga, ha tie nkpu, si, Onye-nwe-ayi, mere ayi ebere, Nwa Devid. Ìgwè madu ahu we bara ha nba, ka ha kpuchie ọnu-ha: ma ha tikariri nkpu, si, Onye-nwe-ayi, mere ayi ebere, Nwa Devid. Jisus we guzo, kpọ ha, we si, Gini ka unu nāchọ ka M'mere unu? Ha si Ya, Onye-nwe-ayi, ka ewe meghe anya-ayi. Ma Jisus, ebe O nwere ọmiko n'aru-ha, O we metu anya-ha aka: ngwa ngwa ewe me ka ha hu uzọ, ha we so Ya.
MATIU 20:29-34 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ha na-ahapụ Jeriko, ọtụtụ igwe mmadụ sooro ya nʼazụ. Ndị ìsì abụọ nọ nʼakụkụ ụzọ ahụ. Mgbe ha nụrụ na ọ bụ Jisọs na-abịa, ha malitere iti mkpu nʼoke olu na-asị, “Onyenwe anyị, Nwa Devid, meere anyị ebere!” Igwe mmadụ ahụ baara ha mba ka ha mechie ọnụ ha. Ma ndịisi ahụ nọgidesịrị ike na-eti mkpu nʼoke olu na-asị, “Onyenwe anyị, Nwa Devid, meere anyị ebere!” Mgbe Jisọs bịaruru nʼebe ha nọ, o guzoro kpọọ ha, jụọ ha sị, “Gịnị ka unu chọrọ ka m meere unu?” Ha zara sị ya, “Onyenwe anyị, biko, anyị chọrọ ka i mee ka anyị hụ ụzọ.” Jisọs nwere ọmịiko nʼahụ ha. O metụrụ ha aka nʼanya. Ngwangwa ha bidoro ịhụ ụzọ, ma sorokwa ya.