Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

MATIU 13:3-23

MATIU 13:3-23 Bible Nso (IGBOB)

O we gwa ha ọtutu okwu n'ilu di iche iche, si, Le, ọgha-nkpuru puru ka ọ gha nkpuru; mb͕e ọ nāgha, ufọdu we da n'akuku uzọ, anu-ufe we bia tùturie ha: nkpuru ọzọ we da n'ebe nkume, ebe ha nēnweghi ájá ri nne: ngwa ngwa ha we púlite, n'ihi na ha enweghi ájá di omimi: ma mb͕e anyanwu wara, ha chanwua; ha we kpọnwua, n'ihi na ha enweghi nkpọrọgwu. Nkpuru ọzọ we da n'elu ogwu; ogwu ahu we tolite, kpab͕ue ha. Nkpuru ọzọ we da n'ala di nma, ha we nāmi nkpuru, otù ọgu ise, ọzọ ọgu atọ, ọzọ orú na iri. Onye nwere nti, ya nu. Ndi nēso uzọ-Ya we biakute Ya, si Ya, N'ìhi gini ka I nāgwa ha okwu n'ilu? O we za, si ha, Ọ bu unu ka enyeworo imara ihe-omimi ala-eze elu-igwe, ma enyeghi ndi ahu. N'ihi na onye ọ bula nke nwere, onye ahu ka agēnye, ọ gēnwebiga kwa ókè: ma onye ọ bula nke nēnweghi, ọbuná ihe o nwere ka agānapu ya. N'ihi nka ka M'nāgwa ha okwu n'ilu; n'ihi na ha adighi-ahu n'ọhuhu, ha adighi-anu kwa n'ọnunu, ha adighi-anuta kwa. Ma anēmezuru ha amuma nke Aisaia, nke si, N'ọnunu unu gānu, ma unu agaghi-anuta ma-ọli; N'ọhuhu unu gāhu kwa, ma unu agaghi-ahuta ma-ọli: N'ihi na obi ndi nka mara abuba, Nti-ha kpọchi-kwa-ra, Ha kpuchi-kwa-ra anya-ha; Ka ha ghara iwere anya-ha hu uzọ ma eleghi anya, Ghara kwa iwere nti-ha nu ihe, Ghara kwa iwere obi-ha ghọta, Ghara kwa ichighari, Ka M'ghara kwa ime ka aru di ha ike. Ma ngọzi nādiri anya-unu, n'ihi na ha nāhu uzọ; na nti-unu, n'ihi na ha nānu ihe. N'ihi na n'ezie asim unu, na agu guru ọtutu ndi-amuma na ndi ezi omume ihu ihe unu nāhu, ma ha ahughi ha; na inu ihe unu nānu, ma ha anughi ha. Ya mere, unu onwe-unu nu ilu nke ọgha-nkpuru ahu. Mb͕e onye ọ bula nuru okwu ala-eze elu-igwe, ma ọ ghọtaghi ya, ajọ onye ahu abia, punara ihe aghaworo n'obi-ya. Onye a bu nke aghara n'akuku uzọ. Onye agha-kwa-ra n'ebe nkume ahu, madu a bu onye nānu okwu ahu, ngwa ngwa o were ọṅù jide ya; ma o nweghi nkpọrọgwu nime onwe-ya, kama ọ nānọ nwa oge; ma mb͕e nkpab͕u ma-ọbu nsob͕u putara n'ihi okwu ahu, ngwa ngwa ọ ma n'ọnyà. Onye agha-kwa-ra n'etiti ogwu ahu, madu a bu onye nānu okwu ahu; ma ncheb͕u nke oge a na aghughọ nke àkù nākpab͕u okwu ahu, o we ghọ ihe nāmighi nkpuru. Onye agha-kwa-ra n'ala ahu di nma, madu a bu onye nānu okwu ahu, we ghọta ya; onye nāmi nkpuru n'ezie, miputa, otù ọgu ise, ọzọ ọgu atọ, ọzọ orú na iri.

