MALAKAI 3:11-12
MALAKAI 3:11-12 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“Aga m egbochi ihe nripịa ndị ahụ niile ka ha ghara iripịa mkpụrụ ubi unu. Osisi vaịnị unu agakwaghị atụpụsị mkpụrụ ya nʼala tutu ruo mgbe ha chara.” Ọ bụ ihe ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu. “Mgbe ahụ, mba niile dị iche iche ga-akpọ unu ndị a gọziri agọzi, nʼihi na ala unu ga-abụ nke na-enye ndị nwe ya obi ụtọ.” Ọ bụ ihe ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.
Kesaa
Gụọ MALAKAI 3MALAKAI 3:11-12 Bible Nso (IGBOB)
M'gābasi-kwa-ra ihe nēripia eripia nba ike n'ihi unu, ọ gaghi-ebibi-kwa-ra unu nkpuru ala-ubi-unu; osisi vine unu agaghi-atupu nkpuru-ya n'ubi tutu oge-ya eru, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri. Ọ bu kwa Ndi ihe nāgara nke-ọma ka mba nile gākpọ unu: n'ihi na unu onwe-unu gābu ala nke nātọ utọ, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.
Kesaa
Gụọ MALAKAI 3