Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

MATIU 17:1-27

MATIU 17:1-27 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Mgbe ụbọchị isii gasịrị, Jisọs kpọọrọ Pita, na Jemis na Jọn nwanne ya, rigoro nʼugwu dị elu ebe naanị ha nọdụrụ. Nʼebe ahụ a gbanwere ọdịdị ya nʼihu ha, ihu ya na-enwupụ dị ka anyanwụ, uwe ya chapụkwara dị ka ìhè. Nʼotu ntabi anya ahụ, ha hụrụ Mosis na Ịlaịja ka ha na ya na-ekwurịta okwu. Mgbe ahụ Pita sịrị Jisọs, “Onyenwe anyị. Ọ dị mma ka anyị niile nọdụ nʼebe a. Ọ bụrụ na ị ga-enye m ike, aga m ewu ụlọ ikwu atọ nʼebe a. Otu nʼime ụlọ ndị a ga-abụ nke gị, otu nke Mosis, nke ọzọ nke Ịlaịja.” Mgbe ọ ka kpụ okwu nʼọnụ, igwe ojii nke na-enwu enwu kpuchiri ha, olu sitere nʼigwe ojii ahụ daa sị, “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nʼanya, onye ihe ya dị m ezi mma. Geenụ ya ntị.” Mgbe ndị na-eso ụzọ ya nụrụ olu a, ha dara nʼala nʼihi egwu. Ma Jisọs jekwuuru ha metụ ha aka sị ha, “Bilienụ, unu atụla egwu.” Mgbe ha lelitere anya ha, o nwekwaghị onye ọzọ ha hụrụ ma ọ bụghị naanị Jisọs. Ma mgbe ha si nʼelu ugwu ahụ na-arịdata, Jisọs nyere ha iwu, sị, “Unu agwala onye ọbụla ihe unu hụrụ tutu ruo mgbe Nwa nke Mmadụ ga-esi nʼọnwụ bilie.” Ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya sị, “Gịnị mere ndị ozizi iwu ji na-ekwu na Ịlaịja aghaghị ibu ụzọ bịa?” Ọ zara sị, “Ọ bụ ezie, Ịlaịja na-abịa, ọ ga-emekwa ka ihe niile dị ka ọ dị na mbụ. Ma Ịlaịja abịalarị, ma ndị mmadụ amataghị ya. Kama ndị mmadụ emeela ya ihe ọjọọ dị iche iche. Otu a kwa ka mụ onwe m bụ Nwa nke Mmadụ ga-esi ahụ ahụhụ site nʼaka ha.” Mgbe ahụ ndị na-eso ụzọ ya ghọtara na ọ bụ Jọn omee baptizim ka ọ na-ekwu banyere ya. Mgbe ha bịarutere nʼebe igwe mmadụ ahụ nọ, otu nwoke bịakwutere ya gbuo ikpere nʼihu ya, rịọọ ya sị, “Onyenwe m, biko, meere nwa m nwoke ebere, nʼihi na akwụkwụ na-adọ ya. Ọ na-ata oke ahụhụ, ọtụtụ mgbe ọ na-adaba nʼime ọkụ maọbụ nʼime mmiri. Ma ekuteere m ya ndị na-eso ụzọ gị ka ha gwọọ ya, ma ha enweghị ike ime ka ahụ dị ya mma.” Jisọs zara sị, “Unu ọgbọ a na-enweghị okwukwe, ndị na-adịghị erubekwa isi. Ruo ole mgbe ka mụ na unu ga-anọ? Ruo ole mgbe ka m ga-anọ na-anagide ekweghị ekwe unu? Kpọtaranụ m nwata ahụ nʼebe a.” Jisọs baara mmụọ ọjọọ ahụ mba, mee ka o si nʼime nwata ahụ pụta. Otu mgbe ahụ, mmụọ ọjọọ ahụ pụtara, nwata ahụ bụ onye agwọkwara nʼotu oge ahụ. Mgbe e mesịrị, ndị na-eso ụzọ Jisọs bịakwutere ya na nzuzo jụọ ya sị, “Gịnị mere o ji siere anyị ike ịchụpụ mmụọ ọjọọ ahụ?” Ọ sịrị ha, “Ọ bụ nʼihi na okwukwe unu nwere esighị ike. Nʼezie, agwa m unu, ọ bụrụ na unu e nwee okwukwe nke dị nta ka mkpụrụ mọstaadị, unu nwere ike ị sị ugwu a, ‘Site nʼebe a wezuga onwe gị,’ ọ ga-apụtakwa. Ọ dịghị ihe unu na-agaghị enwe ike ime. Ma mmụọ ọjọọ dị otu a agaghị apụ, ma ọ bụghị naanị site nʼikpe ekpere na ibu ọnụ.” Mgbe ha gbakọrọ na Galili, Jisọs gwara ha sị, “A ga-arara Nwa nke Mmadụ nye nʼaka ndị mmadụ. Ha ga-egbukwa ya, ma nʼụbọchị nke atọ a ga-eme ka o si nʼọnwụ bilie.” Nke a wutere ha nke ukwuu. Mgbe ha bịaruru na Kapanọm, ndị na-ana ụtụ nʼihi ụlọnsọ bịakwutere Pita jụọ ya sị, “Onye ozizi unu ọ dịghị atụ ụtụ ụlọnsọ?” Pita zara ha sị, “E, ọ na-atụ ụtụ.” Mgbe ọ batara nʼụlọ, Jisọs buru ụzọ jụọ ya sị, “Gịnị ka i chere banyere nke a Saimọn? Ọ bụ nʼaka ndị ole ka ndị eze ụwa si anakọta ụtụ taks? Ọ bụ nʼaka ụmụ ha, ka ọ bụ nʼaka ndị ọbịa?” Ma mgbe Pita zara ya sị, “Ọ bụ site nʼaka ndị ọbịa.” Jisọs sịrị ya, “Ọ dị mma. Iwu ejighị ndị bụ ụmụ. Ma otu ọ dị, achọghị m ka anyị mee ka iwe wee ha. Gaa nʼosimiri ahụ tụnye nko azụ gị nʼime ya. Meghe ọnụ azụ mbụ ị ga-egbute. Ị ga-ahụ otu mkpụrụ ego nʼime ọnụ ya. Were ya nye ha, ka ọ bụrụ ụtụ nke mụ na gị.”

MATIU 17:1-27 Bible Nso (IGBOB)

Mb͕e ubọchi isi gasiri Jisus chiri Pita, na Jemes, na Jọn nwa-nne-ya, tiyere Onwe-ya, O kuru ha rigo n'ugwu di elu we pua iche: O we nwogha n'iru ha: iru-Ya we nēnwupu dika anyanwu, uwe-Ya nile we nācha ucha dika ìhè. Ma le, eme ka ha hu Moses na Elaija ka ha na Ya nēkwurita okwu. Pita we za, si Jisus, Onye-nwe-ayi, ọ di nma ka ayi nọ n'ebe a: ọ buru na I nāchọ, m'gāma ulo-ikwū atọ n'ebe a; ka otù diri Gi, ka otù di-kwa-ra Moses, ka otù di-kwa-ra Elaija. Mb͕e ọ kpu okwu n'ọnu, le, igwe-oji nke nēnwu enwu kpuchiri ha: le kwa, olu si n'igwe-oji ahu puta, si, Onye a bu Ọkparam M'huru n'anya, Onye ihe-Ya dim ezi nma; nurunu okwu-Ya. Mb͕e ndi nēso uzọ-Ya nuru ya, ha we da kpuchie iru-ha n'ala, tu kwa egwu ri nne. Jisus we biakute ha, metu ha aka, si, Bilienu, unu atu-kwa-la egwu. Ma mb͕e ha weliri anya-ha elu, ha ahughi onye ọ bula, ma-ọbughi nání Jisus. Mb͕e ha si n'ugwu ahu