MATIU 13:47-58
MATIU 13:47-58 Bible Nso (IGBOB)
Ọzọ kwa, ala-eze elu-igwe yiri oké úb͕ú awuyere nime oké osimiri, nke kpokọta-kwa-ra ufọdu n'aha azù nile di iche iche: nke, mb͕e o juru, ha dọgotara ya n'ótú; ha we nọdu, chikọta azù di nma tiye nime ihe, ma ha tufuru nke nādighi nma. Otú a ka ọ gādi n'ọgwugwu oge a: ndi-mọ-ozi gāputa, kewaputa ndi bu ajọ madu n'etiti ndi ezi omume, ha gātubà kwa ha n'oké ọku ahu: n'ebe ahu ka ikwa-ákwá na ita-ikekere-ezé ahu gādi. Ùnu aghọtawo ihe ndia nile? Ha si Ya, E. O we si ha, N'ihi nka ode-akwukwọ ọ bula nke emere ka ọ buru onye nēso uzọ ala-eze elu-igwe, o yiri madu nke bu nna-nwe-ulo, onye nēsi n'àkù-ya atuputa ihe ọhu na ihe ochie. O rue, mb͕e Jisus tubìri ilu ndia, O si n'ebe ahu zọlie. O we bia n'ala nke aka Ya, nēzí ha ihe n'ulo-nzukọ-ha, nke mere ka ibobo nwua ha n'aru, ha we si, Òle ebe ka Nwoke a nwere amam-ihe a na ọlu ndia di ike? Nwoke a, Ọ̀ bughi Nwa onye-ọ̀kà-ayi? àdighi-akpọ nne-Ya Meri? nà umu-nne-Ya ndikom, Jemes, na Josef, na Saimon, na Judas? Na umu-nne-Ya ndinyom, hà nile anọghi n'etiti ayi? Òle ebe kwa Nwoke a nwere ihe ndia nile? Ewe me ka ha ma n'ọnyà n'aru Ya. Ma Jisus siri ha, Onye-amuma abughi onye anādighi-asọpuru, ma-ọbughi n'ala nke aka ya, na n'ulo nke aka ya. Ọ lughi kwa ọtutu ọlu di ike n'ebe ahu n'ihi ekweghi-ekwe-ha.
MATIU 13:47-58 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“Ọzọkwa, alaeze eluigwe dị ka ụgbụ e ji egbu azụ, nke a wụnyere nʼime osimiri, jiri ya jide azụ dị iche iche. Mgbe ụgbụ a juru, ndị ọkụ azụ ahụ na-adọpụta ya. Nọdụ ala họpụtasịa ndị dị mma tinye ha nʼime nkata, ma tufuo ndị na-adịghị mma. Otu a ka ọ ga-adị nʼọgwụgwụ oge. Ndị mmụọ ozi ga-abịa kewapụ ndị ọjọọ site nʼetiti ndị ezi omume, ma tụbakwa ha nʼime oke ọkụ ahụ. Ebe ha ga-anọ na-akwa akwa na-atakwa ikikere eze.” Ọ jụrụ ha sị, “Unu ghọtara ihe ndị a m na-ekwu?” Ha zara sị ya, “E.” Ọ sịrị ha, “Nʼihi nke a, onye nkuzi nke iwu ọbụla nke e mere ka ọ bụrụ onye na-eso ụzọ alaeze eluigwe, dị ka onyenwe ụlọ nke na-esite nʼụlọakụ ya na-ewepụta ihe ọhụrụ na ihe ochie.” Mgbe Jisọs tụsịrị ilu ndị a, o si ebe ahụ pụọ. O rutere nʼobodo ya, malite izi ha ihe nʼụlọ ekpere ha, nke a jukwara ha anya. Ha jụrịtara onwe ha ajụjụ na-asị, “Ebee ka o si nweta amamihe a? Ebee ka o si nweta ike ịrụ ọrụ ebube ndị a niile? Nwoke a, ọ bụghị nwa onye kapinta? Ọ bụ na-adịghị akpọ nne ya Meri? Jemis, Josef, Saimọn na Judas, ha abụghị ụmụnne ya ndị ikom? Ụmụnne ya ndị inyom niile, ha anọghị nʼetiti anyị? Olee ebekwa ka nwoke a si nweta ihe ndị a?” Iwe were ha nʼebe ọ nọ. Ma Jisọs gwara ha okwu sị ha, “A na-asọpụrụ onye amụma nʼebe niile, ma a dịghị asọpụrụ ya nʼobodo a mụrụ ya, nakwa nʼezinaụlọ nke ya.” Ya mere, ọ rụghị ọtụtụ ọrụ ebube nʼebe ahụ, nʼihi na ha enweghị okwukwe nʼime ha.