MATIU 1:1-15
MATIU 1:1-15 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nke a bụ ndekọ usoro ọmụmụ Jisọs onye bụ Kraịst, nwa Devid, nwa Ebraham. Ebraham mụrụ Aịzik, Aịzik amụọ Jekọb, Jekọb amụọ Juda na ụmụnne ya. Juda mụtara Perez na Zera site na Tama, Perez mụrụ Hezrọn, Hezrọn amụọ Aram. Aram mụrụ Aminadab, Aminadab mụrụ Nashọn, Nashọn amụọ Salmọn. Salmọn bụ nna Boaz, site na nwunye ya Rehab, Boaz mụrụ Obed, site na nwunye ya Rut, Obed amụọ Jesi. Jesi amụọ Devid, bụ eze. Devid mụrụ Solomọn site na nwunye ya Ụraya. Solomọn mụrụ Rehoboam, Rehoboam amụọ Abija, Abija amụọ Esa. Esa mụrụ Jehoshafat, Jehoshafat amụọ Joram, Joram amụọ Ụzaịa. Ụzaịa mụrụ Jotam, Jọtam amụọ Ehaz, Ehaz amụọ Hezekaya. Hezekaya mụrụ Manase, Manase amụọ Emọn, Emọn amụọ Josaya. Mgbe e mere ka ha gaa biri nʼala Babilọn ka Josaya mụrụ Jekonaya na ụmụnne ya. Mgbe ha si Babilọn lọta Jekonaya mụrụ Shealtiel, Shealtiel amụọ Zerubabel. Zerubabel mụrụ Abiud, Abiud amụọ Eliakịm, Eliakịm amụọ Azoa. Azoa mụrụ Zadọk, Zadọk amụọ Akịm, Akịm amụọ Eliud. Eliud mụrụ Elieza, Elieza amụọ Matan, Matan amụọ Jekọb.
MATIU 1:1-15 Bible Nso (IGBOB)
Akwukwọ osuso-ọmumu Jisus Kraist, Nwa Devid, nwa Abraham. Abraham muru Aisak; Aisak we mua Jekob; Jekob we mua Juda na umu-nna-ya; Juda we mua Perez na Zera site na Tema; Perez we mua Hezron; Hezron we mua Ram; Ram we mua Aminadab; Aminadab we mua Nahshon; Nahshon we mua Salmon; Salmon we mua Boaz site na Rehab; Boaz we mua Obed site na Rut; Obed we mua Jesi; Jesi we mua Devid, bú eze. Devid we mua Solomon site na nwunye nke Uraia; Solomon we mua Rehoboam; Rehoboam we mua Abaija; Abaija we mua Esa; Esa we mua Jehoshafat; Jehoshafat we mua Joram; Joram we mua Uzaia; Uzaia we mua Jotam; Jotam we mua Ehaz; Ehaz we mua Hezekaia; Hezekaia we mua Manase; Manase we mua Emon; Emon we mua Josaia; Josaia we mua Jekonaia na umu-nne-ya, na mb͕e emere ka ha je biri na Babilon. Mb͕e emesiri ka ha je biri na Babilon, Jekonaia we mua Shealtiel; Shealtiel we mua Zerubabel; Zerubabel we mua Abaiud; Abaiud we mua Elaiakim; Elaiakim we mua Ezoa; Ezoa we mua Sedok; Sedok we mua Akim; Akim we mua Elaiud; Elaiud we mua Eleeza; Eleeza we mua Matan; Matan we mua Jekob