MATIU 18:28-33
MATIU 18:28-33 Bible Nso (IGBOB)
Ma orù ahu puru, hu otù nime ndi-orù-ibe-ya, nke ji ya ọgu shilling ise: o we jidesie ya aka ike, ri ya aka n'akpiri, si, Kwughachim ihe i ji. Ya mere orù-ibe-ya dara n'ala, riọ ya, si, Nwe ogologo-ntachi-obi n'arum, na m'gākwughachi gi. Ma ọ chọgh: kama o jere tubà ya n'ulo-nkpọrọ, rue mb͕e ọ gākwughachi ihe o ji. Ya mere mb͕e ndi-orù-ibe-ya huru ihe emere, o wuta ha ri nne n'obi, ha we bia kọrọ onye-nwe-ha ihe nile mere. Mb͕e ahu onye-nwe-ya kpọrọ ya biakute ya, si ya, Ajọ orù, ab͕agharam i ugwọ ahu nile, n'ihi na i riọrọm: ọ̀ kwesighi kwa gi imere orù-ibe-gi ebere ọbuná dika mu onwem mere gi ebere?
MATIU 18:28-33 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“Ma mgbe ohu ahụ sitere nʼebe ahụ pụọ, ọ hụrụ otu ohu ibe ya ji ya ụgwọ otu narị denarị. O jidere ya nʼaka ike, machie ya aka nʼakpịrị, sị ya, ‘Kwụghachi m ụgwọ i ji m ugbu a.’ “Ya mere, ohu ibe ya ahụ dara nʼala nʼihu ya rịọọ ya ka o nye ya nwantịntị oge. Ọ rịọkwara ya sị, ‘Enyi m, biko nwee ntachiobi, aga m akwụghachi gị ụgwọ m ji gị.’ “Ma o kwenyeghị, kama ọ gara tụba ya nʼụlọ mkpọrọ, ebe ọ ga-anọ ruo mgbe ọ kwụsịrị ụgwọ niile o ji ya. Mgbe ndị ohu ibe ya hụrụ ihe mere, o wutere ha nke ukwuu. Ha jekwuru Nna ha ukwu kọọrọ ya ihe niile ndị a. “Nʼihi nke a Nna ya ukwu kpọrọ ohu ahụ sị ya, ‘Ohu obi ọjọọ! Agbaghara m gị ụgwọ ahụ niile i ji, nʼihi na ị rịọrọ m arịrịọ. Ọ bụ na ị kwesighị inwe obi ebere nʼebe ohu ibe gị nọ, dị ka m si mere gị ebere?’