MATIU 12:34-37
MATIU 12:34-37 Bible Nso (IGBOB)
Umu nke aju-ala, ùnu gēsi aṅa pu ikwu ezi ihe, ebe unu bu ajọ madu? n'ihi na ọnu site n'ihe nke obi nwebigara ókè nēkwu okwu. Ezi madu nēsi n'ezi àkù-ya atuputa ezi ihe: ajọ madu nēsi kwa n'ajọ àkù-ya atuputa ajọ ihe. Ma asim unu, na okwu ọ bula madu gēkwu nke nābaghi n'ihe, ha gāza ajuju bayere ya n'ubọchi ikpé. N'ihi na agēsite n'okwu-ọnu-gi nile gu gi n'onye ezi omume, agēsite kwa n'okwu-ọnu-gi nile kpeb͕u gi.
MATIU 12:34-37 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ụmụ ajụala, olee otu unu ga-esi kwuo okwu dị mma, ebe obi unu dị njọ? Nʼihi na ihe mmadụ kwuru bụ ihe si ya nʼobi pụta. Ezi mmadụ na-esi nʼezi akụ ya wepụta ihe dị mma, ma ajọ mmadụ na-esitekwa nʼajọ akụ ya wepụta ajọọ ihe. Ma ana m agwa unu sị, nʼụbọchị ikpe ahụ, onye ọbụla ga-aza ajụjụ, banyere okwu niile na-enweghị isi o kwuru. Nʼihi na ọ bụ site nʼokwu ọnụ gị ka ị ga-abụ onye ikpe mara, sitekwa nʼokwu ọnụ gị ka ị ga-abụ onye ikpe na-amaghị.”