Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

MALAKAI 3:1-18

MALAKAI 3:1-18 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

“Lee, aga m ezipu onyeozi m, onye ga-edozi ụzọ nʼihu m. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị ahụ unu na-ele anya ya ga-abịa na mberede nʼụlọnsọ ukwu ya. Onyeozi nke ọgbụgba ndụ ahụ, onye ihe ya na-agụsị unu agụụ ike, ga-abịa,” ka ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. “Ma onye ga-anagide ụbọchị ọbịbịa ya ma guzokwa mgbe ọ pụtara ihe? Nʼihi na ọ ga-adị ka ọkụ na-anụcha anụcha, dịkwa ka ncha e ji asụ akwa. Ọ na-anọdụ ala dịka ndị na-anụcha ọlaọcha ime ka ọ dị ọcha. Ọ ga-anụcha ndị Livayị, ime ka ha dị ọcha, dịka ọlaedo na ọlaọcha a nụchara anụcha tutu ruo mgbe ha ga-ewetara ONYENWE ANYị onyinye nʼezi omume. Mgbe ahụ, onyinye Juda na Jerusalem ga-abụ onyinye ONYENWE ANYị ga-anabata, dịka o si anabata ha nʼụbọchị ndị ahụ gara aga, na mgbe ochie gara aga. “Mgbe ahụ, aga m abịa unu nso ikpe unu ikpe. Aga m abịakwa ngwangwa ịgbagide ha ama bụ ndị mgbaasị, na ndị na-akwa iko, na ndị na-aṅụ iyi ụgha, na ndị na-emegbu ndị inyom di ha nwụrụ, na ndị na-emegbu ndị na-enweghị nna, na ndị na-anapụ ndị ọbịa ikpe ziri ezi, ndị ahụ niile na-adịghị atụ egwu m.” Ọ bụ ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. “Nʼihi na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYị adịghị agbanwe agbanwe. Ya mere, unu bụ ụmụ Jekọb ji dịgide. Site nʼoge nna nna unu ha, unu esitela nʼidebe iwu na ụkpụrụ m wezuga onwe unu. Unu adịghịkwa edebe ha. Ya mere, lọghachikwutenụ m, mụ onwe m ga-alọghachikwute unu.” Ọ bụ ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu. “Ma unu na-asị, ‘Anyị ga-esi aṅaa lọghachi?’ “Mmadụ ọ na-ezu ihe bụ nke Chineke nʼohi? Ma unu apụnarịla m ihe bụ nke m. “Ma unu na-ajụ: ‘Anyị si aṅaa na-ezu gị ohi?’ “Ọ bụ site nʼotu ụzọ nʼime ụzọ iri unu, onyinye na aja niile. Nʼihi ya, ọbụbụ ọnụ dịịrị unu, ka mba niile unu ha, nʼihi na ọ bụ mụ onwe m ka unu na-ezu ohi. Webatanụ otu ụzọ nʼụzọ iri nke ihe niile unu nʼime ụlọakụ m, ka nri jupụta nʼime ụlọ m. Jirinụ nke a nwalee m,” ka unu hụ ma mụ onwe m agaghị emeghe ọnụ ụzọ eluigwe, site na ya wụdatara unu ngọzị dị ukwuu, nke ga-ejubiga oke na ọnọdụ agaghị adị ichebe ha. Ọ bụ ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu. “Aga m egbochi ihe nripịa ndị ahụ niile ka ha ghara iripịa mkpụrụ ubi unu. Osisi vaịnị unu agakwaghị atụpụsị mkpụrụ ya nʼala tutu ruo mgbe ha chara.” Ọ bụ ihe ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu. “Mgbe ahụ, mba niile dị iche iche ga-akpọ unu ndị a gọziri agọzi, nʼihi na ala unu ga-abụ nke na-enye ndị nwe ya obi ụtọ.” Ọ bụ ihe ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. ONYENWE ANYị na-ekwu, sị, “Unu ekwuola ọtụtụ okwu dị ike megide m.” “Ma unu na-ajụ, ‘Gịnị ka anyị kwuru megide gị?’ “Unu ekwuola sị, ‘Ọ bụ ihe nzuzu ife Chineke ofufe, na ịtụ ya egwu. Gịnị bụ uru anyị na-erite site nʼidebe iwu ya, na ijegharị dịka ndị na-eru ụjụ nʼihu ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile? Ma site ugbu a gaa nʼihu, ndị nganga ka anyị ga-akpọ ndị ihe na-agara nke ọma. Nʼezie, ndị na-eme ihe ọjọọ ka ihe na-agara nke ọma. Ndị ahụ jikwa ihe ọjọọ ha na-anwa Chineke na-agbanarị ntaramahụhụ ya.’ ” Mgbe ahụ, ndị niile na-atụ egwu ONYENWE ANYị gwarịtara ibe ha okwu, ONYENWE ANYị ṅara ntị, nụkwa ihe ha na-ekwu. Nʼihu ya, e nwere akwụkwọ ncheta dị ya, ebe e dere aha ndị niile na-atụ egwu ONYENWE ANYị, ma na-echekwa echiche banyere aha ya. “Nʼụbọchị ahụ m ga-eme ihe,” ka ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu, “ha ga-abụ ihe oke ọnụahịa nke aka m. Aga m echebe ha, dịka nna na-enwe ọmịiko ma chebekwa nwa ya nwoke na-efe ya. Unu ga-ahụ ihe dị iche nʼetiti ndị ezi omume na ndị ajọ omume, hụkwa ihe dị iche nʼetiti ndị na-efe Chineke na ndị na-adịghị efe ya.

