MATIU 16:1-28
MATIU 16:1-28 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ndị Farisii na ndị Sadusii bịakwutere Jisọs ịnwa ya ọnwụnwa. Ha gwara ya sị, “Gosi anyị ihe ịrịbama si nʼeluigwe.” Ọ zara ha, “Mgbe o ruru anyasị unu na-asị, ‘Ihu eluigwe ga-adị mma nʼihi na ọ na-acha uhie uhie.’ Nʼụtụtụ unu na-asị, ‘Anyị ga-enwe mmiri ozuzo taa nʼihi na ihu eluigwe na-acha uhie uhie ma na-eji oji.’ Lee na unu pụrụ ịkọwa ihu eluigwe, ma unu apụghị isite nʼihe ịrịbama ndị a unu na-ahụ anya kọwaa ihe oge a anyị nọ nʼime ya pụtara. Ajọ ọgbọ nke jupụtara nʼịkwa iko, nke na-arịọkwa ihe ịrịbama. Ọ nweghị ihe ịrịbama ọzọ a ga-egosi ya karịa ihe ịrịbama Jona.” Mgbe ahụ ọ sitere nʼebe ahụ ha nọ pụọ. Mgbe ha gafesịrị nʼofe ọzọ, ndị na-eso ụzọ ya chetara na ha ejighị achịcha ọbụla. Nʼoge ahụ kwa, Jisọs dụrụ ha ọdụ sị ha, “Lezienụ anya, ma na-ezekwa ihe ndị na-eko achịcha ndị Farisii na ndị Sadusii.” Ha malitere na-ekwurịta nʼetiti onwe ha, na-asị, ọ bụ nʼihi na anyị ewetaghị ogbe achịcha ọbụla. Ebe ọ bụ na Jisọs matara ihe ha na-eche, ọ sịrị, “Unu ndị okwukwe nta! Gịnị mere unu ji na-esogbu onwe unu nʼihi na unu enweghị achịcha? Olee mgbe unu ga-amata ihe? Ọ bụ na unu echetaghị puku mmadụ ise ahụ m jiri ogbe achịcha ise mee ka ha rijuo afọ? Ọ bụ nkata ole ka unu tụtụjuru? Unu echetakwaghị na m ji ogbe achịcha asaa zụọ puku mmadụ anọ? Iberibe achịcha juru nkata ole ka unu tụtụkọtara? Gịnị mere unu aghọtaghị na ọ bụghị ihe banyere achịcha ka m na-ekwu? Cheenụ onwe unu nche nʼebe ihe na-eko achịcha ndị Farisii na ndị Sadusii nọ.” Mgbe ahụ ka ha ghọtara na ihe ọ na-akọwara ha abụghị ihe banyere ihe na-eko achịcha nke a na-ata ata, kama ọ bụ ihe banyere ozizi ndị Farisii na ndị Sadusii. Mgbe Jisọs bịaruru obodo a na-akpọ Sizaria Filipai, ọ jụrụ ndị na-eso ụzọ ya ajụjụ sị ha, “Onye ka ndị mmadụ na-asị na Nwa nke Mmadụ bụ?” Ha zara ya sị, “Ụfọdụ na-asị na ị bụ Jọn omee baptizim, ụfọdụ na-asị na ị bụ Ịlaịja, ndị ọzọ na-asịkwa na ị bụ Jeremaya, maọbụ otu nʼime ndị amụma.” Ọ jụrụ ha sị, “Ma unu onwe unu, ọ bụ onye ka unu na-asị na m bụ?” Saimọn Pita zara sị ya, “Ị bụ Kraịst ahụ, Ọkpara Chineke dị ndụ.” Jisọs gwara ya sị, “Saimọn Pita nwa Jona, ị bụ onye a gọziri agọzi, nʼihi na anụ ahụ na ọbara ekpugheghị ya nye gị. Kama, ọ bụ Nna m bi nʼeluigwe mere ka ị mata ya. Ma mụ onwe m na-agwa gị, na gị onwe gị bụ Pita. Ọ bụkwa nʼelu nkume a ka m ga-ewu ụlọ chọọchị m. Ike niile nke ọkụ ala mmụọ apụghịkwa iguzo megide ya. Aga m enye gị mkpisi