MATIU 17:1-3
MATIU 17:1-3 Bible Nso (IGBOB)
Mb͕e ubọchi isi gasiri Jisus chiri Pita, na Jemes, na Jọn nwa-nne-ya, tiyere Onwe-ya, O kuru ha rigo n'ugwu di elu we pua iche: O we nwogha n'iru ha: iru-Ya we nēnwupu dika anyanwu, uwe-Ya nile we nācha ucha dika ìhè. Ma le, eme ka ha hu Moses na Elaija ka ha na Ya nēkwurita okwu.
Kesaa
Gụọ MATIU 17MATIU 17:1-3 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ụbọchị isii gasịrị, Jisọs kpọọrọ Pita, na Jemis na Jọn nwanne ya, rigoro nʼugwu dị elu ebe naanị ha nọdụrụ. Nʼebe ahụ a gbanwere ọdịdị ya nʼihu ha, ihu ya na-enwupụ dị ka anyanwụ, uwe ya chapụkwara dị ka ìhè. Nʼotu ntabi anya ahụ, ha hụrụ Mosis na Ịlaịja ka ha na ya na-ekwurịta okwu.
Kesaa
Gụọ MATIU 17