nārida, Jisus we nye ha iwu, si, Unu agwala onye ọ bula ihe unu huru, rue mb͕e Nwa nke madu gēsi na ndi nwuru anwu bilie. Ndi nēso uzọ-Ya we jua Ya, si, Gini mere ndi-ode-akwukwọ ji si kwa na Elaija aghaghi ibu uzọ bia? O we za, si, Ọ bu ezie na Elaija nābia, Ọ gēme kwa ka ihe nile di ka ha di na mbu: ma asim unu, na Elaija abiawori ub͕u a, ha amazughi kwa ya, kama ha mere n'aru-ya ka ihe ha chọrọ ra. Ọbuná otú a ka ha gaje ime kwa ka Nwa nke madu hu ahuhu. Mb͕e ahu ndi nēso uzọ-Ya ghọtara na Ọ gwara ha okwu bayere Jọn Baptist. Mb͕e ha biakutere ìgwè madu ahu, otù nwoke we biakute Ya, nēb͕uru Ya ikperè, nāsi kwa, Onye-nwe-ayi, mere nwam nwoke ebere: n'ihi na ọ bu onye ọnwa nēme ka anya ghara idi ya nma, ọ nāhu kwa ahuhu nke-uku: n'ihi na ọtutu mb͕e ọ nādabà n'ọku, ọtutu mb͕e ọ nādabà kwa na miri. M'we kuru ya biakute ndi nēso uzọ-Gi, ma ha apughi ime ka aru-ya di ike. Jisus we za, si, Unu ọb͕ọ nēnweghi okwukwe, nke nwe-kwa-ra anya-ùhìe, rùe ole mb͕e ka Mu na unu gānọ? rùe ole mb͕e ka M'gānagide unu? unu kutaram ya n'ebe a. Jisus we bara ya nba; mọ ọjọ ahu we si nime ya puta: ewe me ka aru nwa-okoro ahu di ike site n'oge hour ahu. Mb͕e ahu ndi nēso uzọ-Ya biakutere Jisus iche, si, N'ìhi gini ka ayi onwe-ayi nāpughi ichupu ya? O we si ha, N'ihi okwukwe ntà unu: n'ihi na n'ezie asim unu, Ọ buru na unu nwere okwukwe dika nkpuru mustard, unu gāsi ugwu a, Si n'ebe a gabiga n'ebe ahu; ọ gāgabiga kwa; ihe ọ bula agaghi-adi kwa nke unu nāpughi ime. Ma otú ọ di mọ di otú a apughi iputa ma-ọbughi site n'ekpere na ibu-ọnu. Ma mb͕e ha bi na Galili, Jisus siri ha, Agaje irara Nwa nke madu nye n'aka madu; ha gēb͕u kwa Ya, ewe me ka O si n'ọnwu bilie n'ubọchi nke-atọ. O we wuta ha ri nne. Ma mb͕e ha biara na Kapanaum, ndi nānara ego ùtú biakutere Pita, si, Ònye-ozizí-unu adighi-atu ego ùtú? Ọ si, E. Mb͕e ọ batara n'ulo, Jisus we buru uzọ gwa ya okwu, si, Gini bu uche-gi, Saimon? ndi-eze uwa, sìte n'aka ole ndi ka ha nānara ùtú-ahia ma-ọbu ùtú n'isi madu? n'àka umu-ha, ma-ọbu n'aka ndi-ọbìa? Ma mb͕e ọ siri, N'aka ndi-ọbìa, Jisus si ya, Ya mere umu-ha puru nime ya. Ma, ka ayi we ghara ime ka ha ma n'ọnyà, ga rue oké osimiri, tubà nko-azù, were azù nke buru uzọ puta; mb͕e i saghesiri ọnu-ya, i gāhu kwa otù shekel: were nke ahu, nye ha ka ọ buru nke Mu na gi.