igodo alaeze eluigwe. Ihe ọbụla ị ga-eke agbụ nʼelu ụwa, ka a ga-ekekwa agbụ nʼeluigwe. Ihe ọbụla ị ga-atọpụ nʼagbụ nʼụwa, a ga-atọpụkwa ya nʼeluigwe.” Mgbe ahụ, o nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha ghara ime ka onye ọbụla mata na ya bụ Kraịst ahụ. Site nʼoge ahụ Jisọs malitere ịkọwara ndị na-eso ụzọ ya, na ya aghaghị ịga Jerusalem, ebe ọ ga-ahụ ọtụtụ ahụhụ dị iche iche site nʼaka ndị okenye, na ndịisi nchụaja, na ndị ozizi iwu. O mere ka ha mata na aghaghị igbu ya, ma nʼụbọchị nke atọ, a ga-eme ka o site nʼọnwụ bilie. Pita duuru ya pụọ nʼotu akụkụ, nọdụ nʼebe ahụ baara ya mba sị ya, “Onyenwe m, Chineke ekwela. Ihe ndị a agaghị adakwasị gị!” Ma o chigharịrị sị Pita, “Si nʼebe m nọ pụọ, ekwensu! Ị bụ ihe mgbochi nye m. Nʼihi na ihe ị na-eche echiche ya bụ naanị echiche mmadụ, ọ bụghị uche Chineke.” Mgbe ahụ Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ ịbụ onye na-eso ụzọ m, ya buru ụzọ jụ onwe ya, buru obe ya, soro m nʼazụ. Nʼihi na onye ọbụla na-eche ndụ ya nche ka ọ hapụ ifunarị ya ga-atụfu ya. Ma onye ọbụla tufuru ndụ ya nʼihi m, ga-achọtakwa ya. Nʼihi na uru gịnị ka mmadụ nwetara ma ọ bụrụ na o ritechaa ụwa niile nʼuru ma tufuo ndụ ya? Maọbụ gịnị bụ ihe ahụ dị nʼụwa nke mmadụ ga-eji gbanwee ndụ ya? Nʼihi na Nwa nke Mmadụ ga-abịa nʼebube nke Nna ya, ya na ndị mmụọ ozi ya. Mgbe ahụ ka ọ ga-ekpe onye ọbụla ikpe dị ka ọrụ ya si dị. “Nʼezie asị m unu, ụfọdụ nʼime ndị guzo nʼebe, agaghị edetụ ọnwụ ire, tụpụ ha ahụ Nwa nke Mmadụ ka ọ na-abịa nʼalaeze ya.”
MATIU 16:1-28 Bible Nso (IGBOB)
Ndi-Farisi na ndi-Sadusi we biakute Ya, jua Ya ka O gosi ha ihe-iriba-ama site n'elu-igwe, nānwa Ya. Ma Ọ zara, si ha, Mb͕e o ruru anyasi, unu nāsi, Iru elu-igwe gādi nma: n'ihi na elu-igwe nācha uhie uhie. N'ututu unu nāsi kwa, Iru elu-igwe gājọ njọ ta: n'ihi na elu-igwe nācha uhie uhie, b͕aru kwa. Unu mara itule iru elu-igwe, ma unu apughi itule ihe-iriba-ama nke oge ndia. Ajọ ọb͕ọ nke nākwa kwa iko nāchọ ihe-iriba-ama; ma agaghi-enye ya ihe-iriba-ama, ma-ọbughi ihe-iriba-ama nke Jona. O we rapu ha, pua. Ndi nēso uzọ-Ya we bia n'ofè ọzọ, chezọ kwa iji ob͕e achicha. Jisus we si ha, Nēlenu anya, nēze kwa ihe ndi-Farisi na ndi-Sadusi, bú ihe nēko achicha. Ha we nēkwurita n'etiti onwe-ha, si, Ayi ejighi ob͕e achicha. Ma ebe Jisus mara ya Ọ si, Ndi okwukwe ntà, gini mere unu nēkwurita n'etiti onwe-unu, n'ihi na unu enweghi ob͕e achicha? Ùnu akātugharighi uche, ùnu echetaghi kwa ob͕e achicha ise nke nnù