MATIU 19:13-15
MATIU 19:13-15 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ahụ e kuteere ya ụmụntakịrị ka o bikwasị ha aka, kpeekwara ha ekpere. Ma ndị na-eso ụzọ ya baara ndị kutere ha mba. Ma Jisọs sịrị ha, “Kweenụ ka ụmụntakịrị bịakwute m, unu egbochikwala ha. Nʼihi na alaeze eluigwe bụ nke ndị dị otu a.” O bikwasịrị ha aka nʼisi gọzie ha niile tupu ọ hapụ ha pụọ.
Kesaa
Gụọ MATIU 19MATIU 19:13-15 Bible Nso (IGBOB)
Mb͕e ahu ekutara Ya umu-ntakiri, ka O we bikwasi ha aka-Ya abua, kpe kwa ekpere: ma ndi nēso uzọ-Ya bara ha nba. Ma Jisus siri, Kwenu ka umu-ntakiri biakutem, unu eb͕ochi-kwa-la ha: n'ihi na ala-eze elu-igwe bu nke ndi di otú a. O we bikwasi ha aka-Ya abua, si n'ebe ahu pua.
Kesaa
Gụọ MATIU 19