MATIU 13:9-15
MATIU 13:9-15 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Onye ọbụla nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.” Emesịa, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya jụọ ya sị, “Gịnị mere i ji na-agwa ndị a okwu nʼilu?” Ọ zaghachiri, “Nʼihi na ọ bụ unu ka e nyere ịmata ihe omimi niile nke alaeze eluigwe. Emeghị ka ndị ọzọ ghọta ya. Onye ahụ nwere ihe ka a ga-enyekwa ọzọ, ka o nwee karịa. Ma onye na-enweghị ihe ọbụla ka a ga-anapụ ọ bụladị ihe o nwere. Nke a bụ ihe mere m ji agwa ha okwu nʼilu: “Nʼihi na ha na-ele anya, ma ha adịghị ahụ ụzọ, ha na-ege ntị, ma ha adịghị anụ ihe maọbụ aghọta ya. Nke a bụkwa imezu amụma ahụ Aịzaya buru sị, “ ‘Unu ga na-anụ, nụkwa, ma unu agaghị aghọta ihe ọbụla. Unu ga na-ele anya, hụkwa, ma unu agaghị ahụ ihe ọbụla. Nʼihi na obi ndị nke a a maala abụba, dịkwa arọ, ha adịghị ejikwa ntị ha anụ ihe, ha mechikwara anya ha ka ha ghara ịhụ ụzọ. Ma ọ bụghị otu a ha nwere ike iji anya ha hụ ụzọ, jirikwa ntị ha nụ ihe, sitekwa nʼobi ha nwe nghọta ma chigharịa bịakwute m, ka m gwọọ ha.’
MATIU 13:9-15 Bible Nso (IGBOB)
Onye nwere nti, ya nu. Ndi nēso uzọ-Ya we biakute Ya, si Ya, N'ìhi gini ka I nāgwa ha okwu n'ilu? O we za, si ha, Ọ bu unu ka enyeworo imara ihe-omimi ala-eze elu-igwe, ma enyeghi ndi ahu. N'ihi na onye ọ bula nke nwere, onye ahu ka agēnye, ọ gēnwebiga kwa ókè: ma onye ọ bula nke nēnweghi, ọbuná ihe o nwere ka agānapu ya. N'ihi nka ka M'nāgwa ha okwu n'ilu; n'ihi na ha adighi-ahu n'ọhuhu, ha adighi-anu kwa n'ọnunu, ha adighi-anuta kwa. Ma anēmezuru ha amuma nke Aisaia, nke si, N'ọnunu unu gānu, ma unu agaghi-anuta ma-ọli; N'ọhuhu unu gāhu kwa, ma unu agaghi-ahuta ma-ọli: N'ihi na obi ndi nka mara abuba, Nti-ha kpọchi-kwa-ra, Ha kpuchi-kwa-ra anya-ha; Ka ha ghara iwere anya-ha hu uzọ ma eleghi anya, Ghara kwa iwere nti-ha nu ihe, Ghara kwa iwere obi-ha ghọta, Ghara kwa ichighari, Ka M'ghara kwa ime ka aru di ha ike.