ndikom iri na nnù abua na ọgu iri ahu, na nkata ole unu nara? Ùnu echetaghi kwa ob͕e achicha asa nke nnù ndikom iri ahu, na abọ ole unu nara? Ùnu si aṅa ghara itughari uche na agwaghm unu okwu bayere ob͕e achicha? Ma nēzenu ihe ndi-Farisi na ndi-Sadusi, bú ihe nēko achicha. Mb͕e ahu ka ha ghọtara na Ọ sighi ha nēze ihe nēko ob͕e achicha, kama ka ha nēze ozizí ndi-Farisi na ndi-Sadusi. Ma mb͕e Jisus biara n'akuku Sisaria Filipi, Ọ jua ndi nēso uzọ-Ya, si, Ònye ka madu nāsi na Nwa nke madu bu? Ha we si, Ufọdu si, Jọn Baptist; ma ndi ọzọ si, Elaija: ma ibe-ha si, Jeremaia, ma-ọbu otù nime ndi-amuma. Ọ si ha, Ma ọ̀ bu onye ka unu onwe-unu si na Mu bu? Saimon Pita we za, si, Gi onwe-gi bu Kraist ahu, Ọkpara Chineke di ndu. Jisus we za, si ya, Ngọzi nādiri gi, Saimon Bā-Jona: n'ihi na anu-aru na ọbara ekpugheghi ya nye gi, kama ọ bu Nnam Nke bi n'elu-igwe. Ma Mu onwem si kwa gi, na gi onwe-gi bu Pita, ọ bu kwa n'elu oké nkume a ka M'gēwu nzukọm dika ulo; ọnu-uzọ nilenke Hedis agaghi-aka kwa ya n'ike. M'gēnye gi nkpisi-ugodi nke ala-eze elu-igwe: ihe ọ bula i gēke kwa ab͕u n'elu uwa, agēke ya n'elu-igwe: ihe ọ bula i gātọpu kwa ab͕u n'elu uwa, agātọpu ya n'elu-igwe. Mb͕e ahu Ọ dọrọ ndi nēso uzọ-Ya aka na nti ka ha ghara igwa onye ọ bula na Ya onwe-ya bu Kraist ahu. Site na mb͕e ahu Jisus Kraist malitere igosi ndi nēso uzọ-Ya, na Ọ ghaghi ije Jerusalem, na ihu ọtutu ahuhu n'aka ndi-okenye na ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ, na aghaghi ib͕u Ya, me kwa ka O si n'ọnwu bilie n'ubochi nke-atọ. Pita we kuru Ya nye n'aru, malite ibara Ya nba, si, Chineke mere Gi ebere, Onye-nwe-ayi: ihe a agaghi-adiri Gi ma-ọli. Ma O chighariri, si Pita, Ga n'azum, Setan: i bu ihe nēme ka M'ma n'ọnyà: n'ihi na i dighi-atukwasi uche-gi n'ihe Chineke, kama ọ bu n'ihe madu. Mb͕e ahu Jisus siri ndi nēso uzọ-Ya, Ọ buru na onye ọ bula achọ ka o som n'azu, ya ju onwe-ya, buli kwa obe-ya, nēsokwam. N'ihi na onye ọ bula nke nāchọ izọputa ndu-ya, o gētufu ya: ma onye ọ bula nke gētufu ndu-ya n'ihim, ọ gāhu ya. N'ihi na ùrù gini ka ọ gābara madu, ma ọ buru na o gērita uwa dum n'urù, ewe napu ya ndu-ya? ma-ọbu ìhe-nb͕anwe gini ka madu gēji b͕anwe ndu-ya? N'ihi na Nwa nke madu gaje ibia n'ebube nke Nna-Ya, Ya na ndi-mọ-ozi-Ya; mb͕e ahu ka Ọ gēnyeghachi kwa onye ọ bula dika omume-ya si di. N'ezie asim unu, Ufọdu di n'etiti ndi guzoro n'ebe a, ndi nāgaghi-edetu ọnwu ire ma-ọli rue mb͕e ha gāhu Nwa nke madu ka Ọ nābia n'ala-eze-Ya.