MATIU 13:1-9
MATIU 13:1-9 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼotu ụbọchị ahụ, Jisọs hapụrụ ụlọ ahụ gaa nʼọnụ mmiri ebe ọ nọdụrụ ala. Igwe mmadụ dị ukwuu bịakwutere ya, nke mere ka ọ baa nʼime ụgbọ mmiri. Nʼime ya ka ọ nọ na-ezi ndị mmadụ nọ nʼọnụ mmiri ahụ na-ege ya ntị ihe. O ji ilu gwa ha ọtụtụ ihe. Ọ gwara ha sị, “O nwere otu onye ọrụ ubi gara ịkụ mkpụrụ nʼubi ya. Mgbe ọ na-agha mkpụrụ ndị a, ụfọdụ nʼime ha dara nʼakụkụ ụzọ ebe ụmụ nnụnụ bịara tụrịa ha loo. Ma ụfọdụ nʼime ha dara nʼala dị nkume nkume. Ọ dịghị anya ha puputara, too, nʼihi na aja dị nʼebe ahụ emighị emi. Ma mgbe anwụ mụkwasịrị ha, ha chanwụrụ, kpọnwụọ, nʼihi na mgbọrọgwụ ha emikpughị emikpu nʼime ala. Mkpụrụ ụfọdụ danyere nʼetiti ogwu, ogwu ahụ topụtara kpagbuo ha. Ma ụfọdụ mkpụrụ dara nʼezi ala, mịakwa ọtụtụ mkpụrụ. Ụfọdụ mịrị mkpụrụ iri atọ, ụfọdụ iri isii, ụfọdụ kwa otu narị. Onye ọbụla nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.”
MATIU 13:1-9 Bible Nso (IGBOB)
N'ubọchi ahu Jisus puru n'ulo, we nọdu n'usọ oké osimiri. Oké ìgwè madu we zukọ n'ebe Ọ nọ, ya mere Ọ batara n'ub͕ọ, nọdu ala; ìgwè madu ahu nile guzo-kwa-ra n'ótú. O we gwa ha ọtutu okwu n'ilu di iche iche, si, Le, ọgha-nkpuru puru ka ọ gha nkpuru; mb͕e ọ nāgha, ufọdu we da n'akuku uzọ, anu-ufe we bia tùturie ha: nkpuru ọzọ we da n'ebe nkume, ebe ha nēnweghi ájá ri nne: ngwa ngwa ha we púlite, n'ihi na ha enweghi ájá di omimi: ma mb͕e anyanwu wara, ha chanwua; ha we kpọnwua, n'ihi na ha enweghi nkpọrọgwu. Nkpuru ọzọ we da n'elu ogwu; ogwu ahu we tolite, kpab͕ue ha. Nkpuru ọzọ we da n'ala di nma, ha we nāmi nkpuru, otù ọgu ise, ọzọ ọgu atọ, ọzọ orú na iri. Onye nwere nti, ya nu.