MATIU 13:3-23 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

O ji ilu gwa ha ọtụtụ ihe. Ọ gwara ha sị, “O nwere otu onye ọrụ ubi gara ịkụ mkpụrụ nʼubi ya. Mgbe ọ na-agha mkpụrụ ndị a, ụfọdụ nʼime ha dara nʼakụkụ ụzọ ebe ụmụ nnụnụ bịara tụrịa ha loo. Ma ụfọdụ nʼime ha dara nʼala dị nkume nkume. Ọ dịghị anya ha puputara, too, nʼihi na aja dị nʼebe ahụ emighị emi. Ma mgbe anwụ mụkwasịrị ha, ha chanwụrụ, kpọnwụọ, nʼihi na mgbọrọgwụ ha emikpughị emikpu nʼime ala. Mkpụrụ ụfọdụ danyere nʼetiti ogwu, ogwu ahụ topụtara kpagbuo ha. Ma ụfọdụ mkpụrụ dara nʼezi ala, mịakwa ọtụtụ mkpụrụ. Ụfọdụ mịrị mkpụrụ iri atọ, ụfọdụ iri isii, ụfọdụ kwa otu narị. Onye ọbụla nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.” Emesịa, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya jụọ ya sị, “Gịnị mere i ji na-agwa ndị a okwu nʼilu?” Ọ zaghachiri, “Nʼihi na ọ bụ unu ka e nyere ịmata ihe omimi niile nke alaeze eluigwe. Emeghị ka ndị ọzọ ghọta ya. Onye ahụ nwere ihe ka a ga-enyekwa ọzọ, ka o nwee karịa. Ma onye na-enweghị ihe ọbụla ka a ga-anapụ ọ bụladị ihe o nwere. Nke a bụ ihe mere m ji agwa ha okwu nʼilu: “Nʼihi na ha na-ele anya, ma ha adịghị ahụ ụzọ, ha na-ege ntị, ma ha adịghị anụ ihe maọbụ aghọta ya. Nke a bụkwa imezu amụma ahụ Aịzaya buru sị, “ ‘Unu ga na-anụ, nụkwa, ma unu agaghị aghọta ihe ọbụla. Unu ga na-ele anya, hụkwa, ma unu agaghị ahụ ihe ọbụla. Nʼihi na obi ndị nke a a maala abụba, dịkwa arọ, ha adịghị ejikwa ntị ha anụ ihe, ha mechikwara anya ha ka ha ghara ịhụ ụzọ. Ma ọ bụghị otu a ha nwere ike iji anya ha hụ ụzọ, jirikwa ntị ha nụ ihe, sitekwa nʼobi ha nwe nghọta ma chigharịa bịakwute m, ka m gwọọ ha.’ Ma ngọzị na-adịrị anya unu, nʼihi na ha na-ahụ ụzọ, na ntị unu nʼihi na ha na-anụkwa ihe. Nʼezie agwa m unu, ọtụtụ ndị amụma na ndị ezi omume ka ọ gụrụ agụụ ịhụ ihe unu na-ahụ, ma ha ahụghị ya, na ịnụ ihe unu na-anụ, ma ha anụghị ya. “Ugbu nụrụnụ nkọwa ilu ọgha mkpụrụ ahụ. Mgbe onye ọbụla nụrụ oziọma nke alaeze ahụ, ma ọ ghọtaghị ya, ajọ onye ahụ na-abịa napụ ya ihe ahụ akụrụ nʼobi ya. Nke a bụ mkpụrụ ahụ nke dara nʼokporoụzọ. Mkpụrụ nke dara nʼala nkume nọchiri anya obi mmadụ onye nụrụ oziọma ahụ, jirikwa oke ọṅụ nabata ya. Ma ebe ha na-enweghị mgbọrọgwụ nʼime ha. Ha na-anọ nwa oge nta. Mgbe nsogbu maọbụ mkpagbu bịara nʼihi okwu ahụ, ngwangwa ha na-adachapụ. Mkpụrụ nke dara nʼala ahụ ogwu ogwu dị nọchiri anya obi mmadụ onye nụrụ oziọma ahụ, ma ọchịchọ nke ụwa a, ya na itinye obi nʼakụ nke ụwa a, kpagidere okwu dị nʼime ya, mee ka ọ ghara ịmị mkpụrụ. Ma mkpụrụ dara nʼala ọma ahụ nọchiri anya obi mmadụ onye gere ntị nʼoziọma ahụ, ghọtakwa ya. Ọ na-amịta mkpụrụ dị narị, maọbụ iri isii, maọbụ iri atọ karịa ihe akụnyere nʼime ya.”