Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

MATIU 19:1-30

MATIU 19:1-30 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Mgbe Jisọs kwusiri okwu ndị a, o hapụrụ Galili gaa na mpaghara Judịa, nke dị nʼofe osimiri Jọdan. Igwe mmadụ dị ukwuu sooro ya. Ọ gwọkwara ndị ahụ na-esighị ike nʼetiti ha nʼebe ahụ. Ụfọdụ ndị Farisii bịakwutere ya i nwalee ya, sị, “O ziri ezi nʼiwu na nwoke ga-agbara nwunye ya alụkwaghị m nʼihi ihe ọbụla?” Ọ zara ha sị, “Ọ bụ na unu agụtabeghị na akwụkwọ nsọ, na Onye kere ha na mbụ kere ha nwoke na nwanyị. Nʼihi nke a ka nwoke ga-eji hapụ nne ya na nna ya e jikọta ya na nwunye ya. Ha abụọ ga-abụkwa otu anụ ahụ. Ya mere, ha abụkwaghị mmadụ abụọ ọzọ, kama otu anụ ahụ. Ya mere, ihe Chineke jikọtara, ka mmadụ ọbụla atọsala ya.” Ha jụrụ ya sị, “Gịnị mekwaranụ Mosis ji nye iwu si na nwoke ọbụla nwere ohere ide akwụkwọ alụkwaghị m nye nwunye ya?” Ọ zara ha sị ha, “Ọ bụ nʼihi na unu bụ ndị mkpọchi obi, ya mere Mosis jiri hapụ unu ka unu gbaa nwunye unu alụkwaghị m; ma ọ dịghị otu a site na mbụ. Ma ana m asị unu, onye ọbụla ga-ahapụ nwunye ya lụrụ onye ọzọ, ma ọ bụghị nʼihi na o jidere nwunye ya na mmehie ịkwa iko, onye ahụ emeela mmehie ịkwa iko ma ọ lụọ nwanyị ọzọ.” Ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya, “Ọ bụrụ na o si otu a dịrị, ọ ka mma na mmadụ alụghị nwunye ma ọlị.” Ma ọ zara sị ha, “Ọ bụghị mmadụ niile ga-anagide okwu a. Naanị ndị e nyere ike ime ya ga-anagide ya. Ma ụfọdụ ndị mmadụ ka a mụrụ ka ha bụrụ onozi, ndị ọzọ bụkwa ndị mmadụ ibe ha mere otu a. Ndị ọzọ dịkwa ndị jiri aka ha họrọ ibu onozi nʼihi alaeze eluigwe. Onye pụrụ ịnara nke a, ya nara ya.” Mgbe ahụ e kuteere ya ụmụntakịrị ka o bikwasị ha aka, kpeekwara ha ekpere. Ma ndị na-eso ụzọ ya baara ndị kutere ha mba. Ma Jisọs sịrị ha, “Kweenụ ka ụmụntakịrị bịakwute m, unu egbochikwala ha. Nʼihi na alaeze eluigwe bụ nke ndị dị otu a.” O bikwasịrị ha aka nʼisi gọzie ha niile tupu ọ hapụ ha pụọ. Otu onye bịakwutere ya, jụọ ya ajụjụ sị, “Ezi onye ozizi, olee ezi ihe m ga-eme ka m keta ndụ ebighị ebi?” Jisọs sịrị ya, “Gịnị mere i ji ajụ m ajụjụ banyere ihe bụ ezi ihe? Ọ dị naanị otu onye nke bụ ezi mmadụ. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịba nʼime ndụ ahụ, debe iwu niile e nyere.” Ọ jụrụ ya ajụjụ sị, “Olee iwu ndị m ga-edebe?” Jisọs zara ya, “ ‘Egbula mmadụ, akwala iko, ezula ohi, ekwula okwu ụgha. Sọpụrụ nne gị na nna gị. Ọzọ, hụkwa onye agbataobi gị nʼanya dị ka onwe gị.’” Nwokorobịa ahụ sịrị ya, “Edebezuchaala m iwu ndị a siterịị na mgbe m dị na nwata. Gịnị ọzọ fọdụụrụ m ime?” Jisọs zara sị ya, “Ọ bụrụ na ị chọrọ ịbụ onye zuruoke nʼezie, laa nʼụlọ gị ree ihe niile i nwere, nyekwa ndị ogbenye ego i retara. Ị ga-enwe akụ nʼeluigwe, mgbe ahụ, bịakwa soro m.” Mgbe nwokorobịa ahụ nụrụ okwu a, ọ lara na mwute, nʼihi na ọ bụ ọgaranya. Mgbe ahụ Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Nʼezie agwa m unu, ọ bụ nnọọ ihe siri ike na onye ọgaranya ga-abanye nʼalaeze eluigwe. Ọzọkwa, asị m unu, ọ dịịrị ịnyịnya kamel mfe ịgafe nʼanya agịga, karịa ọgaranya ịbanye nʼalaeze Chineke.” Okwu a o kwuru tụrụ ndị na-eso ụzọ ya nʼanya. Ha sịrị, “Ọ bụrụ na o si otu a dịrị, onye kwanụ ka a ga-azọpụta?” Jisọs legidere ha anya sị ha, “Nʼebe mmadụ nọ nke a bụ ihe a na-apụghị ime, ma ọ dịghị ihe rara ahụ ime nʼebe Chineke nọ.” Mgbe ahụ Pita jụrụ ya sị, “Lee, anyị ahapụla ihe niile soro gị, gịnị ga-abụ ụgwọ ọrụ anyị?” Jisọs zara sị ya, “Nʼezie agwa m unu, mgbe a ga-agbanwe ihe niile, mgbe Nwa nke Mmadụ ga-anọkwasị nʼelu ocheeze ebube ya, nʼalaeze ahụ, nʼezie, unu bụ ndị na-eso ụzọ m ga-anọkwasị nʼocheeze iri na abụọ ahụ, na-ekpe ebo iri na abụọ nke Izrel ikpe. Onye ọbụla hapụrụ ụlọ ya, na ụmụnne ya nwoke, na ụmụnne ya nwanyị, na nne ya na nna ya, na ụmụntakịrị ya, maọbụ ala o nwere, soro m, ga-anata dị ka ụgwọ ọrụ okpukpu narị ihe ọ hapụrụ, natakwa alaeze. Ọ ga-eketakwa ndụ ebighị ebi. Ma ọtụtụ ndị bu ụzọ ga-abụ ndị ikpeazụ, ma ndị ikpeazụ ga-abụkwa ndị bu ụzọ.”

MATIU 19:1-30 Bible Nso (IGBOB)

O rue, mb͕e Jisus kwubìri okwu ndia, O si na Galili zọlie, bia n'ókè-ala Judia n'ofè Jọdan; oké ìgwè madu we so Ya; O we me ka aru-ha di ike n'ebe ahu. Ndi-Farisi we biakute Ya, nānwa Ya, si, Ò ziri ezi n'iwu ka nwoke rapu nwunye-ya n'ihi ihe nile ọ bula? O we za, si, Ùnu agughi na Onye kère ha site na nmalite mere ha nwoke na nwayi, we si, N'ihi nka ka nwoke gārapu nna-ya na nne-ya, rapara n'aru nwunye-ya; ha abua ewe ghọ otù anu-aru? Ya mere ha abughi kwa madu abua ọzọ, kama ọ bu otù anu-aru. Ya mere, ihe Chineke kekọtara, madu atọsala. Ha si Ya, Gini kwa ka Moses ji nye iwu inye akwukwọ nkewa, na irapu ya? Ọ si ha, Ọ bu n'ihi obi-etili-unu ka Moses kwere ka unu rapu nwunye-unu: ma site na nmalite adighi-eme otú a. Ma asim unu, Onye ọ bula nke gārapu nwunye-ya, ma-ọbughi n'ihi ikwa-iko, luru kwa nwunye ọzọ, ọ nākwa iko: onye nke gālu nwanyi ahu mb͕e arapuworo ya nākwa kwa iko. Ndi nēso uzọ-Ya si Ya, Ọ buru na okwu di otú a n'etiti nwoke na nwunye-ya, ọ baghi urù ilu nwunye. Ma Ọ siri ha, Ọ bughi madu nile nānagide okwu a, kama ọ bu ndi enyeworo ya. N'ihi na ndi-onozi di, ndi amuru otú a site n'afọ nne-ha: ndi-onozi di kwa, ndi emere onozi site n'aka madu: ndi-onozi di kwa, ndi mere onwe-ha onozi n'ihi ala-eze elu-igwe. Onye puru inagide ya, ya nagide. Mb͕e ahu ekutara Ya umu-ntakiri, ka O we bikwasi ha aka-Ya abua, kpe kwa ekpere: ma ndi nēso uzọ-Ya bara ha nba. Ma Jisus siri, Kwenu ka umu-ntakiri biakutem, unu eb͕ochi-kwa-la ha: n'ihi na ala-eze elu-igwe bu nke ndi di otú a. O we bikwasi ha aka-Ya abua, si n'ebe ahu pua. Ma le, otù onye biakutere Ya, si, Onye-ozizí, ọ̀ bu ezi ihe gini ka m'gēme, ka m'we nwe ndu ebighi-ebi? Ma Ọ siri ya, Gini mere i nājum ajuju bayere nke bu ezi ihe? Otù Onye di Nke bu ezi Onye: ma ọ buru na i nāchọ ibà nime ndu ahu, debe ihe nile enyere n'iwu. Ọ si Ya, Òle? Jisus we si, Eb͕ula madu, Akwala iko, Ezula ori, Ab͕ala àmà ugha, Sọpuru nna-gi na nne-gi: na, Hu onye-ab͕ata-obi-gi n'anya dika onwe-gi. Nwa-okorọbia ahu si Ya, Ihe ndia nile ka m'ribara ama: gini fọdurum ọzọ ime? Jisus siri ya, Ọ buru na i nāchọ ka i zue okè, laba, re ihe nile i nwere, nye ndi-ob͕eye, i gēnwe kwa àkù n'elu-igwe: bia kwa, som. Ma mb͕e nwa-okorọbia ahu nuru okwu a, ọ lara na nwuta: n'ihi na ọ bu onye nwere ihe ri nne. Jisus we si ndi nēso uzọ-Ya, N'ezie asim unu, Ọ diri ọgaranya ike ibà n'ala-eze elu-igwe. Ọzọ kwa, asim unu, Ọ dikarari camel nfé igabiga n'anya àgìgá, kari ọgaranya ibà n'ala-eze Chineke. Ma mb͕e ndi nēso uzọ-Ya nuru ya, ibobo nwuru ha n'aru ri nne, ha si, Ònye kwa ka apuru izọputa? Ma Jisus lere ha anya, si ha, N'ebe madu nọ nka bu ihe anāpughi ime; ma apuru ime ihe nile n'ebe Chineke nọ. Mb͕e ahu Pita zara, si Ya, Le, ayi onwe-ayi rapuru ihe nile, we so Gi; gini kwa ka ayi gēnwe? Jisus we si ha, N'ezie asim unu, na unu onwe-unu ndi sorom, n'imu-ọzọ ahu, mb͕e ọ bula Nwa nke madu gānọkwasi n'oche-eze nke ebube-Ya, unu onwe-unu gānọkwasi kwa n'oche-eze iri na abua, nēkpe ebo iri na abua nke Israel ikpé. Ọzọ, onye ọ bula nke rapuru ulo, ma-ọbu umu-nne ndikom, ma-ọbu umu-nne ndinyom, ma-ọbu nna, ma-ọbu nne, ma-ọbu umu, ma-ọbu ubi, n'ihi aham, ọ gānata ọgu ise ọgu ise, keta kwa ndu ebighi-ebi. Ma ọtutu ndi bu uzọ gābu ndi-ikpe-azu; ndi ikpe-azu gābu kwa ndi bu uzọ.