MALAKAI 3:1-18 Bible Nso (IGBOB)

Le, Mu nēziga onye-ozim, o gēdozi kwa uzọ n'irum Onye-nwe-unu ahu unu onwe-unu nāchọ gābiaru ulo uku Ya na mberede; ọbuná Onye-ozi ọḅuḅa-ndu ahu, Onye ihe-Ya nātọ unu utọ, le Ọ nābia, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri. Ma ònye gānagide ubọchi ọbibia-Ya? ọ̀ bu kwa onye ganēguzogide mḅe anāhu Ya anya? n'ihi na Ya onwe-ya di ka ọku onye-nnucha-ihe na dika nchà nke ọsu-ákwà: Ọ gānọdu kwa ala dika onye-nnucha ọla-ọcha nke nēme ka ọ di ọcha, Ọ gēme kwa ka umu Livai di ọcha, sicha kwa ha dika ọla-edo na ọla-ọcha; ha ganēweta nso Jehova onyinye-inata-iru-ọma n'ezi omume. Onyinye-inata-iru-ọma nke Juda na Jerusalem gātọ kwa Jehova utọ, dika n'ubọchi mḅe ebighi-ebi gara aga, na dika n'arọ nile gara aga. M'gābiakute unu nso ikpe ikpé; M'gābu kwa onye-àmà di ngwa megide ndi-mḅasi, na imegide ndi nākwa iko, na imegide ndi nāṅu iyi ugha, na imegide ndi nēmeḅu onye egoro ọlu n'ugwọ lu-ya na nwan yi di-ya nwuru na nwa-nḅei, ndi nēwezuga kwa ọbìa n'ihe-ya, ndi nādighi-atu agwu m, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri. N'ihi na Mu onwem, bú Jehova, aḅanweghi; ya bu na emeghi ka unu onwe-unu gwusia, umu Jekob. Site n'ubọchi nile nke nna-unu-hà ka unu wezugaworo onwe-unu n'ukpurum nile, unu edebeghi kwa ha. Laghachikutenum, Mu onwem gālaghachikute kwa unu, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri. Ma unu nāsi, Nìme gini ka ayi gālaghachi? Madu, ọ̀ gāpunara Chineke ihe? ma unu nāpunaram ihe. Ma unu nāsi, Nìme gini ka ayi punaraworo Gi ihe? N'otù uzọ n'uzọ iri nile na àjà-nbuli nile. Ọbubu-ọnu ka eji abu unu onwe-unu; ọ bu kwa Mu ka unu onwe-unu nāpunara ihe, bú mba nka nile. Webatanu otù uzọ n'uzọ iri nile n'ulo-àkù nkem, ka ihe-oriri we di n'ulom, biko, nwanum na nka, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, ma M'gaghi-emeghere unu window nile nke elu-igwe, wusara unu ngọzi, rue mḅe ọnọdu agaghi-ezu inagide ya. M'gābasi-kwa-ra ihe nēripia eripia nba ike n'ihi unu, ọ gaghi-ebibi-kwa-ra unu nkpuru ala-ubi-unu; osisi vine unu agaghi-atupu nkpuru-ya n'ubi tutu oge-ya eru, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri. Ọ bu kwa Ndi ihe nāgara nke-ọma ka mba nile gākpọ unu: n'ihi na unu onwe-unu gābu ala nke nātọ utọ, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri. Okwu nile unu adiwo ike imegidem, ka Jehova siri. Ma unu nāsi, Gini ka ayi kwuritaworo megide Gi? Unu asiwo, Ọ bu ihe-efu ifè Chineke òfùfè: ọ̀ bu kwa urù gini ka ọ bara ayi na ayi edebewo ihe-ndebe-Ya, na ayi ejeghariwo kwa n'uwe-iḅa-nkpe n'iru Jehova nke usu nile nke ndi-agha? Ma uḅu a ayi onwe-ayi nākpọ ndi-nganga ndi ihe nāgara nke-ọma; e, anēwu ndi nēme ihe-nmebi-iwu dika ulo; e, ha anwawo Chineke, ewe me ka ha wepuga onwe-ha. Mḅe ahu ndi nātu egwu Jehova nēkwurita okwu, otú onye na ibe-ya: Jehova we ṅa nti, nu, ewe dere ndi nātu egwu Jehova, ndi nēchè kwa èchìchè aha-Ya, akwukwọ ncheta n'iru Ya. Ha gābu kwa nkem, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, n'ubọchi ahu mḅe Mu onwem ganēme ihe, bú ihe nke akam; M'gēnwe kwa ọmiko n'aru ha, dika madu si enwe ọmiko n'aru nwa-ya nke nēfè ya. Unu gālaghachi kwa hu ihe di iche n'etiti onye ezi omume na onye nēmebi iwu, n'etiti onye nēfè Chineke na onye nādighi-efè Ya.